Jenesis 30:1-43
30 Mgbe Rechel hụrụ na ya amụtaghịrị Jekọb nwa ọ bụla, Rechel malitere ikwoso nwanne ya nwaanyị ekworo, o wee malite ịsị Jekọb:+ “Nye m nwa, ma ọ́ bụghị ya, m ga-aghọ nwaanyị nwụrụ anwụ.”+
2 Jekọb wee weso Rechel iwe dị ọkụ, o wee sị:+ “Àbụ m Chineke, onye jụrụ inye gị mkpụrụ nke afọ?”+
3 O wee sị: “Lekwa ohu m nwaanyị bụ́ Bilha.+ Gị na ya nwee mmekọahụ, ka ọ mụọ nwa n’ikpere m, ka m nweta ụmụ site n’aka ya.”+
4 O wee kpọnye ya Bilha bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi ka ọ bụrụ nwunye ya, ya na Jekọb wee nwee mmekọahụ.+
5 Bilha wee tụrụ ime, ka oge na-agakwa, ọ mụụrụ Jekọb nwa nwoke.+
6 Rechel wee sị: “Chineke ekpepụtawo m,+ o gewokwa ntị n’olu m, nke mere na o nyere m nwa nwoke.” Ọ bụ ya mere o ji gụọ ya Dan.+
7 Bilha, nwaanyị na-ejere Rechel ozi, tụụrụ ime ọzọ, ka oge na-agakwa, ọ mụụrụ Jekọb nwa nke abụọ.
8 Rechel wee sị: “Mụ na nwanne m nwaanyị agbawo mgba tara akpụ. Emeriwokwa m ya!” O wee gụọ ya Naftalaị.+
9 Mgbe Lia hụrụ na ya akwụsịwo ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya.+
10 Ka oge na-aga, Zilpa bụ́ nwaanyị na-ejere Lia ozi mụụrụ Jekọb nwa nwoke.
11 Lia wee sị: “Ị̀ hụkwara ihe ndabara ọma?” O wee gụọ ya Gad.+
12 E mesịa, Zilpa bụ́ nwaanyị na-ejere Lia ozi mụụrụ Jekọb nwa nke abụọ.
13 Lia wee sị: “Lee otú obi si dị m ụtọ! N’ihi na ụmụ nwaanyị ga-akpọ m onye obi ụtọ.”+ O wee gụọ ya Asha.+
14 Ruben+ wee na-akpagharị n’oge a na-ewe ọka wit n’ubi+ wee hụ mkpụrụ mandrek n’ọhịa. O wee chịtara ha Lia nne ya. Rechel wee sị Lia: “Biko, nye m ụfọdụ n’ime mkpụrụ mandrek nwa gị.”
15 O wee sị ya: “Ọ̀ bụ obere ihe na ị narawo m di m,+ gị anọrọkwa n’elu ya ugbu a na-anara m mkpụrụ mandrek nwa m?” Rechel wee sị: “N’ihi nke ahụ, gị na ya ga-edina n’abalị a iji gbanwere mkpụrụ mandrek nwa gị.”
16 Mgbe Jekọb si n’ọhịa na-alọta ná mgbede,+ Lia pụrụ ịga zute ya wee sị: “Ọ bụ mụ na gị ga-enwe mmekọahụ, n’ihi na ejiriwo m mkpụrụ mandrek nwa m gobie gị.” Ya na ya wee dinaa n’abalị ahụ.+
17 Chineke wee nụ olu Lia wee za ya, o wee tụrụ ime, ka oge na-agakwa, ọ mụụrụ Jekọb nwa nke ise.+
18 Lia wee sị: “Chineke enyewo m ụgwọ ọrụ onye e goro ọrụ, n’ihi na akpọnyewo m di m nwaanyị na-ejere m ozi.” O wee gụọ ya Ịsaka.+
19 Lia wee tụrụ ime ọzọ, ka oge na-agakwa, ọ mụụrụ Jekọb nwa nke isii.+
20 Lia wee sị: “Chineke enyewo m onyinye dị mma n’ezie. N’ikpeazụ, di m ga-anabata m,+ n’ihi na amụworo m ya ụmụ nwoke isii.”+ O wee gụọ ya Zebulọn.+
21 E mesịa, ọ mụrụ nwa nwaanyị wee gụọ ya Daịna.+
22 N’ikpeazụ, Chineke chetara Rechel, Chineke wee nụ olu ya wee za ya site n’imeghe akpa nwa ya.+
23 O wee tụrụ ime mụọ nwa nwoke. O wee sị: “Chineke ewepụwo nkọcha m!”+
24 O wee gụọ ya Josef,+ sị: “Jehova enyela m nwa nwoke ọzọ.”
25 O wee ruo na mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb gwara Leban ozugbo, sị: “Hapụ m ka m laa ebe m si bịa, n’obodo m.+
26 Kpọnye m ndị nwunye m na ụmụ m, ndị ọ bụ n’ihi ha ka m jeere gị ozi, ka m laa; n’ihi na gị onwe gị maara ozi m jeere gị.”+
27 Leban wee sị ya: “Ugbu a, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị,—enwetawo m ihe mgbaàmà na Jehova na-agọzi m n’ihi gị.”+
28 O kwukwara, sị: “Gwa m ihe ga-abụ ụgwọ ọrụ gị, m ga-enyekwa gị ya.”+
29 O wee sị ya: “Gị onwe gị maara otú m si jeere gị ozi na otú ìgwè anụ ụlọ gị si mee nke ọma n’aka m;+
30 na ọ bụ obere ihe ka i nwere tupu mụ abịa, o wee na-amụba ruo mgbe ọ dị ọtụtụ nke ukwuu, n’ihi na Jehova gọziri gị kemgbe m zọbatara ụkwụ n’ebe a.+ Oleekwanụ mgbe m ga-emere ụlọ nke m ihe?”+
31 O wee sị: “Gịnị ka m ga-enye gị?” Jekọb wee sị: “Enyela m ihe ọ bụla!+ Ọ bụrụ na ị ga-emere m ihe a, m ga-amaliteghachi ịzụ ìgwè anụ ụlọ gị.+ M ga-aga n’ihu ilekọta ha.+
32 M ga-agagharị n’etiti ìgwè anụ ụlọ gị dum taa. Si n’etiti ha kewapụta atụrụ ọ bụla tụrụ akịka na nke tụrụ àgwà, nakwa ebule ọ bụla na-acha nchara nchara nakwa nne ewu ọ bụla tụrụ àgwà na nke tụrụ akịka. E mesịa, ndị dị otú ahụ ga-abụ ụgwọ ọrụ m.+
33 Ezi omume m ga-azakwara m ajụjụ n’ụbọchị ọ bụla ị ga-abịa n’ọdịnihu inyocha ụgwọ ọrụ m;+ nne ewu ọ bụla na-atụghị akịka na nke na-atụghị àgwà nakwa ebule ọ bụla na-adịghị acha nchara nchara bụ nke e zuru n’ohi ma ọ bụrụ na ọ dị n’aka m.”+
34 Leban wee sị: “Nke ahụ dị mma! Ka ọ dị otú i kwuru.”+
35 O wee kewapụta n’ụbọchị ahụ mkpi ndị nwere akara n’ahụ́ na ndị tụrụ àgwà na nne ewu niile tụrụ akịka na ndị tụrụ àgwà, nakwa ebule ọ bụla tụrụ àgwà ọcha na nke ọ bụla na-acha nchara nchara, ma o nyefere ha n’aka ụmụ ya ndị ikom.
36 E mesịa, o mere ka ebe ga-ewe njem ụbọchị atọ dịrị n’agbata ya na Jekọb, Jekọb wee na-azụ ìgwè anụ ụlọ Leban ndị fọdụrụ.
37 Jekọb wee gbute osisi stọraks+ na osisi almọnd+ na osisi plen+ ndị dị ndụ ma kpechaa ha ka e nwee ebe ndị na-acha ọcha na ha site n’ikpechapụta ebe ndị chara ọcha n’okporo osisi+ ndị ahụ.
38 N’ikpeazụ, o debere okporo osisi ndị ahụ o kpechara ekpecha n’ihu ìgwè anụ ụlọ ahụ, n’ọwa mmiri ha, n’efere anụ ụlọ ndị ahụ ji aṅụ mmiri,+ bụ́ ebe ìgwè anụ ụlọ ahụ na-abịa aṅụ mmiri, ka ha wee gbaa ibe ha n’ihu ha mgbe ha bịara ịṅụ mmiri.
39 Ìgwè anụ ụlọ ahụ wee na-agba ibe ha n’ihu okporo osisi ndị ahụ, ìgwè anụ ụlọ ahụ wee na-amụ ụmụ ndị nwere akara n’ahụ́, ndị tụrụ akịka na ndị tụrụ àgwà.+
40 Jekọb wee wepụta ebule iche ma chee ìgwè anụ ụlọ ahụ ihu n’ebe ndị ahụ nwere akara n’ahụ́ nọ nakwa n’ebe ndị niile na-acha nchara nchara n’etiti ìgwè anụ ụlọ Leban nọ. O wee debe ìgwè anụ nke ya iche, o debeghị ha n’akụkụ ìgwè anụ ụlọ Leban.
41 Ihe na-eme mgbe niile bụ na mgbe ọ bụla ìgwè anụ ndị gbasiri ike+ chọrọ ịgba ibe ha, Jekọb na-edebe okporo osisi ndị ahụ n’ọwa mmiri ahụ,+ n’ebe ìgwè anụ ụlọ ahụ na-ahụ ha, ka ha wee gbaa ibe ha n’akụkụ okporo osisi ndị ahụ.
42 Ma ọ naghị edebe ha n’ebe ìgwè anụ ụlọ ndị na-agbasighị ike nọ. Ndị na-agbasighị ike wee na-aghọ nke Leban, ma ndị gbasiri ike na-aghọ nke Jekọb.+
43 Nwoke ahụ wee na-abawanye ụba, o wee nwee ìgwè anụ ụlọ dị ukwuu na ndị inyom na-eje ozi na ndị ikom na-eje ozi na kamel na ịnyịnya ibu.+