Jenesis 50:1-26
50 Josef wee dakwasị nna ya n’ihu+ wee malite ibere ya ákwá ma susuo ya ọnụ.+
2 E mesịa, Josef nyere ndị na-ejere ya ozi, bụ́ ndị dibịa, iwu, ka ha gbasie+ ozu nna ya. Ndị dibịa ahụ wee gbasie ozu Izrel,
3 ha wepụtaara ya iri ụbọchị anọ zuru ezu, n’ihi na ha na-eji ọtụtụ ụbọchị ole a agbasi ozu, ndị Ijipt wee na-ebere ya ákwá ruo ụbọchị iri asaa.+
4 N’ikpeazụ, ụbọchị ịkwara ya ákwá gabigara, Josef wee gwa ezinụlọ Fero, sị: “Ugbu a, ọ bụrụ na ihe m masịrị unu,+ biko, kwuonụ ná ntị Fero, sị,
5 ‘Nna m mere ka m ṅụọ iyi,+ sị: “Lee! Anwụwala m.+ Ọ bụ n’ili m nke m gwuuru onwe m n’ala Kenan+ ka ị ga-eli m.”+ Ugbu a, biko, ka m gaa lie nna m, e mesịakwa, aga m adị njikere ịlọghachi.’”
6 Fero wee sị: “Gaa lie nna gị dị nnọọ ka o mere ka ị ṅụọ iyi.”+
7 Josef wee gaa ka o lie nna ya, ndị niile na-ejere Fero ozi, ndị okenye+ ezinụlọ ya na ndị okenye niile nke ala Ijipt wee soro ya gaa,
8 tinyere ndị ezinụlọ Josef niile na ụmụnne ya na ezinụlọ nna ya.+ Ọ bụ naanị ụmụntakịrị ha na ìgwè atụrụ ha na ìgwè ehi ha ka ha hapụrụ n’ala Goshen.
9 Ma ụgbọ ịnyịnya+ ma ndị na-agba ịnyịnya sokwa ya gaa, ìgwè mmadụ ahụ wee dị nnọọ ukwuu.
10 Ha wee rute n’ebe nzọcha mkpụrụ+ nke dị n’Etad, nke dị n’ógbè Jọdan, n’ebe ahụ ka ha kwara nnọọ ákwá arịrị nke ukwuu, o wee ruoro nna ya uju ụbọchị asaa.+
11 Ndị bi n’ala ahụ, bụ́ ndị Kenan, wee hụ ndị ahụ na-eru uju n’ebe nzọcha mkpụrụ nke dị n’Etad, ha wee tie mkpu, sị: “Ihe a bụ oké iru uju nye ndị Ijipt!” Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ebe ahụ Ebel-mizreyim, nke dị n’ógbè Jọdan.+
12 Ụmụ ya wee meere ya kpọmkwem dị ka o nyere ha n’iwu.+
13 Ụmụ ya wee buru ya gaa n’ala Kenan wee lie ya n’ọgba dị n’ala Mak-pila, n’ala Ebreham zụrụ Ifrọn onye Het nke dị n’ihu Mamri+ ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu.
14 Mgbe Josef lisịrị nna ya, ọ laghachiri n’Ijipt, ya na ụmụnne ya na ndị niile so ya gaa lie nna ya.
15 Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha malitere ịsị: “Ọ pụrụ ịbụ na Josef buuru anyị iwe n’obi,+ ọ ghaghịkwa ịkwụ anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya.”+
16 Ha wee gwa Josef na e nyere ya iwu, wee sị ya: “Nna gị nyere iwu a tupu ya anwụọ wee sị,
17 ‘Nke a bụ ihe unu ga-agwa Josef: “Ana m arịọ gị, biko, gbaghara njehie+ ụmụnne gị na mmehie ha n’ihi na ha mere gị ihe ọjọọ.”’+ Ugbu a, biko, gbaghara njehie nke ndị ohu Chineke nke nna gị.”+ Josef wee malite ibe ákwá mgbe ha gwara ya okwu ahụ.
18 E mesịa, ụmụnne ya bịakwara daa n’ala n’ihu ya wee sị: “Lee, anyị bụ ndị ohu gị!”+
19 Josef wee sị ha: “Unu atụla egwu, n’ihi na ànọ m n’ọnọdụ Chineke?+
20 Unu onwe unu buuru m ihe ọjọọ n’obi. Chineke bu n’obi ka ọ bụrụ ihe ọma ka o wee mee ihe dị ka ọ dị taa iji chebe ọtụtụ mmadụ ndụ.+
21 Ya mere, unu atụla egwu. Mụ onwe m ga na-enye unu na ụmụntakịrị unu ihe oriri.”+ O wee si otú ahụ kasie ha obi wee gwa ha okwu mesiri ha obi ike.
22 Josef wee na-ebi n’Ijipt, ya na ụlọ nna ya; Josef dịrị ndụ otu narị afọ na iri.
23 Josef wee hụ ụmụ Ifrem ruo ọgbọ nke atọ,+ hụkwa ụmụ Mekia,+ nwa Manase. A mụrụ ha n’ikpere Josef.+
24 N’ikpeazụ, Josef sịrị ụmụnne ya: “Anwụwala m; ma Chineke aghaghị iche ihu ya n’ebe unu nọ,+ ọ ga-akpọpụta unu n’ala a wee kpọga unu n’ala ọ ṅụụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi inye ha.”+
25 N’ihi ya, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi, sị: “Chineke aghaghị iche ihu ya n’ebe unu nọ. Ya mere, unu ga-achịrị ọkpụkpụ m pụọ n’ebe a.”+
26 E mesịa, Josef nwụrụ mgbe ọ gbara otu narị afọ na iri; ha wee gbasie ozu+ ya, e wee tinye ya n’igbe ozu n’Ijipt.