Jenesis 45:1-28
45 Josef enwekwaghị ike ijide onwe ya n’ihu ndị niile guzo n’akụkụ ya.+ O wee tie mkpu, sị: “Meenụ ka mmadụ niile si n’ebe m nọ pụọ!” Ọ dịghịkwa onye ọzọ ya na Josef guzo mgbe o mere ka ụmụnne ya mara onye ọ bụ.+
2 O wee malite ibe ákwá n’olu dara ụda,+ nke mere na ndị Ijipt nụrụ ya, ụlọ Fero nụkwara ya.
3 N’ikpeazụ, Josef gwara ụmụnne ya, sị: “Abụ m Josef. Nna m ọ̀ ka nọ ndụ?” Ma ụmụnne ya enweghị ike ịza ya ihe ọ bụla, n’ihi na ahụ́ erughị ha ala n’ihi ya.+
4 Josef wee gwa ụmụnne ya, sị: “Biko, bịanụ m nso.” Ha wee bịa ya nso.
O wee sị: “Abụ m Josef nwanne unu, onye unu refuru n’Ijipt.+
5 Ma unu enwela mwute,+ unu ewesola ibe unu iwe maka na unu refuru m n’ebe a; n’ihi na ọ bụ maka ichebe ndụ ka Chineke ji buru ụzọ zipụ m tupu unu onwe unu.+
6 N’ihi na nke a bụ afọ nke abụọ nke ụnwụ a dara n’ụwa,+ a ka nwere afọ ise nke a na-agaghị enwe oge ịkọ ihe na iwe ihe ubi.+
7 Ya mere, Chineke zipụrụ m ka m buru unu ụzọ bịa iji mee ka e nwee ndị ga-afọdụrụ+ unu n’ụwa nakwa iji were oké mgbapụta mee ka unu dịrị ndụ.
8 Ya mere, ọ bụghị unu zitere m n’ebe a,+ kama ọ bụ ezi Chineke, ka o wee mee ka m bụụrụ Fero nna,+ bụrụkwa onye nwe ụlọ ya dum nakwa onye na-achị ala Ijipt dum.
9 “Gbagoonụ ka unu gakwuru nna m ọsọ ọsọ, unu ga-asịkwa ya, ‘Nke a bụ ihe nwa gị Josef kwuru: “Chineke emewo ka m bụrụ onye nwe Ijipt dum.+ Bịakwute m. Egbula oge.
10 Ị ga-ebikwa n’ala Goshen,+ ị ga-anọkwa m nso, gị na ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị na ìgwè ewu na atụrụ gị na ìgwè ehi gị na ihe niile i nwere.
11 M ga na-enye gị ihe oriri n’ebe ahụ, n’ihi na a ka nwere afọ ise ụnwụ ga-adị;+ ka gị na ụlọ gị na ihe niile i nwere wee ghara ịda ogbenye.”’
12 Lee, unu ji anya unu na-ahụ, nwanne m Benjamin jikwa anya ya na-ahụ na ọ bụ m ji ọnụ m na-agwa unu okwu.+
13 Ya mere, kọọrọnụ nna m banyere ebube niile m nwere n’Ijipt na ihe niile unu hụrụ; meenụ ngwa ngwa kpọdata nna m n’ebe a.”
14 O wee dakwasị Benjamin nwanne ya n’olu wee kwaa ákwá, Benjamin dakwasịkwara ya n’olu kwaa ákwá.+
15 O wee susuo ụmụnne ya niile ọnụ wee dakwasị ha n’olu kwaa ákwá,+ e mesịa, ya na ụmụnne ya kwurịtara okwu.
16 E wee nụ akụkọ ahụ n’ụlọ Fero, sị: “Ụmụnne Josef abịawo!” O wee dị mma n’anya Fero nakwa n’anya ndị na-ejere ya ozi.+
17 Fero wee gwa Josef, sị: “Sị ụmụnne gị, ‘Meenụ ihe a: Jirinụ ịnyịnya ibu unu buru ihe gaa n’ala Kenan,+
18 kpọrọnụ nna unu na ezinụlọ unu bịakwute m n’ebe a, ka m wee nye unu ihe ọma dị n’ala Ijipt; unu ga-erikwa ihe kasị mma dị n’ala a.+
19 A na-enye gị onwe gị iwu+ ka ị gwa ha, sị: “Meenụ ihe a: Sinụ n’ala Ijipt were ụgbọala+ unu ga-eji bute ụmụntakịrị unu na ndị nwunye unu, unu ga-ejikwa otu bute nna unu n’ebe a.+
20 Unu enwekwala mwute maka ngwongwo unu,+ n’ihi na ihe ọma dị n’ala Ijipt dum bụ nke unu.”’”+
21 Ụmụ Izrel wee mee otú ahụ, Josef wee nye ha ụgbọala dị ka ihe Fero nyere n’iwu si dị, o nyekwara ha ihe oriri+ ha ga-eri n’ụzọ.
22 O nyere onye ọ bụla n’ime ha ákwà mgbokwasị ọhụrụ,+ ma o nyere Benjamin narị mkpụrụ ego ọlaọcha atọ na ákwà mgbokwasị ọhụrụ ise.+
23 Ma o zigakwaara nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu asaa ndị bu ihe ọma dị n’Ijipt na nne ịnyịnya ibu iri ndị bu ọka* na achịcha na ihe nna ya ga-eri n’ụzọ.
24 O wee hapụ ụmụnne ya ka ha lawa, ha wee lawa. Ma ọ sịrị ha: “Unu ewesola ibe unu iwe n’ụzọ.”+
25 Ha wee si n’Ijipt lawa, e mesịa, ha batara n’ala Kenan wee bịakwute Jekọb nna ha.
26 Ha wee kọọrọ ya, sị: “Josef ka nọ ndụ, ọ bụkwa ya na-achị ala Ijipt dum!”+ Ma obi kụnwụrụ ya, n’ihi na o kwetaghị ihe ha kwuru.+
27 Mgbe ha gara n’ihu ịgwa ya ihe niile Josef gwara ha, ya ahụkwa ụgbọala ndị ahụ Josef zitere ka e were bute ya, mmụọ Jekọb nna ha malitere ịtụte.+
28 Izrel wee tie mkpu, sị: “O zuwo! Josef nwa m ka nọ ndụ! Ehee, ka m gaa hụ ya tupu mụ anwụọ!”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.