Jenesis 42:1-38

42  E mesịa, Jekọb chọpụtara na ọka* dị n’Ijipt.+ Jekọb wee gwa ụmụ ya ndị ikom, sị: “Gịnị mere unu ji nọrọ na-ele ibe unu anya?”  Ọ sịkwara: “Lee, anụrụ m na ọka dị n’Ijipt.+ Gbadaanụ n’ebe ahụ zụtara anyị ọka, ka anyị wee dị ndụ ghara ịnwụ.”  Ụmụnne+ Josef iri wee gbadaa ịzụta ọka n’Ijipt.  Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin,+ nwanne Josef, soro ụmụnne ya ndị nke ọzọ gaa, n’ihi na ọ sịrị: “Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ọ pụrụ ịnwụ n’ihe mberede.”+  Ụmụ Izrel na ndị ọzọ ndị na-abịa ịzụrụ ihe oriri wee bịarute, n’ihi na ụnwụ ahụ dara n’ala Kenan.+  Ọ bụ Josef na-achị ala ahụ.+ Ọ bụ ya na-eresị ndị niile nke ụwa ihe.+ N’ihi ya, ụmụnne Josef bịara kpọọrọ ya isiala.+  Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ha ozugbo, ma o mere ka ha ghara ịmata ya.+ O wee gwa ha okwu n’olu ike wee sị ha: “Olee ebe unu si bịa?” ha wee sị: “Anyị si n’ala Kenan bịa ịzụrụ ihe oriri.”+  Josef wee mata ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị ya.  Ozugbo ahụ, Josef chetara nrọ ndị ọ rọrọ banyere ha,+ o wee gwa ha, sị: “Unu bụ ndị nledo! Unu bịara ilepụta ebe ala anyị na-adịghị ike!”+ 10  Ha wee sị ya: “Ee e, onyenwe anyị,+ kama ndị ohu gị+ bịara ịzụrụ ihe oriri. 11  Anyị niile bụ ụmụ otu nwoke. Anyị na-eme ihe n’eziokwu. Ndị ohu gị abụghị ndị nledo.”+ 12  Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụghị otú ahụ! N’ihi na unu bịara ilepụta ebe ala anyị na-adịghị ike!”+ 13  Ha wee sị: “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ.+ Anyị bụ ụmụ otu nwoke+ nke nọ n’ala Kenan; lee, nwanne anyị nke ọdụdụ na nna anyị nọ taa,+ ma onye nke ọzọ anọkwaghị.”+ 14  Otú ọ dị, Josef sịrị ha: “Ihe ahụ m gwara unu bụ otú ọ dị, ‘Unu bụ ndị nledo!’ 15  A ga-eji nke a nwalee unu. Dị nnọọ ka Fero dị ndụ, unu agaghị esi ebe a laa ọ gwụla ma nwanne unu nke ọdụdụ ọ̀ bịara ebe a.+ 16  Zipụnụ otu onye n’ime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu, ma a ga-akpọchi unu, ka e wee nwalee okwu unu ma ùnu na-ekwu eziokwu.+ Ma ọ́ bụghị ya, dị nnọọ ka Fero dị ndụ, unu bụ ndị nledo.” 17  O wee tụba ha n’otu ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị atọ. 18  E mesịa, Josef gwara ha n’ụbọchị nke atọ, sị: “Meenụ nke a ka unu wee dịrị ndụ. M na-atụ egwu+ ezi Chineke. 19  Ọ bụrụ na unu na-eme ihe n’eziokwu, ka a hapụ otu n’ime ụmụnne unu n’ụlọ a kpọchiri unu,+ ma ndị nke ọzọ n’ime unu lawa, burunụ ọka, n’ihi ụnwụ dị n’ụlọ unu.+ 20  Unu ga-akpọtakwara m nwanne unu nke ọdụdụ, ka e wee mara na a pụrụ ịtụkwasị okwu unu obi; unu agaghịkwa anwụ.”+ Ha wee mee otú ahụ. 21  Ha wee malite ịgwa ibe ha, sị: “O doro anya na anyị bụ ndị ikpe mara n’ihe metụtara nwanne anyị nwoke,+ n’ihi na anyị hụrụ otú mkpụrụ obi ya si nọrọ ná mwute mgbe ọ nọ na-arịọ anyị ka anyị nweere ya ọmịiko, ma anyị egeghị ntị. Ọ bụ ya mere ahụhụ a ji dakwasị anyị.”+ 22  Ruben wee zaa ha, sị: “Ọ̀ bụ na mụ asịghị unu, ‘Unu emehiela megide nwata ahụ,’ ma unu egeghị ntị?+ Lee, a na-ajụta ọbara ya ugbu a.”+ 23  Ma ha onwe ha amaghị na Josef nọ na-ege ntị, n’ihi na e nwere onye na-asụgharị okwu n’etiti ha. 24  N’ihi ya, o si n’ebe ha nọ pụọ wee malite ịkwa ákwá.+ O wee laghachikwuru ha wee gwa ha okwu ma si n’etiti ha kpọrọ Simiọn+ kee ya agbụ n’ihu ha.+ 25  E mesịa, Josef nyere iwu, ha wee kpojuo ọka n’akpa ha. O nyekwara iwu ka ha tinye ego onye nke ọ bụla n’ime ndị ikom ahụ n’akpa ya,+ nyekwa ha ihe ha ga-eri n’ụzọ.+ E wee meere ha otú ahụ. 26  Ha wee bukwasị ọka ha n’elu ịnyịnya ibu ha wee si n’ebe ahụ lawa. 27  Mgbe otu n’ime ha meghere akpa ya n’ebe ha ga-arahụ ka o nye ịnyịnya ibu ya nri,+ ọ hụrụ ego ya, lee, ọ dị n’ọnụ akpa ya.+ 28  O wee gwa ụmụnne ya, sị: “E weghachiri ego m, lee, ọ dị n’akpa m!” Obi wee lọọ ha mmiri, nke mere na ha gakwuuru ibe ha na-ama jijiji,+ na-asị: “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?”+ 29  N’ikpeazụ, ha lọghachikwutere Jekọb nna ha n’ala Kenan wee kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha, sị: 30  “Nwoke nwe obodo ahụ gwara anyị okwu n’olu ike,+ n’ihi na o weere anyị dị ka ndị bịara iledo obodo ahụ.+ 31  Ma anyị gwara ya, sị, ‘Anyị na-eme ihe n’eziokwu.+ Anyị abụghị ndị nledo. 32  Anyị dị ụmụnne iri na abụọ,+ bụ́ ndị ikom nna anyị mụrụ.+ Otu onye anọkwaghị,+ nwanne anyị nke ọdụdụ na nna anyị nọ taa n’ala Kenan.’+ 33  Ma nwoke nwe obodo ahụ gwara anyị, sị,+ ‘M ga-eji nke a mara na unu na-eme ihe n’eziokwu:+ Kpọpụtanụ otu nwanne unu ka mụ na ya nọrọ.+ Ma burunụ ihe lawa n’ihi ụnwụ dị n’ụlọ unu.+ 34  Kpọtaranụ m nwanne unu nke ọdụdụ, ka m wee mara na unu abụghị ndị nledo kama na unu na-eme ihe n’eziokwu. M ga-akpọnye unu nwanne unu, unu ga na-azụrụkwa ihe n’ala a.’”+ 35  O wee ruo na mgbe ha na-awụpụta ihe dị n’akpa ha, lee, ùkwù ego onye nke ọ bụla dị n’akpa ya. Ma ha ma nna ha wee hụ ùkwù ego ha, egwu wee tụọ ha. 36  Jekọb nna ha wee tie mkpu gwa ha, sị: “Ọ bụ m ka unu gbawara aka ụmụ!+ Josef anọkwaghị, Simiọn anọkwaghị,+ unu gajekwa ịkpọrọ Benjamin! Ọ bụ m ka ihe ndị a niile dakwasịworo!” 37  Ma Ruben gwara nna ya, sị: “I nwere ike igbu ụmụ m abụọ ma ọ bụrụ na mụ akpọghachighịrị gị ya.+ Nyefee m ya n’aka, ọ bụkwa mụ onwe m ga-akpọghachiri gị ya.”+ 38  Otú ọ dị, ọ sịrị: “Nwa m agaghị eso unu gaa, n’ihi na nwanne ya nwoke anwụwo, ọ fọdụkwara naanị ya.+ Ọ bụrụ na ọ nwụọ n’ihe mberede n’ụzọ, unu ga-eme ka m jiri mwute gbadaruo Shiol+ n’isi awọ́ m.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.