Jenesis 34:1-31

34  Daịna ada Lia,+ bụ́ onye ọ mụụrụ Jekọb, na-aga ahụ+ ụmụ agbọghọ ala ahụ.+  Shikem nwa Hemọ onye Haịvaịt,+ bụ́ onyeisi n’ala ahụ, wee hụ ya ma kpọrọ ya dinaa ya wee merụọ ya.+  Mkpụrụ obi ya wee malite ịrapara n’ebe Daịna nwa Jekọb nọ, o wee hụ nwa agbọghọ ahụ n’anya ma na-agwa nwa agbọghọ ahụ okwu ga-eru ya n’obi.  N’ikpeazụ, Shikem gwara Hemọ nna ya,+ sị: “Lụtara m nwa agbọghọ a.”+  Jekọb wee nụ na o merụrụ Daịna ada ya. Ụmụ ya ndị ikom chị ìgwè anụ ụlọ ya nọrọ n’ọhịa;+ Jekọb wee gba nkịtị ruo mgbe ha lọtara.+  E mesịa, Hemọ, nna Shikem, gakwuuru Jekọb ka ya na ya kwurịta okwu.+  Ụmụ ndị ikom Jekọb wee si n’ọhịa lọta ozugbo ha nụrụ ya; ndị ikom ahụ wee nwee mwute na mmụọ ha, ha wee wee oké iwe,+ n’ihi na o mere ihe nzuzu na-eweta ihere megide Izrel n’idina ada Jekọb,+ ebe a na-ekwesịghị ime ihe dị otú ahụ eme.+  Hemọ wee gwa ha, sị: “Ma Shikem nwa m, mkpụrụ obi ya rapaara n’ebe ada unu nọ. Biko, kpọnyenụ ya nwa agbọghọ ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya,+  ka anyị na unu gọwa ọgọ.+ Unu ga na-ekenye anyị ụmụ unu ndị inyom, unu onwe unu ga na-alụrụkwa ụmụ anyị ndị inyom.+ 10  Unu ga-ebinyekwara anyị, ala a ga-adịkwara unu. Birinụ zụwa ahịa na ya, nọrọwanụ na ya.”+ 11  Shikem wee gwa nna nwa agbọghọ ahụ na ụmụnne ya ndị ikom, sị: “Ka m nweta ihu ọma unu, ihe ọ bụla unu ga-agwa m ka m ga-enye. 12  Bulienụ ego isi ya elu nke ukwuu nakwa onyinye a ga-amanye m inye,+ adị m njikere inye ihe unu ga-agwa m; naanị kpọnyenụ m nwa agbọghọ ahụ ka ọ bụrụ nwunye m.” 13  Ụmụ Jekọb wee malite iji aghụghọ zaa Shikem na Hemọ nna ya, ha gwara ha okwu otú ahụ n’ihi na o merụrụ Daịna nwanne ha nwaanyị.+ 14  Ha wee gaa n’ihu ịsị ha: “Ọ gaghị ekwe anyị omume ime ihe dị otú ahụ, ịkpọrọ nwanne anyị nwaanyị kpọnye nwoke a na-ebighị úgwù,+ n’ihi na nke ahụ bụụrụ anyị ihe nkọcha. 15  Anyị ga-ekwere ihe unu kwuru naanị ma ọ bụrụ na unu adịrị ka anyị, site n’ibi nwoke ọ bụla n’ime unu úgwù.+ 16  Mgbe ahụ, anyị ga na-ekenye unu ụmụ anyị ndị inyom, anyị onwe anyị ga na-alụrụkwa ụmụ unu ndị inyom, anyị ga-ebinyekwara unu, anyị na unu ewee ghọọ otu ndị.+ 17  Ma ọ bụrụ na unu egeghị anyị ntị ka e bie unu úgwù, anyị ga-akpọrọ ada anyị laa.” 18  Ihe ha kwuru wee dị mma n’anya Hemọ nakwa n’anya Shikem, nwa Hemọ,+ 19  nwa okorobịa ahụ egbughịkwa oge ime ihe ha gwara ya,+ n’ihi na ihe ada Jekọb masịrị ya, ọ bụkwa onye a kasị asọpụrụ+ n’ụlọ nna ya dum.+ 20  Hemọ na Shikem nwa ya wee gaa n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha wee malite ịgwa ndị obodo ha,+ sị: 21  “Ndị a chọrọ ka udo dịrị n’etiti anyị na ha.+ Ya mere, ka ha biri n’ala a zụwa ahịa na ya, ebe ọ bụ na ala a sara nnọọ mbara n’ihu ha.+ Anyị onwe anyị ga na-alụrụ ụmụ ha ndị inyom, anyị ga na-ekenyekwa ha ụmụ anyị ndị inyom.+ 22  Ọ bụ naanị ma anyị mee nke a ka ha ga-ekwe ibinyere anyị ka anyị na ha ghọọ otu ndị, ma e bie nwoke ọ bụla n’ime anyị úgwù dị nnọọ ka e biri ha.+ 23  Ọ̀ bụ na ihe onwunwe ha na akụ̀ ha na anụ ụlọ ha niile agajeghị ịbụ nke anyị?+ Naanị ka anyị kwere ihe ha kwuru ka ha wee binyere anyị.”+ 24  Ndị niile na-esi n’ọnụ ụzọ ámá obodo ya apụ gere Hemọ na Shikem nwa ya ntị, e wee bie ndị ikom niile úgwù, ndị niile na-esi n’ọnụ ụzọ ámá obodo ya apụ. 25  Otú ọ dị, o ruru na n’ụbọchị nke atọ, mgbe ọ nọ na-afụ ha ụfụ, na onye nke ọ bụla n’ụmụ ndị ikom abụọ Jekọb, Simiọn na Livaị,+ ụmụnne Daịna,+ weere mma agha ya wee banye n’obodo ahụ n’ụzọ a na-agaghị enyo ha enyo, wee gbuo nwoke ọ bụla.+ 26  Ha jikwa ihu mma agha+ gbuo Hemọ na Shikem nwa ya. Ha wee si n’ụlọ Shikem kpọrọ Daịna pụọ.+ 27  Ụmụ ndị ikom Jekọb ndị ọzọ wakporo ndị ikom e merụrụ ahụ́ nke ukwuu wee bukọrọ ihe dị n’obodo ahụ, n’ihi na ha merụrụ nwanne ha nwaanyị.+ 28  Ha kpụụrụ ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha na ịnyịnya ibu ha, werekwa ihe dị n’obodo ahụ na ihe dị n’ubi ha.+ 29  Akụ̀ ha niile na ụmụntakịrị ha na ndị nwunye ha ka ha dọọrọ n’agha, ha wee bukọrọ ihe niile dị n’ụlọ ha. 30  Jekọb wee gwa Simiọn na Livaị,+ sị: “Unu ebuteworo m nsogbu site n’ime ka m bụrụ ihe na-esi ísì n’ebe ndị bi n’ala a nọ,+ n’ebe ndị Kenan na ndị Perizaịt nọ; ebe m dị ole na ole, ha ga-ezukọtakwa megide m wee wakpo m, a ga-alakwa m n’iyi, mụ na ụlọ m.” 31  Ha wee sị: “Mmadụ ò kwesịrị imeso nwanne anyị nwaanyị ihe dị ka à ga-asị na ọ bụ akwụna?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji