Jenesis 27:1-46

27  O wee ruo mgbe Aịzik mere agadi, anya ya anaghịkwa ahụ ụzọ ma ọlị,+ na ọ kpọrọ Isọ bụ́ nwa ya nke okenye wee sị ya:+ “Nwa m!” o wee sị ya: “Lee m!”  O wee gaa n’ihu ịsị ya: “Lee, emewo m agadi.+ Amaghị m ụbọchị m ga-anwụ.+  Ugbu a, biko were ihe i ji achụ nta, akpa akụ́ gị na ụta gị, gaa n’ọhịa gbatara m anụ.+  Siere m nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị m, butekwara m ya ka m rie, ka mkpụrụ obi m wee gọzie gị tupu mụ anwụọ.”+  Otú ọ dị, Ribeka nọ na-ege ntị ka Aịzik nọ na-agwa Isọ nwa ya okwu. Isọ wee pụọ banye n’ọhịa ka ọ gaa gbute anụ ma bulata ya.+  Ribeka wee sị Jekọb nwa ya:+ “Lee, m ka nụchara ka nna gị na-agwa Isọ nwanne gị, sị,  ‘Gbutere m anụ, siere m nri dị ụtọ ka m rie, ka m wee gọzie gị n’ihu Jehova tupu mụ anwụọ.’+  Ugbu a, nwa m, gee ntị n’olu m n’ihe m na-enye gị n’iwu.+  Biko, gaa n’ebe ìgwè anụ ụlọ nọ, kpụtara m ụmụ ewu abụọ, ndị dị mma, ka m were ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị ya. 10  Ị ga-ebugakwara ya nna gị, ọ ga-erikwa ya, ka o wee gọzie gị tupu ya anwụọ.” 11  Jekọb wee sị Ribeka nne ya: “Ma Isọ nwanne m bụ nwoke gbara ajị ma ahụ́ m na-akwọ mụrụmụrụ.+ 12  Ọ bụrụkwanụ na nna m emetụ m aka?+ Mgbe ahụ m ga-adị ka onye na-akwa emo n’anya ya, m ga-ewetakwara onwe m nkọcha, ọ bụghị ngọzi.” 13  Nne ya wee sị ya: “Nwa m, ka nkọcha a ga-akọcha gị dịrị n’isi m.+ Naanị gee ntị n’olu m gawa, kpụtara m ha.”+ 14  O wee gaa kpụrụ ha kpụtara nne ya, nne ya wee sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya. 15  E mesịa, Ribeka chịịrị uwe Isọ nwa ya nke okenye,+ bụ́ ndị kasị mma o debere n’ụlọ,+ yiwe Jekọb nwa ya nke nta.+ 16  O wee were akpụkpọ ụmụ ewu ahụ kee ya n’aka nakwa n’ebe ajị na-adịghị n’olu ya.+ 17  O wee bunye Jekọb nwa ya nri ahụ dị ụtọ na achịcha ahụ o mere.+ 18  O wee bakwuru nna ya wee sị: “Nna m!” o wee sị: “Lee m! Nwa m, ị̀ bụ onye?” 19  Jekọb wee gaa n’ihu ịsị nna ya: “Abụ m ọkpara gị Isọ.+ Emewo m nnọọ dị ka ị gwara m. Biko, bilie. Nọrọ ọdụ rie anụ m gbutere, ka mkpụrụ obi gị wee gọzie m.”+ 20  Aịzik wee sị nwa ya: “Nwa m, olee otú i si hụ ya ọsọ ọsọ otú a?” O wee sị: “N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị mere ka o zute m.” 21  Aịzik wee sị Jekọb: “Nwa m, biko, bịa nso ka m metụ gị aka ka m mara ma ị̀ bụ nwa m Isọ n’ezie ma ọ̀ bụ na ị bụghị.”+ 22  Jekọb wee bịaruo Aịzik nna ya nso, o wee metụ ya aka, o wee sị: “Olu a bụ olu Jekọb, ma aka a bụ aka Isọ.”+ 23  Ọ mataghịkwa ya, n’ihi na aka ya dị ajị ajị dị ka aka Isọ nwanne ya. N’ihi ya, ọ gọziri ya.+ 24  E mesịa, ọ sịrị: “Ị̀ bụ nwa m Isọ n’ezie?” o wee sị: “Abụ m.”+ 25  O wee sị: “Butere m ya nso ka m rie anụ nwa m gbutere, ka mkpụrụ obi m wee gọzie gị.”+ O wee bute ya n’ebe ọ nọ, o wee malite iri, o butekwaara ya mmanya, o wee malite ịṅụ. 26  Aịzik nna ya wee sị ya: “Nwa m, biko, bịa nso susuo m ọnụ.”+ 27  O wee bịa nso susuo ya ọnụ, o wee nụ ísìsì uwe ya.+ O wee gọzie ya wee sị: “Lee, ísìsì nwa m dị ka ísìsì nke ọhịa Jehova gọziri agọzi. 28  Ka ezi Chineke nye gị igirigi nke eluigwe+ nakwa ala na-eme nri n’ụwa+ nakwa ọka* na mmanya ọhụrụ n’ụba.+ 29  Ka ndị dị iche iche jeere gị ozi, ka mba dị iche iche kpọọkwara gị isiala.+ Bụrụ onyeisi ụmụnne gị, ka ụmụnne gị kpọọkwara gị isiala.+ Ka onye ọ bụla n’ime ndị na-abụ gị ọnụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ, ka onye ọ bụla n’ime ndị na-agọzi gị bụrụ onye a gọziri agọzi.”+ 30  O wee ruo na ngwa ngwa Aịzik gọzichara Jekọb, ee, n’ezie o ruru mgbe Jekọb ka si nnọọ n’ihu Aịzik nna ya pụta, na Isọ nwanne ya si ịchụ nta lọta.+ 31  Ya onwe ya kwa wee malite isi nri dị ụtọ. O wee butere ya nna ya wee gwa nna ya, sị: “Ka nna m bilie rie anụ nwa ya gbutere, ka mkpụrụ obi gị wee gọzie m.”+ 32  Aịzik nna ya wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ onye?” o wee zaa, sị: “Abụ m nwa gị, ọkpara gị, Isọ.”+ 33  Aịzik wee malite ịma jijiji nke ukwuu gabiga ókè, o wee sị: “Ònyekwanụ gbutere anụ wetara m, m wee richaa ihe niile tupu gị abata, m wee gọzie ya? Onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụkwa!”+ 34  Mgbe Isọ nụrụ ihe nna ya kwuru, ọ malitere ịkwa ákwá n’oké olu nakwa n’ụzọ dị ilu wee sị nna ya:+ “Nna m, gọzie m, ọbụna mụ onwe m!”+ 35  Ma ọ gara n’ihu ịsị: “Nwanne gị ji aghụghọ bịa nweta ngọzi dịịrị gị.”+ 36  O wee sị: “Ọ́ bụghị ya mere e ji gụọ ya Jekọb, n’ihi na ọ narawo m ihe ugboro abụọ a?+ Ọ naraworị ọnọdụ m dị ka ọkpara,+ lee, ugbu a ọ narawo ngọzi m!”+ Ọ sịkwara: “Ọ̀ bụ na o nweghị ngọzi i debeere m?” 37  Ma Aịzik zara Isọ, sị: “Lee, emewo m ya onyeisi gị,+ enyewo m ya ụmụnne ya niile ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi,+ enyewokwa m ya ọka na mmanya ọhụrụ iji kwado ya,+ olee ihe dịnụ m ga-emere gị, nwa m?” 38  Isọ wee sị nna ya: “Nna m, ọ̀ bụ naanị otu ngọzi ka i nwere? Nna m, gọzie m, ọbụna mụ onwe m!”+ Isọ wee bewe ákwá n’olu dara ụda.+ 39  Aịzik nna ya wee zaa ya, sị: “Lee, ebe obibi gị agaghị adị n’ebe ala na-eme nri n’ụwa, ọ gaghịkwa adị n’ebe igirigi nke eluigwe na-ada.+ 40  Ọ bụkwa site ná mma agha gị ka ị ga-adị ndụ,+ ị ga-ejekwara nwanne gị nwoke ozi.+ Ma ọ ga-erukwa na, mgbe ị ga-alụ ụ̀lụ̀, ị ga-agbajipụ yok ya n’olu gị.”+ 41  Otú ọ dị, Isọ buuru Jekọb iwe n’obi n’ihi ngọzi ahụ nna ya gọziri ya,+ Isọ wee na-asị n’obi ya:+ “Oge a ga-eruru nna m uju na-eru nso.+ Ya gasịa, m ga-egbu Jekọb nwanne m.”+ 42  Mgbe a kọọrọ Ribeka ihe Isọ nwa ya nke okenye kwuru, ozugbo ahụ o ziri ozi wee kpọọ Jekọb nwa ya nke nta, o wee sị ya: “Lee! Isọ nwanne gị ji gị na-akasi onwe ya obi—igbu gị.+ 43  Ugbu a, nwa m, gee ntị n’olu m, bilie,+ gbakwuru Leban nwanne m na Heran.+ 44  Binyere ya ụbọchị ole na ole ruo mgbe ọnụma nwanne gị dajụrụ,+ 45  ruo mgbe iwe nwanne gị na-eweso gị dajụrụ, ya echefuokwa ihe i mere ya.+ M ga-ezikwa ozi wee si n’ebe ahụ kpọlata gị. N’ihi gịnị ka m ga-eji gbara aka unu abụọ n’otu ụbọchị?” 46  E mesịa, Ribeka nọ na-agwa Aịzik, sị: “Ndụ a m dị agbụla m n’ihi ndị inyom Het.+ Ọ bụrụ na Jekọb anwaa anwaa si n’etiti ndị inyom Het ndị a, bụ́ ndị inyom nke ala a, lụta nwaanyị, olee uru ndụ m baara m?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.