Jenesis 26:1-35

26  Ụnwụ wee daa n’ala ahụ, ọ bụghị ụnwụ mbụ ahụ dara n’ụbọchị Ebreham,+ Aịzik wee gakwuru Abimelek, bụ́ eze ndị Filistia, na Gira.+  Jehova wee pụta ìhè n’ihu ya wee sị:+ “Agbadala Ijipt. Biri n’ụlọikwuu n’ala m ga-egosi gị.+  Biri dị ka ọbịa n’ala a,+ m ga-anọnyere gị, m ga-agọzikwa gị, n’ihi na ọ bụ gị na mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a niile,+ m ga-emezukwa iyi m ṅụụrụ Ebreham nna gị,+  ‘M ga-eme ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe, m ga-enyekwa mkpụrụ gị ala a niile;+ ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha,’+  n’ihi na Ebreham gere ntị n’olu m wee na-erubere m isi, na-edebe ihe m nyere n’iwu, ụkpụrụ m, na iwu m.”+  Aịzik wee biri na Gira.+  Ndị ikom obodo ahụ wee na-ajụ ya banyere nwunye ya, ọ na-asịkwa ha: “Ọ bụ nwanne m nwaanyị.”+ N’ihi na egwu na-atụ ya ịsị, “Ọ bụ nwunye m,” ka “ndị ikom obodo a ghara igbu m n’ihi Ribeka,” dị ka o si kwuo, n’ihi na ọ mara mma.+  O wee ruo na ka ọ nọwara ogologo oge n’ebe ahụ, Abimelek, bụ́ eze ndị Filistia, si na windo na-elepụ anya wee hụ, ma, lee, Aịzik na Ribeka nwunye ya nọ na-egwuri egwu.+  Ozugbo ahụ, Abimelek kpọrọ Aịzik wee sị: “O nweghị onye ọzọ onye a bụ ma ọ bụghị nwunye gị! Gịnịzi mere i ji sị, ‘Ọ bụ nwanne m nwaanyị’?” Aịzik wee sị ya: “Ekwuru m ya ka m ghara ịnwụ n’ihi ya.”+ 10  Ma Abimelek gara n’ihu ịsị: “Gịnị bụ ihe a i mere anyị?+ Ọ fọrọ nke nta ka otu n’ime ndị m dinaa nwunye gị, ị gaara ewetara anyị ikpe ọmụma!”+ 11  Abimelek wee nye ndị ya niile iwu, sị: “Onye ọ bụla metụrụ nwoke a na nwunye ya aka, a ghaghị igbu ya!” 12  E mesịa, Aịzik malitere ịgha mkpụrụ n’ala ahụ,+ n’afọ ahụ kwa, o nwetara ihe ruru otu narị okpukpu nke mkpụrụ ọ ghara,+ n’ihi na Jehova nọ na-agọzi ya.+ 13  Nwoke ahụ wee ghọọ nnukwu mmadụ wee na-enwewanye ọganihu, na-aghọwanyekwa nnukwu mmadụ ruo mgbe ọ bara ụba nke ukwuu.+ 14  O wee nwee ìgwè atụrụ na ìgwè ehi na ìgwè ndị na-ejere ya ozi,+ nke mere na ndị Filistia malitere inwere ya anyaụfụ.+ 15  Ma ndị Filistia sụchiri olulu mmiri niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru n’ụbọchị Ebreham nna ya,+ ha na-ekporo ájá kpochie ha.+ 16  N’ikpeazụ, Abimelek sịrị Aịzik: “Kwapụ n’ógbè anyị, n’ihi na ị kawo anyị nnọọ ike.”+ 17  Aịzik wee kwapụ n’ebe ahụ wee maa ụlọikwuu na ndagwurugwu Gira+ ma biri n’ebe ahụ. 18  Aịzik wee gwughachi olulu mmiri ha gwuru n’ụbọchị Ebreham nna ya bụ́ ndị ahụ ndị Filistia kpochiri mgbe Ebreham nwụsịrị;+ o wee maliteghachi ịkpọ ha aha nna ya kpọrọ ha.+ 19  Ndị na-ejere Aịzik ozi wee gwuo olulu na ndagwurugwu ahụ, ha wee hụ olulu mmiri nke mmiri ya dị mma n’ebe ahụ. 20  Ndị na-azụ atụrụ na Gira wee sesa ndị na-azụrụ Aịzik atụrụ okwu,+ sị: “Ọ bụ anyị nwe mmiri a!” O wee kpọọ olulu mmiri ahụ Isek, n’ihi na ha sesara ya okwu. 21  Ha wee gwuo olulu mmiri ọzọ, ha seekwa okwu maka ya. O wee kpọọ ya Sitna. 22  E mesịa, ọ kwapụrụ n’ebe ahụ wee gwuo olulu mmiri ọzọ,+ ma ha esereghị ya okwu. O wee kpọọ ya Rehobọt ma sị: “Ọ bụ n’ihi na Jehova enyewo anyị ebe sara mbara,+ meekwa ka anyị mụọ ọmụmụ n’ụwa.”+ 23  O wee si n’ebe ahụ gbagoo Bia-shiba.+ 24  Jehova wee pụta ìhè n’ihu ya n’abalị ahụ wee sị: “Abụ m Chineke Ebreham nna gị.+ Atụla egwu,+ n’ihi na m nọnyeere gị, m ga-agọzikwa gị, meekwa ka mkpụrụ gị mụbaa n’ihi Ebreham ohu m.”+ 25  O wee wuo ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma kpọkuo aha Jehova,+ maakwa ụlọikwuu ya n’ebe ahụ,+ ndị na-ejere Aịzik ozi wee gwuo olulu mmiri n’ebe ahụ. 26  E mesịa, Abimelek si na Gira bịakwute ya, ya na Ahọzat bụ́ ezigbo enyi ya nakwa Faịkọl onyeisi ndị agha ya.+ 27  Aịzik wee sị ha: “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị wee chụpụ m n’ógbè unu?”+ 28  Ha wee sị: “N’ezie, anyị ahụwo na Jehova nọnyeere gị.+ Ọ bụ ya mere anyị ji sị, ‘Biko, ka anyị ṅụọ iyi,+ anyị na gị, ka anyị na gị gbaakwa ndụ,+ 29  na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dị nnọọ ka anyị na-emetụghị gị aka, dịkwa nnọọ ka anyị meere gị naanị ihe ọma n’ihi na anyị hapụrụ gị ka ị laa n’udo.+ Ị bụ onye Jehova gọziri agọzi.’”+ 30  O wee meere ha oriri, ha wee rie, ṅụọkwa.+ 31  Ha biliri n’isi ụtụtụ echi ya, ha wee ṅụọrọ ibe ha iyi.+ E mesịa, Aịzik hapụrụ ha ka ha lawa, ha wee si n’ebe ọ nọ laa n’udo.+ 32  O wee ruo n’ụbọchị ahụ na ndị na-ejere Aịzik ozi bịara kọọrọ ya banyere olulu mmiri ahụ ha gwuru,+ ha wee sị ya: “Anyị egwutewo mmiri!” 33  O wee kpọọ ya Shaịba. Ọ bụ ya mere aha obodo ahụ ji bụrụ Bia-shiba,+ ruo taa. 34  Isọ gbara afọ iri anọ. O wee lụọ Judit ada Beiraị onye Het nakwa Basemat ada Ilọn onye Het.+ 35  Ha wee na-akpatara Aịzik na Ribeka obi ilu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji