Jenesis 48:1-22
48 O wee ruo mgbe ihe ndị a gasịrị na a gwara Josef, sị: “Lee, ike agwụwala nna gị.” O wee kpọrọ ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ́ Manase na Ifrem.+
2 E wee kọọrọ Jekọb, sị: “Lee, nwa gị Josef abịakwutewo gị.” Izrel wee gbalịsie ike nọrọ ọdụ n’ihe ndina ya.
3 Jekọb wee gwa Josef, sị:
“Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile pụtara ìhè n’ihu m na Lọz+ n’ala Kenan ka o wee gọzie m.+
4 O wee sị m, ‘Lee, m ga-eme ka ị mụọ ọmụmụ,+ m ga-emekwa ka ị dị ọtụtụ, m ga-eme ka ị ghọọ ìgwè ndị dị iche iche,+ m ga-enyekwa mkpụrụ gị ga-anọchi gị ala a ka ọ bụrụ ihe onwunwe ha ruo mgbe a na-akaghị aka.’+
5 Ugbu a, ụmụ gị ndị ikom abụọ ndị a mụụrụ gị n’ala Ijipt tupu mụ abịakwute gị n’Ijipt ebe a, ha bụ nke m.+ Ifrem na Manase ga-abụ nke m dị ka Ruben na Simiọn.+
6 Ma, ụmụ ị ga-amụ bụ́ ndị ha ga-atọ ga-abụ nke gị. Ha ga-azakwa aha ụmụnne ha ma a bịa n’ihe nketa ha.+
7 Mụ onwe m, mgbe m si Padan+ na-alọta, Rechel nwụrụ+ n’ụzọ n’akụkụ m n’ala Kenan, mgbe ụzọ ka dị anya tupu e rute Efrat,+ m wee lie ya n’ebe ahụ n’ụzọ Efrat, ya bụ, Betlehem.”+
8 Izrel wee hụ ụmụ ndị ikom Josef wee sị: “Ndị a bụ ole ndị?”+
9 Josef wee sị nna ya: “Ha bụ ụmụ Chineke nyere m n’ebe a.”+ O wee sị: “Biko, kpọtara m ha ka m gọzie ha.”+
10 Ugbu a, nká emeela ka anya Izrel na-ahụ inyoghi inyoghi.+ O nweghị ike ịhụ ụzọ. O wee kpọrọ ha rute nso n’ebe ọ nọ, o wee susuo ha ọnụ, makụọkwa ha.+
11 Izrel wee sị Josef: “Amatụdịghị m na m ga-ahụ ihu gị,+ ma, lee, Chineke emewo ka m hụkwa ụmụ gị.”
12 E mesịa, Josef kpọpụtara ha n’ikpere ya, o wee kpọọ isiala.+
13 Josef wee kpọrọ ha abụọ, Ifrem nọ n’aka nri ya ka o wee nọrọ Izrel n’aka+ ekpe, Manase nọkwa n’aka ekpe ya ka o wee nọrọ Izrel n’aka nri,+ o wee kpọrọ ha rute nso n’ebe ọ nọ.
14 Otú ọ dị, Izrel setịrị aka nri ya wee tụkwasị ya n’isi Ifrem,+ ọ bụ ezie na ọ bụ nke nwata,+ ọ tụkwasịkwara aka ekpe ya n’isi Manase.+ Ọ ma ama bikwasị ha aka otú ahụ, ebe ọ bụ na Manase bụ ọkpara.+
15 O wee gọzie Josef, sị:+
“Ezi Chineke bụ́ onye nna m hà bụ́ Ebreham na Aịzik jere ije n’ihu ya,+Ezi Chineke bụ́ onye na-azụ m dị ka atụrụ n’oge niile m dịrị ndụ ruo taa,+
16 Mmụọ ozi nke nọworo na-anapụta m n’ọdachi+ niile, gọzie ụmụ okoro a.+
Ka ha zawa aha m na aha nna m hà bụ́ Ebreham na Aịzik,+Ka ha mụbaa nke ukwuu n’ime ụwa.”+
17 Mgbe Josef hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya n’isi Ifrem, ọ dịghị ya mma,+ o wee gbalịa ijide aka nna ya ka o wepụ ya n’isi Ifrem wee tụkwasị ya n’isi Manase.+
18 N’ihi ya, Josef sịrị nna ya: “Ọ bụghị otú ahụ nna m, n’ihi na ọ bụ onye nke a bụ ọkpara.+ Tụkwasị aka nri gị n’isi ya.”
19 Ma nna ya jụrụ ajụ wee sị: “Ama m, nwa m, ama m. Ya onwe ya kwa ga-aghọ ìgwè mmadụ, ya onwe ya kwa ga-adị ukwuu.+ Ka o sina dị, nwanne ya nke nta ga-aka ya ukwuu,+ ụmụ ya ga-aha nnọọ ka ọtụtụ mba.”+
20 O wee gaa n’ihu ịgọzi ha n’ụbọchị ahụ+, sị:
“Ka Izrel jiri aha gị na-agọzi ndị mmadụ ugboro ugboro, sị,‘Ka Chineke mee ka ị dị ka Ifrem na Manase.’”
O wee si otú ahụ na-ebute Ifrem ụzọ tupu Manase.
21 E mesịa, Izrel sịrị Josef: “Lee, anwụwala m,+ ma Chineke ga-anọnyere unu ma kpọghachi unu n’ala nna nna unu hà.+
22 Ma ana m enye gị ala nke ji otu ibé ala karịa nke ụmụnne gị,+ bụ́ nke m ji mma agha m na ụta m nara ndị Amọraịt.”