Jenesis 29:1-35

29  E mesịa, Jekọb malitere njem wee gaa n’ala ndị Ọwụwa Anyanwụ.+  O wee lee anya, ma, lee, e nwere otu olulu mmiri dị n’ọhịa, ìgwè atụrụ atọ makpukwa n’ebe ahụ n’akụkụ ya, n’ihi na ọ bụ n’olulu mmiri ahụ ka ha na-esi enweta mmiri ha na-enye ìgwè anụ ha;+ e nwekwara nnukwu nkume dị n’ọnụ olulu mmiri ahụ.+  Mgbe a chịkọtachara ìgwè anụ niile n’ebe ahụ, ha na-akwapụ nkume ahụ n’ọnụ olulu mmiri ahụ, ha ewee nye ìgwè anụ ụlọ ha mmiri, ha mesịa, ha na-akwaghachi nkume ahụ n’ọnụ olulu mmiri ahụ n’ebe ọ na-adị.  Jekọb wee sị ha: “Ụmụnne m, ebee ka unu si?” ha wee sị: “Anyị si Heran.”+  O wee sị ha: “Ùnu ma Leban+ nwa nwa Nehọ?”+ ha wee sị: “Anyị ma ya.”  O wee sị ha: “Ahụ́ ọ̀ dịkwa ya mma?”+ Ha wee sị: “Ahụ́ dị ya mma. Lee Rechel+ nwa ya nwaanyị ka o du atụrụ na-abịa!”+  O wee gaa n’ihu ịsị: “Ma ụbọchị agamibeghị. Oge e ji achịkọta ìgwè anụ erubeghị. Nyenụ atụrụ mmiri, mgbe ahụ, unu agaa nye ha nri.”+  Ha wee sị: “A dịghị ekwe ka anyị mee otú ahụ ruo mgbe a chịkọtachara ìgwè anụ niile, e wee kwapụ nkume n’ọnụ olulu mmiri a. Mgbe ahụ, anyị na-enye atụrụ mmiri.”  Ka ha na ya nọ na-ekwurịta okwu, Rechel+ duuru atụrụ nna ya bịa, n’ihi na ọ bụ nwaanyị na-azụ atụrụ.+ 10  O wee ruo na mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne nne ya nakwa atụrụ Leban nwanne nne ya, Jekọb bịaruru nso ozugbo wee kwapụ nkume n’ọnụ olulu mmiri ahụ wee nye atụrụ Leban nwanne nne ya mmiri.+ 11  Jekọb wee susuo+ Rechel ọnụ ma bewe ákwá n’olu dara ụda.+ 12  Jekọb wee malite ịkọrọ Rechel na ya bụ nwanne+ nna ya nakwa na ya bụ nwa Ribeka. O wee gbara ọsọ gaa kọọrọ nna ya.+ 13  O wee ruo na ozugbo Leban nụrụ akụkọ banyere Jekọb nwa nwanne ya nwaanyị, ọ gbaara ọsọ gaa izute ya.+ O wee makụọ ya, susuo ya ọnụ, kpọrọkwa ya banye n’ụlọ ya.+ O wee malite ịkọrọ Leban ihe ndị a niile. 14  E mesịa, Leban sịrị ya: “N’ezie, mụ na gị bụ otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.”+ Ya na ya wee bie otu ọnwa zuru ezu. 15  E mesịa, Leban sịrị Jekọb: “Ị́ bụghị nwanne m,+ ọ̀ bụ n’efu ka ị ga-ejere m ozi?+ Gwa m, Gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ gị?”+ 16  Dị ka o si dị, Leban+ nwere ụmụ nwaanyị abụọ. Aha nke okenye bụ Lia, aha nke nta bụ Rechel. 17  Ma anya Lia amaghị mma, otú ọ dị, Rechel+ mara mma n’ahụ́, maakwa mma ihu.+ 18  Jekọb hụrụ Rechel n’anya. O wee sị: “Achọrọ m ijere gị ozi afọ asaa maka Rechel nwa gị nwaanyị nke nta.”+ 19  Leban wee sị: “Ọ dị mma ka m kpọnye gị ya karịa ịkpọnye ya nwoke ọzọ.+ Biri n’ụlọ m.” 20  Jekọb wee jee ozi afọ asaa maka Rechel,+ ma n’anya ya, ọ dị ka ụbọchị ole na ole n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ọ nọ. 21  Jekọb wee sị Leban: “Kpọnye m nwunye m, n’ihi na ụbọchị m ezuwo, ka mụ na ya nwee mmekọahụ.”+ 22  Leban wee kpọkọta ndị ikom niile nke obodo ahụ wee mee oriri.+ 23  Ma mgbe o ruru n’anyasị ọ kpọọrọ ada ya bụ́ Lia kpọtara ya ka ya na ya nwee mmekọahụ. 24  Leban kpọnyekwara ya Zilpa+ bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi, ọ kpọọrọ ya kpọnye ada ya bụ́ Lia ka ọ bụrụ nwaanyị na-ejere ya ozi. 25  O wee ruo n’ụtụtụ, lee, ọ bụ Lia! N’ihi ya, ọ sịrị Leban: “Gịnị bụ ihe a i mere m? Ọ́ bụghị maka Rechel ka m jeere gị ozi? Gịnịzi mere i ji ghọọ m aghụghọ?”+ 26  Leban wee sị: “Ọ bụghị omenala obodo anyị ime otú a, ibu ụzọ kee nwa nke nta di tupu nke ada. 27  Debezuoro+ nwaanyị a izu ya. E mesịa, a ga-akpọnye gị nwaanyị nke ọzọ a maka ozi ị ga-ejere m ruo afọ asaa ọzọ.”+ 28  Jekọb wee mee otú ahụ wee debezuo izu nwaanyị a, e mesịa, ọ kpọnyere ya Rechel nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya. 29  Leban kpọkwaara Bilha+ bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi kpọnye Rechel nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwaanyị na-ejere ya ozi. 30  Ya na Rechel wee nweekwa mmekọahụ, o wee gosi Rechel ịhụnanya karịa Lia, o wee jeere Leban ozi afọ asaa ọzọ.+ 31  Mgbe Jehova hụrụ na a kpọrọ Lia asị, o meghere akpa nwa ya,+ ma Rechel bụ nwaanyị aga.+ 32  Lia wee tụrụ ime mụọ nwa nwoke wee gụọ ya Ruben,+ n’ihi na ọ sịrị: “Ọ bụ maka na Jehova ahụwo ọnọdụ ọjọọ m,+ n’ihi na ugbu a, di m ga-amalite ịhụ m n’anya.” 33  O wee tụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke wee sị: “Ọ bụ maka na Jehova aṅawo ntị,+ n’ihi na a kpọrọ m asị, o wee nyekwa m nwa nke a.” Ya mere, ọ gụrụ ya Simiọn.+ 34  O wee tụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke wee sị: “Ugbu a, di m ga-arapara n’ahụ́ m n’ihi na amụworo m ya ụmụ nwoke atọ.” N’ihi ya, a gụrụ ya Livaị.+ 35  O wee tụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke wee sị: “Ugbu a, m ga-eto Jehova.” O wee gụọ ya Juda.+ E mesịa, ọ kwụsịrị ịmụ nwa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji