Jenesis 43:1-34
43 Ụnwụ ahụ siri ike n’ala ahụ.+
2 O wee ruo na ozugbo ha richara ọka* ha butere n’Ijipt,+ nna ha sịrị ha: “Laghachinụ zụtara anyị obere ihe oriri.”
3 Juda wee sị ya:+ “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka ná ntị ike, sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ọzọ ọ gwụla ma nwanne unu ò so unu.’+
4 Ọ bụrụ na ị ga-ahapụ nwanne anyị ka o soro anyị,+ anyị dị njikere ịga zụtara gị ihe oriri.
5 Ma ọ bụrụ na ị gaghị ahapụ ya, anyị agaghị aga, n’ihi na nwoke ahụ gwara anyị, sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ọzọ ọ gwụla ma nwanne unu ò so unu.’”+
6 Izrel wee tie mkpu, sị:+ “Gịnị mere unu ji mee m ihe ọjọọ site n’ịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ?”
7 Ha wee sị: “Nwoke ahụ jụrụ ajụjụ kpọmkwem banyere anyị na ndị ikwu anyị, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ?+ Ùnu nwere nwanne ọzọ?’ anyị wee kọọrọ ya ihe ndị a.+ Ò nwere otú anyị ga-esi mara na ọ ga-asị, ‘Kpọtanụ nwanne unu’?”+
8 N’ikpeazụ, Juda gwara Izrel nna ya, sị: “Kpọnye m nwa okoro ahụ,+ ka anyị bilie gawa, ka anyị wee dịrị ndụ ghara ịnwụ,+ ma anyị ma gị onwe gị ma ụmụntakịrị anyị.+
9 M ga-eji onwe m gbaa ibé maka ya.+ N’aka m ka ị ga-anara ụgwọ ya.+ Ọ bụrụ na mụ akpọlataghị ya kpọnye gị, ọ ga-abụ na mụ emehiewo gị ruo mgbe niile.
10 Ma a sị na ọ bụghị oge anyị na-egbu, anyị gaarala aga ebe ahụ nke ugboro abụọ lọta.”+
11 Izrel nna ha wee sị ha: “Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị,+ meenụ nke a: “Tinyenụ ihe ndị kasị mma nke ala a n’akpa unu, burukwanụ ya bugara nwoke ahụ ka ọ bụrụ onyinye:+ obere mmanụ bọlsọm,+ na obere mmanụ aṅụ,+ mmanụ labdanọm na ụgbụgbọ osisi nke nwere esó,+ akị pistashio na almọnd.+
12 Werekwanụ ego okpukpu abụọ; unu ga-ewerekwa ego ahụ e tinyere n’ọnụ akpa unu.+ Ma eleghị anya, ha mere ya n’amaghị ama.+
13 Kpọrọnụ nwanne unu bilie, gaghachikwurunụ nwoke ahụ.
14 Ka Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile mee ka nwoke ahụ nweere unu ọmịiko,+ ka o wee tọhapụrụ unu nwanne unu nke ọzọ nakwa Benjamin. Ma, ọ bụrụ na a ga-agbawa m aka ụmụ, mụ agbaranụ aka ụmụ!”+
15 Ndị ikom ahụ wee buru onyinye a, ha wekwaara ego okpukpu abụọ ma kpọrọ Benjamin. Ha wee bilie gbadaa Ijipt gaa guzo n’ihu Josef.+
16 Mgbe Josef hụrụ Benjamin ka ha na ya so, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya ozugbo, sị: “Kpọba ndị ikom a n’ụlọ, gbuo anụ, kwadebekwa ihe,+ n’ihi na mụ na ndị ikom a ga-eri nri n’ehihie.”
17 Ozugbo ahụ, nwoke ahụ mere nnọọ dị ka Josef kwuru.+ Nwoke ahụ wee kpọrọ ndị ikom ahụ gaa n’ụlọ Josef.
18 Ma egwu tụwara ndị ikom ahụ maka na a kpọgara ha n’ụlọ Josef,+ ha wee malite ịsị: “Ọ bụ n’ihi ego ahụ dị n’akpa anyị nke anyị bu laa na mbụ ka e ji kpọta anyị ebe a ka ha wee dakwasị anyị ma wakpo anyị wee jiri anyị mere ndị ohu, tinyere ịnyịnya ibu anyị!”+
19 Ha wee bịakwute nwoke ahụ na-elekọta ụlọ Josef wee gwa ya okwu n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ,
20 ha wee sị ya: “Biko, onyenwe m! N’ezie, anyị bịara na mbụ ịzụrụ ihe oriri.+
21 Ma o ruru na mgbe anyị rutere n’ebe anyị rahụrụ+ wee malite imeghe akpa anyị, lee, ego onye nke ọ bụla dị n’ọnụ akpa ya, ego anyị zuru ezu n’otú a tụrụ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ya mere, anyị chọrọ iji aka anyị weghachi ya.+
22 Anyị wetakwuru ego iji zụrụ ihe oriri. N’ezie, anyị amaghị onye tinyere ego anyị n’akpa anyị.”+
23 O wee sị: “Unu enweghị nsogbu ọ bụla. Unu atụla egwu.+ Ọ bụ Chineke unu na Chineke nke nna unu tinyeere unu akụ̀ n’akpa unu.+ Ego unu bu ụzọ ruo m aka.” E mesịa, ọ kpọpụtaara ha Simiọn.+
24 Nwoke ahụ wee kpọbata ndị ikom ahụ n’ụlọ Josef wee kunye ha mmiri ka ha saa ụkwụ ha,+ o nyekwara ha nri ịnyịnya ibu ha ga-eri.+
25 Ha wee kwadebe onyinye+ ahụ maka mgbe Josef ga-abịa n’ehihie, n’ihi na ha nụrụ na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha ga-eri ihe oriri.+
26 Mgbe Josef banyere n’ụlọ ahụ, ha wetaara ya onyinye ahụ ha ji n’ime ụlọ, ha wee daara ya n’ala.+
27 E mesịa, ọ jụrụ ha otú ha mere wee sị:+ “Olee otú nna unu mere, bụ́ agadi nwoke ahụ unu kwuru maka ya? Ọ̀ ka nọkwa ndụ?”+
28 Ha wee sị: “Ohu gị bụ́ nna anyị nọ nke ọma. Ọ ka nọ ndụ.” Mgbe ahụ, ha hulatara kpọọ isiala.+
29 Mgbe o lepụrụ anya hụ Benjamin nwanne ya, onye nne ya mụrụ,+ ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye a ọ̀ bụ nwanne unu nke ọdụdụ bụ́ onye unu gwara m maka ya?”+ O kwukwara, sị: “Nwa m, ka Chineke meere gị amara.”+
30 Josef nọ na-eme ọsọ ọsọ ugbu a, n’ihi na obi nwanne mewere ya,+ nke mere na ọ chọrọ ebe ọ ga-anọ kwaa ákwá, o wee banye n’ọnụ ụlọ dị n’ime wee bee ákwá n’ebe ahụ.+
31 E mesịa, ọ sara ihu ya wee pụta ma jikọta onwe ya wee sị:+ “Butenụ nri.”+
32 Ha wee bute nke ya iche, butekwa nke ha iche, butekwara ndị Ijipt iche bụ́ ndị ya na ha nọ na-eri ihe; n’ihi na ndị Ijipt apụghị iso ndị Hibru rie ihe, n’ihi na nke ahụ bụụrụ ndị Ijipt ihe arụ.+
33 Ha wee nọdụ ọdụ n’ihu ya, nke ọkpara dị ka ihe ruuru ya dị ka ọkpara si dị,+ nke ọdụdụ dị ka nwata ọ bụ si dị; ndị ikom ahụ wee kporopụ anya na-ele ibe ha.
34 O wee mee ka e si ná nri dị n’ihu ya na-ebugara ha nri, ma ọ na-eme ka ihe a na-ebugara Benjamin jiri okpukpu ise ka nke ndị nke ọzọ niile.+ Ya na ha wee na-eri, na-aṅụ, afọ wee ju ha.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.