Jenesis 3:1-24
3 Agwọ+ kasị dị akọ+ n’ime anụ ọhịa niile Jehova bụ́ Chineke kere.+ O wee malite ịgwa nwaanyị ahụ,+ sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?”+
2 Nwaanyị ahụ wee sị agwọ ahụ: “Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a.+
3 Ma, a bịa n’iri mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a,+ Chineke sịrị: ‘Unu erila mkpụrụ si na ya, ee e, unu emetụla ya aka ka unu ghara ịnwụ.’”+
4 Agwọ ahụ wee sị nwaanyị ahụ: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.+
5 N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.”+
6 Nwaanyị ahụ wee hụ na mkpụrụ osisi ahụ dị mma oriri nakwa na ọ na-agụsi anya agụụ ike, ee, osisi ahụ mara mma ile anya.+ O wee ghọrọ mkpụrụ ya rie. E mesịa, o nyetụrụ di ya mgbe ya na ya nọ, o wee rie.+
7 Anya ha abụọ wee meghee, ha wee malite ịmata na ha gba ọtọ.+ Ya mere, ha dụkọtara akwụkwọ osisi fig wee meere onwe ha ihe ha ga-eji kpuchie úkwù.+
8 E mesịa, ha nụrụ olu Jehova bụ́ Chineke ka ọ na-agagharị n’ubi ahụ n’ihe dị ka n’oge ifufe na-efe n’ụbọchị,+ nwoke ahụ na nwunye ya wee si n’ihu Jehova bụ́ Chineke gaa zoo n’agbata osisi ndị dị n’ubi ahụ.+
9 Jehova bụ́ Chineke wee na-akpọ nwoke ahụ, na-asị ya: “Olee ebe ị nọ?”+
10 N’ikpeazụ, ọ sịrị: “Anụrụ m olu gị n’ubi a, ma atụrụ m egwu n’ihi na m gba ọtọ, m wee gaa zoo.”+
11 O wee sị: “Ònye gwara gị na ị gba ọtọ?+ Ì riwo mkpụrụ si n’osisi ahụ m nyere gị iwu ka ị ghara iri?”+
12 Nwoke ahụ wee sị: “Nwaanyị ahụ i nyere m ka mụ na ya biri, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, m wee rie.”+
13 Jehova bụ́ Chineke wee sị nwaanyị ahụ: “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwaanyị ahụ wee zaa, sị: “Ọ bụ agwọ duhiere m, m wee rie ya.”+
14 Jehova bụ́ Chineke wee sị agwọ ahụ:+ “Ebe ọ bụ na i mewo ihe a, ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ n’ime anụ ụlọ niile nakwa n’ime anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-agagharị, ọ bụkwa ájá ka ị ga na-eri ụbọchị niile nke ndụ+ gị.
15 M+ ga-emekwa ka iro+ dịrị n’etiti gị+ na nwaanyị ahụ+ nakwa n’etiti mkpụrụ gị+ na mkpụrụ ya.+ Ọ+ ga-egwepịa gị+ isi,+ ị+ ga-emerụkwa ya ahụ́+ n’ikiri ụkwụ.”+
16 Ọ sịrị nwaanyị ahụ: “M ga-eme ka ihe mgbu nke afọ ime gị+ mụbaa nke ukwuu; ime ga-eme gị mgbe ị ga-amụ ụmụ,+ ị ga na-enwe agụụ maka di gị, ọ ga-achịkwa gị.”+
17 Ọ sịkwara Adam: “Ebe ọ bụ na i gere ntị n’olu nwunye gị wee rie mkpụrụ si n’osisi ahụ nke m nyere gị iwu a banyere ya,+ sị, ‘Erila mkpụrụ si na ya,’ ihe a bụrụ ọnụ ka ala bụ n’ihi gị.+ N’ụbọchị niile nke ndụ gị,+ ị ga-enwe ihe mgbu tupu gị erie ihe ọ na-emepụta.
18 Ogwu na uke ka ọ ga-epuru gị,+ ị ga-erikwa ihe a kụrụ n’ala.
19 Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị.+ N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”+
20 E mesịa, Adam gụrụ nwunye ya Iv,+ n’ihi na ọ ga-aghọ nne nke onye ọ bụla dị ndụ.+
21 Jehova bụ́ Chineke wee meere Adam na nwunye ya uwe akpụkpọ anụ gbadara agbada ka ha yiri.+
22 Jehova bụ́ Chineke wee sị: “Lee, mmadụ ahụ adịwo ka otu n’ime anyị n’ịma ihe ọma na ihe ọjọọ,+ ugbu a, ka o wee ghara isetịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ n’osisi nke ndụ+ rie wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,—”
23 Jehova bụ́ Chineke wee chụpụ ya n’ogige Iden+ ahụ ka ọ gaa na-akọ ihe n’ala nke e si na ya wepụta ya.+
24 Ya mere, ọ chụpụrụ mmadụ ahụ ma mee ka ndị cherọb+ nọrọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige Iden,+ debekwa mma agha nke ihu ya na-egbukepụ ọkụ, nke nọ na-echigharị onwe ya iji na-eche ụzọ e si abanye n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị nche.