Jenesis 6:1-22

6  O wee ruo na mgbe ndị mmadụ malitere ịmụba n’elu ala, a mụọkwara ha ụmụ ndị inyom,+  mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke+ malitere ịhụ+ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma; ha wee na-alụrụ ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ.  E mesịa, Jehova sịrị: “Mmụọ m+ agaghị enwere mmadụ ndidi ruo mgbe a na-akaghị aka+ n’ihi na ya onwe ya bụ anụ ahụ́.+ N’ihi ya, ụbọchị ya ga-adị otu narị afọ na iri abụọ.”+  Ndị Nefilim nọ n’ụwa n’oge ahụ, nakwa mgbe ọ gasịrị, mgbe ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke na ụmụ ndị inyom nke mmadụ nọ na-enwe mmekọahụ, ha wee mụọrọ ha ụmụ ndị ikom, ha bụ ndị dike, ndị biri n’oge gboo, ndị ikom a ma ama.  N’ihi ya, Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche+ mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.+  Jehova wee nwee mwute+ na o mere mmadụ n’ụwa, o wee wute ya n’obi.+  Jehova wee sị: “M gaje ikpochapụ ndị mmadụ n’elu ala, bụ́ ndị m kere,+ malite na mmadụ ruo n’anụ ụlọ, ruo n’anụ ndị ọzọ na-agagharị agagharị, ruokwa n’anụ ufe nke eluigwe,+ n’ihi na ọ na-ewute m na m kere ha.”+  Ma ihe Noa masịrị Jehova.  Nke a bụ akụkọ banyere Noa. Noa bụ onye ezi omume.+ Ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ. Noa so ezi Chineke jee ije.+ 10  Ka oge na-aga, Noa mụrụ ụmụ ndị ikom atọ, Shem, Ham na Jefet.+ 11  Ụwa wee bụrụ ihe e bibiri ebibi n’anya ezi Chineke,+ ụwa wee jupụta n’ime ihe ike.+ 12  Chineke wee hụ ụwa, ma, lee! e bibiri ya ebibi,+ n’ihi na anụ ahụ́ niile ebibiwo ụzọ ha n’elu ụwa.+ 13  E mesịa, Chineke sịrị Noa: “Ahụla m na ọgwụgwụ nke anụ ahụ́ niile eruwo,+ n’ihi na ụwa jupụtara n’ime ihe ike n’ihi ha; lee, m na-ebibikọta ha na ụwa.+ 14  Jiri osisi gofa rụọrọ onwe gị ụgbọ.+ Ị ga-arụnye nkebi dị iche iche n’ụgbọ ahụ, ị ga-ejikwa korota+ techie ya ime na azụ. 15  Ọ bụkwa otú a ka ị ga-esi rụọ ya: ụgbọ ahụ ga-adị narị kubit atọ n’ogologo,+ kubit iri ise n’obosara, nakwa kubit iri atọ n’ịdị elu. 16  Ị ga-arụnye oghere ìhè ga-esi na-abata [ma ọ bụ, windo] n’ụgbọ ahụ, ị ga-arụcha akụkụ ya ka ọ fọdụ otu kubit ka o ruo n’elu ya, ị ga-arụnyekwa ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ n’akụkụ ya;+ ị ga-arụkwa ya ka ọ dị okpukpu okpukpu, otu n’ala, otu n’etiti, otu n’elu. 17  “Ma mụ onwe m, lee, m ga-eweta iju mmiri+ n’elu ụwa iji bibie anụ ahụ́ niile ike ndụ+ na-arụ ọrụ n’ime ha n’okpuru eluigwe. Ihe ọ bụla dị n’ụwa ga-ekubi ume.+ 18  M na-eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị n’etiti mụ na gị; ị ga-abanyekwa n’ụgbọ ahụ, gị na ụmụ gị na nwunye gị na ndị nwunye ụmụ gị.+ 19  Ị ga-achịbata ụdị anụ ahụ́ ọ bụla e kere eke dị ndụ+ abụọ abụọ n’ime ụgbọ ahụ iji chebe ha ndụ.+ Ha ga-abụ oké na nne. 20  Abụọ abụọ n’ime anụ ufe n’ụdị ha dị iche iche nakwa n’ime anụ ụlọ n’ụdị ha dị iche iche,+ nakwa n’ime anụ ndị ọzọ na-agagharị agagharị n’ala n’ụdị ha dị iche iche, ga-abakwuru gị n’ebe ahụ iji chebe ha ndụ.+ 21  Ma gị onwe gị, were ụdị ihe oriri ọ bụla a na-eri eri;+ chịkọtara ya onwe gị, ọ ga-abụkwara gị na ha ihe oriri.”+ 22  Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji