Jenesis 45:1-28

45  Josef enwekwaghị ike ijide onwe ya n’ihu ndị niile guzo n’akụkụ ya.+ O wee tie mkpu, sị: “Meenụ ka mmadụ niile si n’ebe m nọ pụọ!” Ọ dịghịkwa onye ọzọ ya na Josef guzo mgbe o mere ka ụmụnne ya mara onye ọ bụ.+  O wee malite ibe ákwá n’olu dara ụda,+ nke mere na ndị Ijipt nụrụ ya, ụlọ Fero nụkwara ya.  N’ikpeazụ, Josef gwara ụmụnne ya, sị: “Abụ m Josef. Nna m ọ̀ ka nọ ndụ?” Ma ụmụnne ya enweghị ike ịza ya ihe ọ bụla, n’ihi na ahụ́ erughị ha ala n’ihi ya.+  Josef wee gwa ụmụnne ya, sị: “Biko, bịanụ m nso.” Ha wee bịa ya nso. O wee sị: “Abụ m Josef nwanne unu, onye unu refuru n’Ijipt.+  Ma unu enwela mwute,+ unu ewesola ibe unu iwe maka na unu refuru m n’ebe a; n’ihi na ọ bụ maka ichebe ndụ ka Chineke ji buru ụzọ zipụ m tupu unu onwe unu.+  N’ihi na nke a bụ afọ nke abụọ nke ụnwụ a dara n’ụwa,+ a ka nwere afọ ise nke a na-agaghị enwe oge ịkọ ihe na iwe ihe ubi.+  Ya mere, Chineke zipụrụ m ka m buru unu ụzọ bịa iji mee ka e nwee ndị ga-afọdụrụ+ unu n’ụwa nakwa iji were oké mgbapụta mee ka unu dịrị ndụ.  Ya mere, ọ bụghị unu zitere m n’ebe a,+ kama ọ bụ ezi Chineke, ka o wee mee ka m bụụrụ Fero nna,+ bụrụkwa onye nwe ụlọ ya dum nakwa onye na-achị ala Ijipt dum.  “Gbagoonụ ka unu gakwuru nna m ọsọ ọsọ, unu ga-asịkwa ya, ‘Nke a bụ ihe nwa gị Josef kwuru: “Chineke emewo ka m bụrụ onye nwe Ijipt dum.+ Bịakwute m. Egbula oge. 10  Ị ga-ebikwa n’ala Goshen,+ ị ga-anọkwa m nso, gị na ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị na ìgwè ewu na atụrụ gị na ìgwè ehi gị na ihe niile i nwere. 11  M ga na-enye gị ihe oriri n’ebe ahụ, n’ihi na a ka nwere afọ ise ụnwụ ga-adị;+ ka gị na ụlọ gị na ihe niile i nwere wee ghara ịda ogbenye.”’ 12  Lee, unu ji anya unu na-ahụ, nwanne m Benjamin jikwa anya ya na-ahụ na ọ bụ m ji ọnụ m na-agwa unu okwu.+ 13  Ya mere, kọọrọnụ nna m banyere ebube niile m nwere n’Ijipt na ihe niile unu hụrụ; meenụ ngwa ngwa kpọdata nna m n’ebe a.” 14  O wee dakwasị Benjamin nwanne ya n’olu wee kwaa ákwá, Benjamin dakwasịkwara ya n’olu kwaa ákwá.+ 15  O wee susuo ụmụnne ya niile ọnụ wee dakwasị ha n’olu kwaa ákwá,+ e mesịa, ya na ụmụnne ya kwurịtara okwu. 16  E wee nụ akụkọ ahụ n’ụlọ Fero, sị: “Ụmụnne Josef abịawo!” O wee dị mma n’anya Fero nakwa n’anya ndị na-ejere ya ozi.+ 17  Fero wee gwa Josef, sị: “Sị ụmụnne gị, ‘Meenụ ihe a: Jirinụ ịnyịnya ibu unu buru ihe gaa n’ala Kenan,+ 18  kpọrọnụ nna unu na ezinụlọ unu bịakwute m n’ebe a, ka m wee nye unu ihe ọma dị n’ala Ijipt; unu ga-erikwa ihe kasị mma dị n’ala a.+ 19  A na-enye gị onwe gị iwu+ ka ị gwa ha, sị: “Meenụ ihe a: Sinụ n’ala Ijipt were ụgbọala+ unu ga-eji bute ụmụntakịrị unu na ndị nwunye unu, unu ga-ejikwa otu bute nna unu n’ebe a.+ 20  Unu enwekwala mwute maka ngwongwo unu,+ n’ihi na ihe ọma dị n’ala Ijipt dum bụ nke unu.”’”+ 21  Ụmụ Izrel wee mee otú ahụ, Josef wee nye ha ụgbọala dị ka ihe Fero nyere n’iwu si dị, o nyekwara ha ihe oriri+ ha ga-eri n’ụzọ. 22  O nyere onye ọ bụla n’ime ha ákwà mgbokwasị ọhụrụ,+ ma o nyere Benjamin narị mkpụrụ ego ọlaọcha atọ na ákwà mgbokwasị ọhụrụ ise.+ 23  Ma o zigakwaara nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu asaa ndị bu ihe ọma dị n’Ijipt na nne ịnyịnya ibu iri ndị bu ọka* na achịcha na ihe nna ya ga-eri n’ụzọ. 24  O wee hapụ ụmụnne ya ka ha lawa, ha wee lawa. Ma ọ sịrị ha: “Unu ewesola ibe unu iwe n’ụzọ.”+ 25  Ha wee si n’Ijipt lawa, e mesịa, ha batara n’ala Kenan wee bịakwute Jekọb nna ha. 26  Ha wee kọọrọ ya, sị: “Josef ka nọ ndụ, ọ bụkwa ya na-achị ala Ijipt dum!”+ Ma obi kụnwụrụ ya, n’ihi na o kwetaghị ihe ha kwuru.+ 27  Mgbe ha gara n’ihu ịgwa ya ihe niile Josef gwara ha, ya ahụkwa ụgbọala ndị ahụ Josef zitere ka e were bute ya, mmụọ Jekọb nna ha malitere ịtụte.+ 28  Izrel wee tie mkpu, sị: “O zuwo! Josef nwa m ka nọ ndụ! Ehee, ka m gaa hụ ya tupu mụ anwụọ!”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.