Jeremaya 7:1-34

7  Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị, sị:  “Guzo n’ọnụ ụzọ ámá nke ụlọ Jehova, kwusaakwa okwu a n’ebe ahụ,+ sị, ‘Nụrụnụ okwu Jehova, unu ndị Juda niile, ndị na-abanye n’ọnụ ụzọ ámá ndị a ịga kpọọrọ Jehova isiala.  Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Meenụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma, m ga-ahapụkwa unu ka unu biri n’ebe a.+  Unu atụkwasịla obi n’okwu ụgha,+ na-asị: ‘Ụlọ nsọ Jehova, ụlọ nsọ Jehova, ihe a bụ ụlọ nsọ Jehova!’  N’ihi na ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu dị mma, ọ bụrụ na unu ekpee ikpe ziri ezi n’etiti mmadụ na ibe ya,+  ọ bụrụ na unu emegbughị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ,+ ọ bụrụ na unu awụfughị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe a,+ ọ bụrụkwa na unu esoghị chi ọzọ dị iche iche iji kpatara onwe unu ọdachi,+  mụ onwe m ga-ahapụ unu ka unu biri n’ebe a, n’ala m nyere nna nna unu hà, malite na mgbe a na-akaghị aka ọbụna ruo mgbe a na-akaghị aka.”’”+  “Lee, unu tụkwasịrị obi n’okwu ụgha—ọ gaghị abara unu uru ma ọlị.+  Ùnu ga na-ezu ohi,+ na-egbu ọchụ,+ na-akwa iko,+ na-aṅụ iyi ụgha,+ na-esurere Bel ihe nsure ọkụ,+ na-eso chi ọzọ dị iche iche unu na-amaghị,+ 10  unu abịakwa guzo n’ihu m n’ụlọ a nke a kpọkwasịrị aha m,+ unu wee na-asị, ‘A ga-anapụta anyị,’ n’agbanyeghị na unu na-eme ihe arụ a niile? 11  Ụlọ a nke a kpọkwasịrị aha m+ ọ̀ ghọworo unu ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe?+ Lee, mụ onwe m ahụwo ya,” ka Jehova kwuru.+ 12  “‘Otú ọ dị, gaanụ n’ụlọ m nke dị na Shaịlo,+ bụ́ ebe m mere ka aha m biri na mbụ,+ hụ ihe m mere ya n’ihi ihe ọjọọ ndị m bụ́ Izrel mere.+ 13  Ebe ọ bụ na unu nọ na-eme ihe ndị a,’ ka Jehova kwuru, ‘mụ onwe m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu egeghị ntị,+ m nọkwa na-akpọ unu òkù, ma unu azaghị,+ 14  ihe m mere Shaịlo+ ka m ga-emekwa ụlọ a nke a kpọkwasịrị aha m,+ nke unu tụkwasịrị obi,+ bụ́ ebe m nyere unu, nyekwa nna nna unu hà. 15  M ga-esi n’ihu m chụpụ unu,+ dị nnọọ ka m chụpụrụ ụmụnne unu niile, bụ́ ụmụ Ifrem niile.’+ 16  “Ma gị onwe gị, ekpela ekpere n’ihi ndị a, ebesarala m ákwá n’ihi ha ma ọ bụ kpeere ha ekpere, arịọkwala m arịrịọ n’ihi ha,+ n’ihi na agaghị m ege gị ntị.+ 17  Ị́ dịghị ahụ ihe ha na-eme n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem?+ 18  Ụmụ na-akpata nkụ, ndị nna ana-emenwu ọkụ, ndị nwunye ana-agwọ ntụ ọka* iji mee achịcha e ji achụrụ ‘eze nwaanyị nke eluigwe’ àjà;+ ha na-awụsakwara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ+ iji kpasuo m iwe.+ 19  ‘Ọ̀ bụ m ka ha na-emejọ?’ ka Jehova kwuru.+ ‘Ọ́ bụghị onwe ha ka ha na-emejọ wee na-emechu onwe ha ihu?’+ 20  Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee! m ga-awụkwasị iwe m na ọnụma m n’ebe a,+ wụkwasịkwa ya ụmụ mmadụ na anụ ụlọ na osisi dị n’ọhịa+ na ihe ala mepụtara; iwe m ga-enwurukwa ọkụ, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’+ 21  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Burunụ anụ àjà unu a na-esurecha n’ọkụ, ya na anụ àjà nkịtị unu, rie.+ 22  N’ihi na agwaghị m nna nna unu hà okwu banyere àjà a na-esurecha n’ọkụ na àjà nkịtị n’ụbọchị m kpọpụtara ha n’ala Ijipt, enyeghịkwa m ha iwu banyere ha.+ 23  Ma, ọ bụ iwu a ka m nyere ha, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru,+ m ga-abụ Chineke unu,+ unu ga-abụkwa ndị m; jeenụ ije n’ụzọ dum+ m ga-enye unu iwu ka unu soro, ka ihe wee gaziere unu.”’+ 24  Ma ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama ha jere ije dị ka atụmatụ ha si dị, dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ha si dị,+ nke mere ha ji na-ala azụ kama ịga ihu,+ 25  malite n’ụbọchị nna nna unu hà si n’Ijipt pụta ruo taa;+ m wee na-ezitere unu ndị ohu m niile bụ́ ndị amụma, na-ebili n’isi ụtụtụ kwa ụbọchị na-ezite ha.+ 26  Ma ha egeghị m ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama ha nọ na-ekwesi olu ike.+ Ha mere ihe ọjọọ karịa ndị nna nna ha!+ 27  “Ị ga-agwa ha ihe a niile,+ ma ha agaghị ege gị ntị; ị ga-akpọ ha òkù, ma ha agaghị aza gị.+ 28  Ị ga-asịkwa ha, ‘Mba a bụ mba nke ndị ya na-erubeghị isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke ha kwuru,+ ha anaraghịkwa ịdọ aka ná ntị.+ Ikwesị ntụkwasị obi alawo n’iyi, ọ dịghịkwa n’ọnụ ha.’+ 29  “Kpụọ isi gị, chịfuokwa ntutu gị,+ nọrọ n’ugwu ọhịa na-adịghị bụọ abụ iru uju,+ n’ihi na Jehova ajụwo+ ọgbọ ọ na-eweso iwe,+ ọ ga-agbahapụkwa ya. 30  ‘N’ihi na ụmụ Juda emewo ihe jọrọ njọ n’anya m,’ ka Jehova kwuru. ‘Ha edebewo ihe arụ ha n’ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m, ka ha merụọ ya.+ 31  Ha ewuwo ebe ndị dị elu na Tofet,+ nke dị na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ iji suree ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ,+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu, ọ bataghịkwa m n’obi.’+ 32  “‘Ya mere, lee! oge na-abịa,’ ka Jehova kwuru, ‘mgbe a na-agakwaghị asị na ọ bụ Tofet na ndagwurugwu nwa Hinọm, kama a ga-asị na ọ bụ ndagwurugwu igbu mmadụ;+ a ga na-eli ozu na Tofet, ruo mgbe a ga na-achọ ebe ili ozu achọ.+ 33  Ozu ha ga-aghọrọ anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ihe oriri, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.+ 34  M ga-eme ka a ghara ịnụkwa mkpu ọṅụ na mkpu obi ụtọ na olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem; n’ihi na ala a ga-aghọ naanị ebe a lara n’iyi.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.