Jenesis 35:1-29
35 E mesịa, Chineke gwara Jekọb, sị: “Bilie, gaa biri na Betel,+ wuokwara ezi Chineke, onye pụtara ìhè n’ihu gị mgbe ị nọ na-agba ọsọ n’ihi Isọ nwanne gị,+ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ.”
2 Jekọb wee gwa ezinụlọ ya, gwakwa ndị niile ya na ha nọ, sị: “Tụfuonụ chi ndị mba ọzọ dị n’etiti unu,+ meekwanụ onwe unu ka unu dị ọcha, gbanweekwanụ ákwà mgbokwasị unu,+
3 ka anyị bilie gbagoo Betel. N’ebe ahụ ka m ga-ewuru ezi Chineke, onye zara m n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ,+ ebe ịchụàjà, n’ihi na ọ nọnyeere m n’ụzọ m jere ije na ya.”+
4 Ha wee nye Jekọb chi ndị mba ọzọ niile ha ji,+ chịnyekwa ya ọla ntị ha kwụ ná ntị, Jekọb wee lie ha n’okpuru nnukwu osisi nke dị nso na Shikem.
5 E mesịa, ha kwaliri, oké ụjọ nke Chineke wee jide obodo ndị gbara ha gburugburu,+ nke mere na ha achụrụghị ụmụ Jekọb gawa.
6 N’ikpeazụ, Jekọb bịarutere Lọz,+ nke dị n’ala Kenan, ya bụ, Betel, ya na ndị niile so ya.
7 O wee wuo ebe ịchụàjà n’ebe ahụ wee malite ịkpọ ebe ahụ El-betel, n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ezi Chineke kpugheere ya onwe ya n’oge ọ nọ na-agba ọsọ n’ihi nwanne ya.+
8 E mesịa, Debora+ bụ́ nwaanyị nyere Ribeka ara nwụrụ, e wee lie ya n’ala ala Betel n’okpuru otu oké osisi. Ya mere, ọ kpọrọ ebe ahụ Alọn-bakọt.
9 Chineke wee pụta ìhè n’ihu Jekọb ọzọ n’oge o si na Padan-eram+ na-alọta wee gọzie ya.+
10 Chineke wee sị ya: “Aha gị bụ Jekọb.+ A gakwaghị akpọ gị Jekọb, kama aha gị ga-abụzi Izrel.” O wee malite ịkpọ ya Izrel.+
11 Chineke wee gwakwa ya, sị: “Abụ m Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba. Mba dị iche iche na ìgwè mba dị iche iche ga-esikwa na gị pụta, ndị eze ga-esikwa n’úkwù gị pụta.+
12 Ma ala ahụ m nyere Ebreham na Aịzik, ọ bụ gị ka m ga-enye ya, ọ bụkwa mkpụrụ+ gị nke ga-anọchi gị ka m ga-enye ala ahụ.”+
13 E mesịa, Chineke si n’ebe Jekọb nọ, n’ebe ahụ ya na ya kwurịtara okwu, gbagoo.+
14 N’ihi ya, Jekọb guzobere otu ogidi, bụ́ ogidi nkume, n’ebe ahụ ya na ya kwurịtara okwu,+ o wee wụsa àjà ihe ọṅụṅụ n’elu ya, wụsakwa mmanụ n’elu ya.+
15 Jekọb wee na-akpọ ebe ahụ, bụ́ ebe ya na Chineke kwurịtara okwu, Betel.+
16 Ha wee si na Betel kwalie. Mgbe ụzọ ka dị anya tupu e ruo Efrat,+ Rechel malitere ịmụ nwa, ọ nọkwa na-esiri ya ike ịmụpụta ya.+
17 Ma o ruru na mgbe o siiri ya ike ịmụpụta nwa ahụ, nwaanyị na-aghọ́ nwa sịrị ya: “Atụla egwu, n’ihi na ị ga-amụkwa nwa nwoke nke a.”+
18 Ihe si na ya pụta bụ na ka ndụ*+ ya pụwara (n’ihi na ọ nwụrụ),+ ọ gụrụ ya Ben-onaị; ma nna ya gụrụ ya Benjamin.+
19 Rechel wee si otú ahụ nwụọ, e wee lie ya n’ụzọ gara Efrat, ya bụ, Betlehem.+
20 Jekọb wee guzobe otu ogidi n’elu ili ya. Ọ bụ nke a bụ ogidi ili Rechel ruo taa.+
21 E mesịa, Izrel kwaliri wee maa ụlọikwuu ya ma a gafetụ ụlọ elu Ida.+
22 O wee ruo mgbe Izrel bi n’ụlọikwuu+ n’ala ahụ na Ruben gara otu mgbe dinaa Bilha iko nna ya, Izrel wee nụ ya.+
Ụmụ ndị ikom Jekọb dị mmadụ iri na abụọ.
23 Ụmụ ndị ikom Lia mụrụ bụ Ruben bụ́ ọkpara+ Jekọb nakwa Simiọn na Livaị na Juda na Ịsaka na Zebulọn.
24 Ụmụ ndị ikom Rechel mụrụ bụ Josef na Benjamin.
25 Ụmụ ndị ikom Bilha, bụ́ nwaanyị na-ejere Rechel ozi, bụ Dan na Naftalaị.
26 Ụmụ ndị ikom Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere Lia ozi, mụrụ bụ Gad na Asha. Ọ bụ ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jekọb, ndị a mụụrụ ya na Padan-eram.
27 N’ikpeazụ, Jekọb lọkwutere Aịzik nna ya na Mamri,+ na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hibrọn, bụ́ ebe Ebreham na Aịzik biri dị ka ndị ọbịa.+
28 Ụbọchị Aịzik dịrị ndụ wee bụrụ otu narị afọ na iri asatọ.+
29 E mesịa, Aịzik kubiri ume wee nwụọ, e wee lie ya dị ka e liri ndị ya, o mere agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ,+ Isọ na Jekọb bụ́ ụmụ ya wee lie ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mkpụrụ obi.”