Jenesis 39:1-23

39  Ma a kpọọrọ Josef gbadata n’Ijipt,+ Pọtịfa,+ onye na-eje ozi n’obí Fero, onyeisi ndị nche, bụ́ onye Ijipt, wee zụrụ ya n’aka ndị Ishmel+ bụ́ ndị kpọ ya gbadata n’ebe ahụ.  Ma Jehova nọnyeere Josef, o wee ghọọ onye ihe na-agara nke ọma,+ ghọọkwa onye na-elekọta ụlọ nna ya ukwu, bụ́ onye Ijipt.  Nna ya ukwu wee hụ na Jehova nọnyeere ya, nakwa na Jehova na-eme ka ihe niile ọ na-eme na-aga nke ọma n’aka ya.  Ihe Josef wee na-amasị ya, Josef wee na-ejere ya ozi mgbe niile, o wee mee ya onye na-elekọta ụlọ ya,+ o nyefekwara ya ihe niile o nwere.  O wee ruo na malite n’oge o mere ya onye na-elekọta ụlọ ya na onye na-ahụ maka ihe niile o nwere, Jehova nọ na-agọzi ụlọ onye Ijipt ahụ n’ihi Josef, ngọzi Jehova wee dịrị n’ihe niile o nwere n’ụlọ nakwa n’ubi.+  N’ikpeazụ, o tinyere ihe niile o nwere n’aka Josef;+ ọ maghịkwa ihe dị n’aka ya ma ọlị ma e wezụga ihe oriri ọ na-eri. Josef bịakwara maa mma n’ahụ́, maakwa mma ile anya.  O wee ruo na mgbe ihe ndị a gasịrị, nwunye nna ya ukwu malitere ile Josef anya+ wee na-asị: “Ka mụ na gị dinaa.”+  Ma ọ na-ajụ,+ ọ na-agwakwa nwunye nna ya ukwu, sị: “Lee, nna m ukwu amaghị ihe dị n’aka m n’ụlọ a, o nyefewokwa m ihe niile o nwere.+  Ọ dịghị onye dị ukwuu n’ụlọ a karịa m, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla o gbochiri m inweta ma e wezụga gị, n’ihi na ị bụ nwunye ya.+ Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?”+ 10  O wee ruo na ka ọ na-agwa Josef okwu site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, ọ dịghị mgbe o gere ya ntị ka o dinaa n’akụkụ ya, ka ya na ya nọrọ.+ 11  Ma o ruru otu ụbọchị, dị ka ọ na-eme n’ụbọchị ndị ọzọ, na ọ banyere n’ụlọ ka ọ rụọ ọrụ ya, ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ikom na-eje ozi n’ụlọ ahụ nke nọ n’ụlọ.+ 12  O wee jide ya n’uwe ya,+ na-asị: “Ka mụ na gị dinaa!”+ Ma ọ hapụụrụ ya uwe ya wee gbara ọsọ gbapụ n’èzí.+ 13  O wee ruo na ozugbo ọ hụrụ na ọ hapụụrụ ya uwe ya wee gbapụ n’èzí, 14  ọ malitere itiku ndị ikom nke ụlọ ya wee sị ha: “Lee! Ọ kpọtaara anyị nwoke Hibru ka o jiri anyị mere ihe ọchị. Ọ bịakwutere m ka mụ na ya dinaa, ma m malitere iti mkpu n’olu ike.+ 15  O wee ruo na ozugbo ọ nụrụ mkpu m malitere iti, ọ hapụrụ uwe ya n’akụkụ m gbapụ n’èzí.” 16  E mesịa, ọ chịsara uwe ya n’akụkụ ya ruo mgbe nna ukwu Josef lọtara.+ 17  O wee gwa ya okwu ndị a, sị: “Onye Hibru ahụ na-eje ozi nke ị kpọtaara anyị bịakwutere m iji m mere ihe ọchị. 18  Ma o ruru na ozugbo m malitere iti mkpu, ọ hapụrụ uwe ya n’akụkụ m wee gbapụ n’èzí.”+ 19  Ihe si na ya pụta bụ na ozugbo nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya kwuru, bụ́ nke ọ gwara ya, sị: “Lekwa lekwa ihe onye na-ejere gị ozi mere m,” iwe ya wee dị ọkụ.+ 20  Nna ukwu Josef wee kpọrọ ya tụba n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ebe a na-akpọchi ndị mkpọrọ eze, o wee nọrọ n’ebe ahụ, n’ụlọ mkpọrọ.+ 21  Otú ọ dị, Jehova nọnyeere Josef wee na-egosi ya obiọma* ma mee ka ihe ya na-amasị onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ.+ 22  Onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ wee nyefee ndị mkpọrọ niile nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’aka Josef; ọ bụkwa ya na-ahụ na ha mere ihe niile ha nwere ime n’ebe ahụ.+ 23  Ọ dịghị ihe ọ bụla ma ọlị dị n’aka onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ nke ya onwe ya na-ahụ maka ya, n’ihi na Jehova nọnyeere Josef, Jehova na-emekwa ka ihe ọ na-eme na-aga nke ọma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”