Jenesis 5:1-32

5  Nke a bụ akwụkwọ nke kọrọ akụkọ Adam. N’ụbọchị Chineke kere Adam, o mere ya n’oyiyi Chineke.+  Nwoke na nwaanyị ka o kere+ ha. E mesịa, ọ gọziri ha ma kpọọ ha Mmadụ+ n’ụbọchị e kere+ ha.  Adam dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ. O wee mụọ nwa nwoke n’oyiyi ya, n’onyinyo ya, ma gụọ ya Set.+  Ụbọchị Adam dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Set, dị narị afọ asatọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.+  Ụbọchị niile Adam dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri atọ, o wee nwụọ.+  Set dịrị ndụ otu narị afọ na ise. O wee mụọ Inọsh.+  Mgbe Set mụsịrị Inọsh, ọ dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.  Ụbọchị niile Set dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri na abụọ, o wee nwụọ.  Inọsh dịrị ndụ afọ iri itoolu. O wee mụọ Kinan.+ 10  Mgbe Inọsh mụsịrị Kinan, ọ dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri na ise. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 11  Ụbọchị niile Inọsh dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na ise, o wee nwụọ. 12  Kinan dịrị ndụ afọ iri asaa. O wee mụọ Mahalalel.+ 13  Mgbe Kinan mụsịrị Mahalalel, ọ dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri anọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 14  Ụbọchị niile Kinan dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri, o wee nwụọ. 15  Mahalalel dịrị ndụ ruo afọ iri isii na ise. O wee mụọ Jered.+ 16  Mgbe Mahalalel mụsịrị Jered, ọ dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri atọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 17  Ụbọchị niile Mahalalel dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ asatọ na iri itoolu na ise, o wee nwụọ. 18  Jered dịrị ndụ otu narị afọ na iri isii na abụọ. O wee mụọ Inọk.+ 19  Mgbe Jered mụsịrị Inọk, ọ dịrị ndụ narị afọ asatọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 20  Ụbọchị niile Jered dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri isii na abụọ, o wee nwụọ. 21  Inọk dịrị ndụ afọ iri isii na ise. O wee mụọ Metusela.+ 22  Mgbe Inọk mụsịrị Metusela, o soro ezi Chineke na-eje ije ruo narị afọ atọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 23  Ụbọchị niile Inọk dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ atọ na iri isii na ise. 24  Inọk wee soro ezi Chineke+ na-eje ije.+ Ma ọ nọkwaghị, n’ihi na Chineke kpọpụrụ+ ya. 25  Metusela dịrị ndụ otu narị afọ na iri asatọ na asaa. O wee mụọ Lemek.+ 26  Mgbe Metusela mụsịrị Lemek, ọ dịrị ndụ narị afọ asaa na iri asatọ na abụọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 27  Ụbọchị niile Metusela dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri isii na itoolu, o wee nwụọ. 28  Lemek dịrị ndụ otu narị afọ na iri asatọ na abụọ. O wee mụọ nwa nwoke. 29  O wee gụọ ya Noa,+ sị: “Onye a ga-ewetara anyị nkasi obi n’ọrụ anyị nakwa ná ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ihi ọnụ Jehova bụrụ ala.”+ 30  Mgbe Lemek mụsịrị Noa, ọ dịrị ndụ narị afọ ise na iri itoolu na ise. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 31  Ụbọchị niile Lemek dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ asaa na iri asaa na asaa, o wee nwụọ. 32  Noa gbara narị afọ ise. E mesịa, Noa mụrụ Shem,+ Ham+ na Jefet.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji