Jenesis 24:1-67
24 Ugbu a Ebreham emeela agadi, ọ gamiwokwa n’afọ ndụ; Jehova gọzikwara Ebreham n’ihe niile.+
2 Ebreham wee gwa onye na-ejere ya ozi, bụ́ onye kasị mee okenye n’ezinụlọ ya, onye na-elekọta ihe niile o nwere, sị:+ “Biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m,+
3 n’ihi na m ga-eme ka i jiri Jehova,+ bụ́ Chineke nke eluigwe na Chineke nke ụwa, ṅụọrọ m iyi na ị gaghị esi n’etiti ndị inyom Kenan, bụ́ ndị m bi n’etiti ha, lụtara nwa m nwoke nwaanyị,+
4 kama ị ga-aga n’obodo m, gakwuru ndị ikwu m,+ ị ga-alụtakwara nwa m nwoke, bụ́ Aịzik, nwaanyị.”
5 Otú ọ dị, onye ahụ na-ejere ya ozi jụrụ ya: “Ọ́ bụrụkwanụ na nwaanyị ahụ achọghị iso m bịa n’ala a? M̀ ga-akpọghachi nwa gị nwoke n’ala ahụ i si pụta?”+
6 Ebreham wee sị ya: “Lezie anya ka ị ghara ịkpọghachi nwa m nwoke n’ebe ahụ.+
7 Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe, onye si n’ụlọ nna m, sikwa n’ala ndị ikwu m kpọrọ m,+ onye gwakwara m okwu ma ṅụọrọ m iyi,+ sị, ‘Ọ bụ mkpụrụ+ gị ka m ga-enye ala a,’+ ya onwe ya ga-eziga mmụọ ozi ya ibutere gị ụzọ,+ ị ga-alụtakwara nwa m nwoke nwaanyị n’ebe ahụ.+
8 Ma ọ bụrụ na nwaanyị ahụ ekweghị iso gị bịa, gị onwe gị kwa ga-enwere onwe gị n’iyi a ị ṅụụrụ m. Ma akpọghachila nwa m nwoke n’ebe ahụ.”
9 Onye ahụ na-ejere ya ozi wee tinye aka ya n’okpuru apata ụkwụ Ebreham nna ya ukwu wee ṅụọrọ ya iyi n’ihe a.+
10 Onye ahụ na-ejere ya ozi wee chịrị kamel iri n’ime kamel nna ya ukwu na ụdị ihe ọma ọ bụla nna ya ukwu nwere gawa.+ O wee bilie gawa Mesopotemia wee ruo n’obodo Nehọ.
11 N’ikpeazụ, o mere ka kamel ya makpuru n’akụkụ otu olulu mmiri dị ná mpụga obodo ahụ n’ihe dị ka oge mgbede,+ n’ihe dị ka mgbe ụmụ nwaanyị na-esere mmiri ji apụtakarị.+
12 O wee sị: “Jehova bụ́ Chineke nna m ukwu Ebreham,+ biko, mee ka nke a mee n’ihu m taa, gosikwa nna m ukwu Ebreham+ obiọma.*+
13 Lee, m guzo n’otu isi mmiri, ụmụ agbọghọ ndị obodo a na-apụtakwa isere mmiri.+
14 Ihe ga-emekwa bụ na nwa agbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, butuo ite mmiri gị ka m ṅụrụtụ mmiri,’ onye ga-asịkwa m, ‘Ṅụọ, m ga-enyekwa kamel gị mmiri,’ ọ bụ onye a ka ị ga-enye ohu gị,+ bụ́ Aịzik; ka m jiri nke a mara na i gosiwo nna m ukwu ịhụnanya na-adịgide adịgide.”+
15 O wee ruo na tupu ya ekwuchaa okwu ahụ,+ leekwa Ribeka ka ọ na-apụta, bụ́ onye a mụụrụ Betuel+ nwa Milka+ bụ́ nwunye Nehọ,+ nwanne Ebreham, o bukwa ite mmiri ya n’ubu.+
16 Nwa agbọghọ ahụ mara mma nke ukwuu,+ ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ọ dịghị nwoke ya na ya nweworo mmekọahụ;+ o wee gbadaa n’isi mmiri ahụ wee malite ịgbanye mmiri n’ite mmiri ya, e mesịa, ọ gbagotere.
17 Onye ahụ na-eje ozi gbakwuuru ya ozugbo wee sị ya: “Biko, ka m ṅụrụtụ mmiri n’ite gị.”+
18 O wee sị: “Ṅụọ, onyenwe m.” O wee butuo ite ya ọsọ ọsọ buru ya n’aka bunye ya ka ọ ṅụọ.+
19 Mgbe o nyesịrị ya mmiri ya aṅụọ, ọ sịrị ya: “M ga-esetakwara kamel gị mmiri ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”+
20 O wee wụnye mmiri dị n’ite ya ọsọ ọsọ n’ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri ma gbaga ugboro ugboro n’olulu mmiri ahụ iseta mmiri,+ o wee na-esetara kamel ya niile mmiri.
21 Ka ihe a na-eme, nwoke a nọ na-ele ya anya n’ijuanya, gba nkịtị ka ọ mara ma Jehova ò mewo ka njem ya gaa nke ọma ma ọ bụ na o meghị.+
22 O wee ruo na mgbe kamel ndị ahụ ṅụsịrị mmiri, nwoke ahụ wepụtara ọla imi+ e ji ọlaedo mee nke dị ọkara shekel n’ịdị arọ na ọla aka abụọ, ịdị arọ ha dị shekel ọlaedo iri,+
23 o wee sị ya: “Ị̀ bụ nwa onye? Biko, gwa m. Ò nwere ebe anyị ga-arahụ n’ụlọ nna gị?”+
24 O wee sị ya: “Abụ m ada Betuel+ nwa Milka, onye ọ mụụrụ Nehọ.”+
25 O wee gwakwa ya, sị: “Anyị nwere ma okporo ọka* ma nri anụ dị ukwuu, nweekwa ebe unu ga-arahụ.”+
26 Nwoke ahụ wee hulata kpọọ isiala n’ihu Jehova+
27 wee sị: “Ka Jehova+ bụ́ Chineke nke nna m ukwu Ebreham bụrụ onye a gọziri agọzi, bụ́ onye na-akwụsịghị igosi obiọma ya na ikwesị ntụkwasị obi ya n’ahụ́ nna m ukwu. Anọ m na njem, Jehova wee durute m n’ụlọ ụmụnne nna m ukwu.”+
28 Nwa agbọghọ ahụ wee gbara ọsọ gaa kọọrọ ezinụlọ nne ya ihe ndị a.
29 Ribeka nwere nwanne nwoke, aha ya bụ Leban.+ Leban wee gbara ọsọ gawa n’ebe nwoke ahụ nọ, ná mpụga obodo, n’isi mmiri ahụ.
30 O wee ruo na mgbe ọ hụrụ ọla imi ahụ nakwa ọla aka ahụ nwanne ya nwaanyị gba n’aka,+ mgbe ọ nụkwara ihe Ribeka nwanne ya nwaanyị kwuru, sị: “Lekwa lekwa ihe nwoke ahụ gwara m,” o wee bịakwute nwoke ahụ, ma, lee, ọ nọ n’ebe ahụ, o guzo n’akụkụ kamel ndị ahụ n’isi mmiri ahụ.
31 Ozugbo ahụ, ọ sịrị: “Bịa, gị onye Jehova gọziri agọzi.+ Gịnị mere i ji guzoro n’èzí ebe a, ebe mụ onwe m kwadebeworo ụlọ na ebe kamel ndị a ga-anọ?”
32 Nwoke ahụ wee bata n’ụlọ, o wee tọpụ kamel ndị ahụ ihe e kere ha, wee nye kamel ndị ahụ okporo ọka na nri anụ, kutekwa mmiri ya na ndị ikom ya na ha so ga-eji saa ụkwụ.+
33 E wee bupụtara ya ihe oriri, ma ọ sịrị: “Agaghị m eri ihe ruo mgbe m kwuru ihe mere m ji bịa.” O wee sị ya: “Kwuwe!”+
34 O wee gaa n’ihu ịsị: “Abụ m onye na-ejere Ebreham ozi.+
35 Jehova agọziwo nna m ukwu nke ukwuu n’ihi na o mere ka ọ na-abawanye ụba, na-enyekwa ya atụrụ na ehi na ọlaọcha na ọlaedo na ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi na kamel na ịnyịnya ibu.+
36 Sera nwunye nna m ukwu mụụrụ nna m ukwu nwa nwoke mgbe o meworo agadi;+ ọ ga-enyekwa ya ihe niile o nwere.+
37 Ya mere, nna m ukwu mere ka m ṅụọ iyi, sị, ‘Esila n’etiti ndị inyom Kenan, bụ́ ndị m bi n’ala ha, lụtara nwa m nwoke nwaanyị.+
38 Ee e, kama ị ga-aga n’ụlọ nna m, n’ezinụlọ m,+ lụtara nwa m nwoke nwaanyị.’+
39 Ma m sịrị nna m ukwu, ‘Ọ́ bụrụkwanụ na nwaanyị ahụ ekweghị iso m bịa?’+
40 O wee sị m, ‘Jehova, bụ́ onye m jeworo ije n’ihu ya,+ ga-ezitere gị mmụọ ozi ya,+ ọ ga-emekwa ka i nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ gị;+ ị ga-alụtakwara nwa m nwoke nwaanyị site n’ezinụlọ m, sitekwa n’ụlọ nna m.+
41 Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-enwere onwe gị n’iyi ị ṅụụrụ m mgbe i ruru na nke ndị ezinụlọ m, ọ bụrụkwa na ha akpọnyeghị gị ya, ị ga-enwere onwe gị n’iyi ị ṅụụrụ m.’+
42 “Mgbe m rutere n’isi mmiri ahụ taa, m kwuru, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke nke nna m ukwu Ebreham, ọ bụrụ n’ezie na ị ga-eme ka m nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ m na-aga na ya,+
43 lee, m guzo n’otu isi mmiri. Ihe ga-eme bụ na nwa agbọghọ+ nke ga-abịa isere mmiri bụ́ onye m ga-asị: “Biko, ka m ṅụrụtụ mmiri n’ite gị,”
44 bụ́ onye ga-asị m: “Ṅụọ, m ga-esetakwara kamel gị mmiri,” ọ bụ ya bụ nwaanyị nke Jehova nyere nwa nna m ukwu.’+
45 “Tupu m na-ekwucha+ nke ahụ n’obi m,+ lee, Ribeka bu ite ya n’ubu na-abịa; o wee gbadaa n’isi mmiri ahụ wee malite isere mmiri.+ M wee sị ya, ‘Biko, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.’+
46 O wee butuo ite ya ọsọ ọsọ wee sị m, ‘Ṅụọ,+ m ga-enyekwa kamel gị mmiri.’ M wee ṅụọ, o nyekwara kamel m mmiri.
47 E mesịa, m jụrụ ya, sị, ‘Ị̀ bụ nwa onye?’+ o wee zaa, sị, ‘Ada Betuel nwa Nehọ, bụ́ onye Milka mụụrụ ya.’ M wee gbanye ya ọla imi n’oghere imi ya nakwa ọla aka n’aka ya.+
48 M wee hulata kpọọ isiala n’ihu Jehova wee gọzie Jehova bụ́ Chineke nna m ukwu Ebreham,+ bụ́ onye duru m n’ezi ụzọ+ ka m wee lụtara nwa nna m ukwu ada nwanne nna ya.
49 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-egosi nna m ukwu obiọma na ikwesị ntụkwasị obi, gwanụ m;+ ma ọ bụrụ na ọ bụghị otú a, gwanụ m, ka m mara ma m ga-agawa ihu ma ọ bụ azụ.”+
50 Leban na Betuel wee zaa, sị: “Ihe a si n’aka Jehova.+ Anyị enweghị ike ịgwa gị ihe ọ bụla, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.+
51 Lee Ribeka n’ihu gị. Kpọrọ ya lawa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, dị nnọọ ka Jehova kwuru.”+
52 O wee ruo na mgbe onye na-ejere Ebreham ozi nụrụ ihe ha kwuru, ọ kpọrọ isiala n’ihu Jehova ozugbo.+
53 Onye ahụ na-eje ozi wee chịpụta ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee na uwe chịnye Ribeka; o nyekwara nwanne ya nwoke na nne ya ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.+
54 E mesịa, ha riri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ya na ndị ikom so ya, ha wee rahụ n’ebe ahụ wee bilie n’ụtụtụ.
O wee sị: “Hapụnụ m ka m lakwuru nna m ukwu.”+
55 Nwanne ya nwoke na nne ya wee sị: “Ka anyị na nwa agbọghọ a nọọ ụbọchị iri ma ọ dịkarịa ala. E mesịa, o nwere ike ịlawa.”
56 Ma ọ sịrị ha: “Unu egbochila m ịla, ebe ọ bụ na Jehova emewo ka m nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ m.+ Hapụnụ m, ka m lakwuru nna m ukwu.”+
57 Ha wee sị: “Ka anyị kpọọ nwa agbọghọ ahụ jụọ ya ka o jiri ọnụ ya kwuo.”+
58 Ha wee kpọọ Ribeka, jụọ ya, sị: “Ị̀ ga-eso nwoke a laa?” O wee zaa, sị: “Achọrọ m iso ya laa.”+
59 Ha wee hapụ Ribeka+ nwanne ha nwaanyị na onye nyere ya ara+ na onye ahụ na-ejere Ebreham ozi na ndị ikom ya ka ha lawa.
60 Ha wee malite ịgọzi Ribeka wee sị ya: “Nwanne anyị nwaanyị, ghọọ iri puku kwuru iri puku, ka mkpụrụ gị nweta ọnụ ụzọ ámá nke ndị kpọrọ ya asị.”+
61 E mesịa, Ribeka na ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi+ biliri wee nọkwasị na kamel+ sowe nwoke ahụ n’azụ; onye ahụ na-eje ozi wee kpọrọ Ribeka lawa.
62 Aịzik si n’ụzọ gara Bia-lehaị-rọị+ lọta, n’ihi na o bi n’ala Negeb.+
63 Aịzik pụtara n’ihe dị ka oge mgbede na-ejegharị n’ọhịa ka o wee tụgharịa uche.+ Mgbe o lepụrụ anya, lee, kamel nọ na-abịa!
64 Mgbe Ribeka lepụrụ anya, ọ hụrụ Aịzik, o wee si na kamel ahụ wụtuo.
65 O wee sị onye ahụ na-eje ozi: “Ònye bụ nwoke ahụ si n’ọhịa na-abịa izute anyị?” onye ahụ na-eje ozi wee sị: “Ọ bụ nna m ukwu.” O wee were ákwà isi kpuchie onwe ya.+
66 Onye ahụ na-eje ozi wee kọọrọ Aịzik ihe niile o mere.
67 E mesịa, Aịzik kpọbatara ya n’ụlọikwuu Sera nne ya.+ O wee si otú ahụ lụọ Ribeka, o wee ghọọ nwunye ya;+ o wee hụ ya n’anya,+ Aịzik wee nweta nkasi obi mgbe nne ya nwụsịrị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.