Jenesis 47:1-31
47 Josef wee bịa kọọrọ Fero, sị:+ “Nna m na ụmụnne m na ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha nakwa ihe niile ha nwere esiwo n’ala Kenan bịa, lee, ha nọ n’ala Goshen.”+
2 Ọ kpọọrọ mmadụ ise n’ime ụmụnne ya niile, ka o wee kpọrọ ha gakwuru Fero.+
3 Fero wee sị ụmụnne ya: “Gịnị bụ aka ọrụ unu?”+ Ha wee sị Fero: “Ndị ohu gị bụ ndị na-azụ atụrụ,+ ma anyị onwe anyị ma nna nna anyị hà.”+
4 E mesịa, ha gwara Fero, sị: “Anyị abịawo ibi dị ka ndị ọbịa n’ala a,+ n’ihi na ìgwè anụ ụlọ ndị ohu gị enweghị nri ha ga na-ata,+ n’ihi na ụnwụ a siri ike n’ala Kenan.+ Biko, ka ndị ohu gị biri n’ala Goshen.”+
5 Fero wee sị Josef: “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutewo gị n’ebe a.
6 Ala Ijipt dị n’aka gị.+ Mee ka nna gị na ụmụnne gị biri n’ebe kasị mma n’ala a.+ Ka ha biri n’ala Goshen,+ ọ bụrụkwa na ị maara na e nwere ndị nwere obi ike n’etiti ha,+ họpụta ha ka ha bụrụ ndị isi nke ndị na-azụrụ m anụ ụlọ.”+
7 Josef wee kpọbata Jekọb nna ya ma kọwaara Fero onye ọ bụ, Jekọb wee gọzie Fero.+
8 Fero wee sị Jekọb: “Ị̀ gbaala afọ ole?”
9 Jekọb wee sị Fero: “Afọ ole m biworo dị ka ọbịa dị otu narị afọ na iri atọ.+ Afọ ndụ m dị ole na ole, jupụtakwa n’ahụhụ,+ o rughịkwa afọ ole nna m hà dịrị ndụ n’oge ha biri dị ka ndị ọbịa.”+
10 E mesịa, Jekọb gọziri Fero wee si n’ihu Fero pụọ.+
11 Josef wee mee ka nna ya na ụmụnne ya biri n’ala Ijipt, o wee nye ha ala n’ebe kasị nnọọ mma n’ala ahụ, n’ala Ramesis,+ dị nnọọ ka Fero nyere n’iwu.
12 Josef wee na-enye nna ya na ụmụnne ya na ezinụlọ nna ya dum ihe oriri,+ dị ka ọnụ ọgụgụ ụmụntakịrị ha si dị.+
13 Ugbu a, e nweghị ihe oriri n’ala ahụ dum, n’ihi na ụnwụ ahụ siri oké ike;+ ike wee gwụ ndị bi n’ala Ijipt na ndị bi n’ala Kenan n’ihi ụnwụ ahụ.+
14 Josef wee na-atụtụkọrọ ego niile dị n’ala Ijipt nakwa n’ala Kenan bụ́ nke ndị na-azụ ọka* na-akwụ;+ Josef wee na-ewebata ego ahụ n’ụlọ Fero.
15 Ka oge na-aga, ego dị n’ala Ijipt nakwa n’ala Kenan gwụchara, ndị Ijipt niile wee malite ịbịakwute Josef, na-asị: “Nye anyị ihe oriri!+ Gịnị mere anyị ga-eji nwụọ n’ihu gị maka na ego agwụla?”+
16 Josef wee sị: “Ọ bụrụ na ego agwụla, kpụtanụ anụ ụlọ unu, m ga-enyekwa unu ihe oriri, unu ga-enye m anụ ụlọ unu.”
17 Ha wee malite ịkpụtara Josef anụ ụlọ ha; Josef wee na-enye ha ihe oriri, ha wee na-enye ya ịnyịnya ha na ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha na ịnyịnya ibu ha,+ ọ nọkwa na-enye ha ihe oriri, ha wee na-enye ya anụ ụlọ ha niile n’afọ ahụ.
18 Afọ ahụ wee gwụ, ha wee malite ịbịakwute ya n’afọ na-eso ya wee sị ya: “Anyị agaghị ezochiri ya onyenwe m na anyị enyechawo onyenwe m ego anyị, kpụnyekwa ya anụ ụlọ anyị niile.+ Ọ dịghịkwa ihe fọdụrụ n’ihu onyenwe m ma e wezụga ahụ́ anyị na ala anyị.+
19 Gịnị mere anyị ga-eji nwụọ n’ihu gị,+ ma anyị onwe anyị ma ala anyị? Zụrụ anyị, zụrụkwa ala anyị ka i nye anyị ihe oriri,+ anyị onwe anyị na ala anyị ga-aghọkwara Fero ohu; ma nye anyị mkpụrụ ka anyị wee dị ndụ wee ghara ịnwụ, ala anyị ewee ghara ịtọgbọrọ n’efu.”+
20 Josef wee zụtara Fero ala ndị Ijipt dum,+ n’ihi na onye ọ bụla n’ime ndị Ijipt rere ala ya, n’ihi na ụnwụ ahụ kpara ha aka ọjọọ; ala ha wee ghọọ nke Fero.
21 Ma ọ kpọgara ndị Ijipt n’obodo dị iche iche, malite n’otu nsọtụ ókèala Ijipt ruo na nsọtụ nke ọzọ.+
22 Ọ bụ naanị ala ndị nchụàjà ka ọ na-azụrụghị,+ n’ihi na nri ndị nchụàjà na-eri na-esi n’aka Fero, ọ bụkwa nri Fero na-ekenye ha ka ha na-eri.+ Ọ bụ ya mere na ha ereghị ala ha.+
23 Josef wee sị ha: “Lee, azụrụwo m unu na ala unu taa ịbụ nke Fero. Werenụ mkpụrụ, ghaanụ ya n’ala.+
24 Mgbe ọ mịrị mkpụrụ,+ unu ga-enye Fero otu ụzọ n’ụzọ ise,+ ma ụzọ anọ ga-abụ mkpụrụ unu ga-agha n’ubi, bụrụkwa ihe unu na ndị bi n’ụlọ unu na ụmụntakịrị unu ga na-eri.”+
25 Ha wee sị: “I chebewo ndụ anyị.+ Ka onyenwe m nwee mmasị n’ebe anyị nọ, anyị ga-aghọkwara Fero ndị ohu.”+
26 Josef wee mee ka ọ ghọọ iwu n’ala Ijipt ruo taa na a ga na-enye Fero otu ụzọ n’ụzọ ise. Ọ bụ naanị ala ndị nchụàjà, dị ka ìgwè pụrụ iche, bụ nke na-aghọghị nke Fero.+
27 Izrel wee na-ebi n’ala Ijipt, n’ala Goshen;+ ha wee biri na ya, mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nke ukwuu.+
28 Jekọb wee dị ndụ ruo afọ iri na asaa n’ala Ijipt, nke mere na ụbọchị Jekọb dịrị ndụ, afọ ndụ ya, dị otu narị afọ na iri anọ na asaa.+
29 Oge Izrel ga-anwụ wee ruo.+ O wee kpọọ Josef nwa ya wee sị ya: “Ugbu a, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m,+ gosi m obiọma* na ikwesị ntụkwasị obi.+ (Biko, elila m n’Ijipt.)+
30 M ga-esoro nna m hà dinaa,+ ị ga-eburukwa m pụọ n’Ijipt wee lie m n’ili ha.”+ O wee sị: “Mụ onwe m ga-eme ihe i kwuru.”
31 O wee sị: “Ṅụọrọ m iyi.” O wee ṅụọrọ ya iyi.+ Izrel wee kpọọ isiala n’isi ihe ndina ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”