Jeremaya 25:1-38

25  Nke a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile n’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ya bụ, n’afọ mbụ nke ọchịchị Nebukadreza, bụ́ eze Babịlọn;  bụ́ okwu Jeremaya onye amụma kwuru banyere ndị Juda niile nakwa banyere ndị niile bi na Jeruselem, sị:  “Malite n’afọ nke iri na atọ nke ọchịchị Josaya+ nwa Emọn, bụ́ eze Juda, ruo taa, afọ iri abụọ na atọ a, okwu Jehova anọwo na-eru m ntị, m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ekwu okwu, ma unu egeghị ntị.+  Jehova zitekwaara unu ndị ohu ya niile bụ́ ndị amụma, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha, ma unu egeghị ntị,+ unu atọghịkwa ntị n’ala wee gee ntị,+  ha na-asị, ‘Biko, ka onye ọ bụla hapụ ụzọ ọjọọ ya na omume ọjọọ ya+ wee biri n’ala Jehova nyere unu na nna nna unu hà malite n’oge dị anya gara aga ruo n’ogologo oge na-abịa abịa.+  Unu esokwala chi ọzọ dị iche iche ka unu fee ha ofufe, kpọkwaara ha isiala, ka unu wee ghara iji ọrụ aka unu kpasuo m iwe, ka m wee ghara ime ka ọdachi dakwasị unu.’+  “‘Ma unu egeghị m ntị,’ ka Jehova kwuru, ‘ka unu wee jiri ọrụ aka unu kpasuo m iwe, wee kpatara onwe unu ọdachi.’+  “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘“Ebe ọ bụ na unu erubeghị isi n’ihe m kwuru,  lee, m ga-ezi ozi, m ga-akpọtakwa ezinụlọ niile si n’ebe ugwu,”+ ka Jehova kwuru, “zigara Nebukadreza eze Babịlọn, bụ́ ohu m,+ ozi, m ga-emekwa ka ha bịa buso ala a+ na ndị bi n’ime ya na mba ndị a niile gbara ya gburugburu agha;+ m ga-ebibi ha ma mee ka ha bụrụ ihe ijuanya na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị+ na ebe a ga-ala n’iyi ruo mgbe a na-akaghị aka.+ 10  M ga-eme ka a ghara ịnụkwa olu aṅụrị na olu obi ụtọ n’etiti ha+ nakwa olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ,+ ụda nkume igwe nri,+ meekwa ka a ghara ịhụkwa ìhè oriọna.+ 11  Ala a dum ga-aghọ ebe a lara n’iyi na ihe ijuanya, mba ndị a ga-ejere eze Babịlọn ozi ruo afọ iri asaa.”’+ 12  “‘Ọ ga-erukwa na mgbe afọ iri asaa gasịrị,+ m ga-eme ka eze Babịlọn na mba ahụ,+ ya bụ, ala ndị Kaldia, zaa ajụjụ maka njehie ha,’+ ka Jehova kwuru, ‘m ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi.+ 13  M ga-eme ka ihe niile m kwuru na m ga-eme ala ahụ mezuo n’isi ya, ya bụ, ihe dum e dere n’akwụkwọ a, nke Jeremaya buru amụma na a ga-eme mba dị iche iche.+ 14  N’ihi na ha onwe ha, ya bụ, ọtụtụ mba na ndị eze ukwu,+ erigbuwo ha dị ka ndị ohu;+ m ga-akwụ ha ụgwọ dị ka ihe ha mere si dị nakwa dị ka ọrụ aka ha si dị.’”+ 15  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel gwara m: “Nara m iko mmanya a nke ọnụma m, meekwa ka mba niile m ga-eziga gị ṅụọ ya.+ 16  Ha ga-aṅụ ya wee na-aṅagharị dị ka ndị ara na-agba n’ihi mma agha nke m na-eziga n’etiti ha.”+ 17  M wee nara Jehova iko ahụ wee mee ka mba niile Jehova zigara m ṅụọ mmanya dị na ya:+ 18  ya bụ, Jeruselem na obodo ndị dị na Juda, tinyere ndị eze ya, ndị isi ya, iji mee ka ha bụrụ ebe a lara n’iyi, ihe ijuanya,+ ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị na ihe a bụrụ ọnụ, dị nnọọ ka ọ dị taa;+ 19  Fero bụ́ eze Ijipt na ndị na-ejere ya ozi na ndị o mere ndị isi na ndị ya niile;+ 20  na ìgwè mmadụ dum gwara ọgwa, na ndị eze niile nke ala Ọz,+ na ndị eze niile nke ala ndị Filistia+ na Ashkelọn+ na Geza na Ekrọn+ na ndị fọdụrụ n’Ashdọd;+ 21  Idọm+ na Moab+ na ụmụ Amọn;+ 22  na ndị eze niile nke Taya+ na ndị eze niile nke Saịdọn+ na ndị eze nke agwaetiti dị n’ógbè oké osimiri; 23  na Didan+ na Tima+ na Bọz na ndị niile na-akpụ ntutu dị n’agba ntị abụọ ha;+ 24  na ndị eze niile nke ndị Arab+ na ndị eze niile nke ìgwè mmadụ gwara ọgwa, bụ́ ndị bi n’ala ịkpa; 25  na ndị eze niile nke Zimraị na ndị eze niile nke Ilam+ na ndị eze niile nke ndị Midia;+ 26  na ndị eze niile nke ebe ugwu, ndị nọ nso na ndị nọ n’ebe dị anya, n’otu n’otu, na alaeze niile ọzọ nke ụwa bụ́ ndị dị n’elu ala; eze Shishak+ ga-aṅụkwa ya mgbe ha ṅụchara. 27  “Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ṅụọnụ ya, ṅụbiga ya ókè, gbọọkwanụ agbọ daa n’ala ka unu ghara inwe ike ibili+ n’ihi mma agha m na-ezite n’etiti unu.”’+ 28  Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko ahụ wee ṅụọ mmanya dị n’ime ya, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Unu aghaghị ịṅụ ya.+ 29  N’ihi na, lee! ọ bụ n’obodo a kpọkwasịrị aha m ka m ga-amalite iweta ọdachi,+ ò nwere otú unu ga-esi gbanahụ ntaramahụhụ?”’+ “‘Unu agaghị agbanahụ ntaramahụhụ, n’ihi na e nwere mma agha m na-akpọ òkù ka ọ bịakwasị ndị niile bi n’ụwa,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 30  “Gị onwe gị ga-eburu ha okwu ndị a n’amụma, sị ha, ‘Jehova ga-esi n’elu bigbọọ,+ ọ ga-esi n’ebe obibi ya dị nsọ mee ka a nụ olu ya.+ Ọ ghaghị ibigbọrọ ebe obibi ya. Ọ ga-eji oké olu bụọ abụ yiri nke ndị na-azọchapụta mmanya megide ndị niile bi n’ụwa.’+ 31  “‘Mkpọtụ ga-eru n’ebe kasị anya n’ụwa, n’ihi na Jehova na mba niile ga-aba n’ikpe.+ Ọ ga-ekpe anụ ahụ́ niile ikpe.+ Ọ ga-enyefe ndị ajọ omume n’aka mma agha,’+ ka Jehova kwuru. 32  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Lee! Ọdachi ga-esi n’otu mba ruo ná mba ọzọ,+ a ga-esikwa n’ime ime ụwa kpalie oké ifufe.+ 33  N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa.+ A gaghị akwara ha ákwá arịrị, a gaghịkwa achịkọta ha ma ọ bụ lie ha.+ Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.’+ 34  “Kwasienụ ákwá ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu ákwá!+ Tụrụọnụ onwe unu n’ala,+ unu ndị bụ́ ndị ukwu n’etiti ìgwè atụrụ,+ n’ihi na ụbọchị a ga-egbu unu na ụbọchị a ga-achụsasị unu eruwo,+ unu ga-ada n’ala dị ka arịa dị oké ọnụ ahịa!+ 35  Ndị ọzụzụ atụrụ enweghị ebe ha ga-agbaba, ndị bụ́ ndị ukwu n’etiti ìgwè atụrụ enweghịkwa otú ha ga-esi gbapụ.+ 36  Geenụ ntị! Ndị ọzụzụ atụrụ na-eti mkpu, ndị bụ́ ndị ukwu n’etiti ìgwè atụrụ na-eti mkpu ákwá, n’ihi na Jehova na-ebibi ebe ịta nri ha. 37  E mewokwa ka a ghara inwe ihe dị ndụ n’ebe obibi ndị udo dị n’ihi iwe dị ọkụ nke Jehova.+ 38  Ọ pụtawo dị ka nwa ọdụm tojuru etoju nke si n’ọgba ya pụta,+ n’ihi na ala ha aghọwo ihe ijuanya n’ihi mma agha nke na-emesi ha ike nakwa n’ihi iwe ya dị ọkụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji