Job 22:1-30

22  Elifaz onye Timan wee zaa, sị:   “Ò nwere uru mmadụ pụrụ ịbara Chineke,+Nke na onye nwere nghọta ga-abara ya uru?   Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ na-enweta obi ụtọ ọ bụla na ị bụ onye ezi omume,+Ka ọ̀ na-erite uru ọ bụla na ụzọ gị enweghị ihe ịta ụta?+   Ọ̀ ga-abara gị mba maka na ị na-asọpụrụ ya?Gị na ya ọ̀ ga-aba n’ikpe?+   Ihe ọjọọ gị ọ́ karịbeghị akarị?+Njehie gị kwa ọ́ gaghị akwụsị akwụsị?   N’ihi na ị na-anara ụmụnne gị ihe ibé n’enweghị ihe ha mere,+Ị na-eyipụkwa ọbụna ndị gba ọtọ ákwà ha.   Ị dịghị enye onye ike gwụrụ mmiri ka ọ ṅụọ,Ị na-ajụkwa inye onye agụụ na-agụ nri.+   Ọ bụ nwoke dị ike nwe ala,+Ọ bụkwa onye a na-asọ anya bi n’ime ya.   Ị gbawawo ndị inyom di ha nwụrụ aka wee sị ha lawa,Meekwa ka ogwe aka ụmụ na-enweghị nna ghara ịdị ike.+ 10  Ọ bụ ya mere ọnyà nnụnụ ji gbaa gị gburugburu,+Ụjọ mberede na-ekowekwa gị obi n’elu; 11  Ma ọ bụ, ọ bụ ya mere ọchịchịrị ji gbaa ka ị ghara ịhụ ụzọ,Oké idei mmiri ekpuchiekwa gị. 12  Ọ̀ bụ na Chineke adịghị elu dị ka eluigwe?+Leekwa kpakpando niile,+ na ha dị n’ebe dị elu. 13  Ma gị onwe gị asịwo: ‘Gịnịkwanụ ka Chineke ma?Ọ̀ pụrụ ikpe ikpe ihe e mere n’oké ọchịchịrị? 14  Ígwé ojii bụ ebe ọ na-ezo, nke mere na ọ dịghị ahụ ụzọ,Ọ bụkwa n’uko nke eluigwe ka ọ na-ejegharị.’ 15  Ị̀ ga na-eje ije n’ụzọ dịwara kemgbe oge ochie,Nke ndị na-eme ihe ọjọọ jeworo ije na ya, 16  Ndị a dọkpụụrụ pụọ tupu oge ha eruo,+Bụ́ ndị a na-awụfu ntọala+ ha dị nnọọ ka mmiri, 17  Ndị na-asị ezi Chineke: ‘Hapụ anyị!+Gịnịkwanụ ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-eme anyị?’ 18  Ma ya onwe ya emewo ka ihe ọma jupụta n’ụlọ ha;+Atụmatụ ndị na-eme ihe ọjọọ dịkwa anya n’ebe m nọ.+ 19  Ndị ezi omume ga-ahụ ya ma ṅụrịa ọṅụ,+Onye aka ya dị ọcha ga-akwa ha emo, sị: 20  ‘N’ezie, e kpochapụwo ndị na-emegide anyị;Ọkụ ga-erechapụkwa ihe fọdụrụ n’ime ha.’ 21  Biko, mata onye ọ bụ, ka gị na ya wee dịrị n’udo;Otú ahụ ka ị ga-esi nweta ihe ọma. 22  Biko, nabata iwu si n’ọnụ ya,Tinyekwa okwu ya n’obi gị.+ 23  Ọ bụrụ na ị laghachikwute Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ a ga-eweghachi gị n’ọnọdụ gị;Ọ bụrụ na i mee ka ajọ omume dị anya n’ụlọikwuu gị, 24  Ọ bụrụkwa na i lie nkume dị oké ọnụ ahịa n’ala,Debekwa ọlaedo Ofa+ n’oké nkume dị na ndagwurugwu iyi, 25  Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-aghọkwara gị nkume dị oké ọnụ ahịa,Ghọọkwara gị ọlaọcha kasị mma.+ 26  N’ihi na mgbe ahụ, ihe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-atọ gị ụtọ nke ukwuu,+Ị ga-ewelikwa ihu gị elu n’ebe Chineke nọ.+ 27  Ị ga-arịọsi ya arịrịọ ike, ọ ga-anụkwa olu gị;+Ị ga-emezukwa ihe i kwere ná nkwa.+ 28  Ị ga-ekpebikwa ihe, ya adịrị gị otú ahụ;Ìhè ga na-enwukwa n’ụzọ gị.+ 29  N’ihi na a ga-eweda gị n’ala ma ọ bụrụ na i jiri mpako na-ekwu okwu;+Ma ọ ga-azọpụta onye dị umeala n’obi.+ 30  Ọ ga-anapụta onye na-enweghị ihe o mere,+A ga-anapụtakwa gị n’ihi na aka gị dị ọcha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji