Jenesis 28:1-22

28  Ya mere, Aịzik kpọrọ Jekọb wee gọzie ya ma nye ya iwu wee sị ya: “Esila n’etiti ndị inyom Kenan lụta nwaanyị.+  Bilie gaa Padan-eram n’ụlọ Betuel nna nne gị ma lụrụ nwaanyị n’ebe ahụ site ná ndị inyom Leban nwanne nne gị.+  Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-agọzi gị, ọ ga-eme ka ị mụọ ọmụmụ, meekwa ka ị mụbaa, ị ga-aghọkwa ìgwè ndị dị iche iche.+  Ọ ga-enyekwa gị onwe gị na mkpụrụ gị+ ngọzi Ebreham,+ ka i wee nweta ala dị iche iche i biri dị ka ọbịa,+ bụ́ ndị Chineke nyeworo Ebreham.”+  Aịzik wee zipụ Jekọb, o wee gawa Padan-eram, ịgakwuru Leban nwa Betuel onye Siria,+ nwanne Ribeka,+ bụ́ nne Jekọb na Isọ.+  Mgbe Isọ hụrụ na Aịzik agọziwo Jekọb ma ziga ya Padan-eram ka ọ gaa lụrụ nwaanyị n’ebe ahụ, nakwa na mgbe ọ gọziri ya o nyere ya iwu, sị: “Esila n’etiti ndị inyom Kenan lụta nwaanyị”;+  hụkwa na Jekọb rubeere nna ya na nne ya isi wee gawa Padan-eram;+  Isọ wee hụ na ndị inyom Kenan adịghị mma n’anya Aịzik nna ya.+  N’ihi ya, Isọ gakwuuru Ishmel wee lụrụ Mehalat ada Ishmel nwa Ebreham, bụ́ nwanne nwaanyị Nebeyọt, ma e wezụga nwunye ya ndị ọzọ.+ 10  Jekọb wee si na Bia-shiba pụọ, gawa Heran.+ 11  Ka oge na-aga, ọ bịarutere otu ebe wee chọọ ịrahụ n’ebe ahụ n’ihi na anyanwụ adaala. O wee buru otu n’ime nkume ndị dị n’ebe ahụ ma were ya mere ihe nhiwe isi, o wee dinara n’ebe ahụ.+ 12  O wee malite ịrọ nrọ,+ ma, lee! e nwere ubube e guzobere n’ala ma elu ya ruru eluigwe; leekwa! ndị mmụọ ozi Chineke nọ na-arịgo ma na-arịdata na ya.+ 13  Ma, lee! Jehova guzo n’elu ya, o wee sị:+ “Abụ m Jehova bụ́ Chineke Ebreham nna gị na Chineke Aịzik.+ Ala a nke i dina n’elu ya, ọ bụ gị na mkpụrụ gị ka m ga-enye ya.+ 14  Mkpụrụ gị ga-adịkwa ka ájá dị n’ala,+ ị ga-agbasakwa ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruokwa n’ebe ugwu ma ruo n’ebe ndịda,+ ọ bụkwa site na gị nakwa site ná mkpụrụ gị ka ezinụlọ niile nke ala ga-agọzi onwe ha.+ 15  Lee, m nọnyeere gị, m ga-echebekwa gị n’ụzọ niile ị na-aga, m ga-akpọghachikwa gị n’ala a,+ n’ihi na agaghị m ahapụ gị ruo mgbe m meworo ihe m gwara gị.”+ 16  Jekọb wee teta n’ụra wee sị: “N’eziokwu, Jehova nọ n’ebe a ma mụ onwe m amaghị.” 17  Egwu wee tụọ ya, o wee kwuokwa, sị:+ “Lee otú ebe a si akpali egwu n’ahụ́!+ O nweghị ihe ọzọ ebe a bụ ma ọ bụghị ụlọ Chineke,+ ebe a bụkwa ọnụ ụzọ ámá eluigwe.” 18  Jekọb wee bilie n’isi ụtụtụ wee buru nkume ahụ o ji mere ihe nhiwe isi wee gwunye ya dị ka ogidi wee wụọ mmanụ n’elu ya.+ 19  Ọ kpọkwara ebe ahụ Betel;+ ma aha obodo ahụ bụbu Lọz.+ 20  Jekọb wee kwe nkwa,+ sị: “Ọ bụrụ na Chineke anọnyere m ma chebe m n’ihe a m na-eje wee nye m nri m ga-eri nakwa uwe m ga-eyi,+ 21  m wee lọghachi n’ụlọ nna m n’udo, ọ ga-apụta na Jehova egosiwo na ya bụ Chineke m.+ 22  Nkume a nke m gwunyere dị ka ogidi ga-aghọ ụlọ Chineke,+ aghaghịkwa m inye gị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla ị ga-enye m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji