Jenesis 23:1-20

23  Afọ ndụ Sera wee bụrụ otu narị afọ na iri abụọ na asaa. Ọ bụ afọ ole a ka Sera dịrị ndụ.+  Sera wee nwụọ na Kiriat-aba, ya bụ, Hibrọn,+ n’ala Kenan,+ Ebreham wee bata ịkwara Sera ákwá arịrị na ibere ya ákwá.  Ebreham wee hapụ onye nwụnahụrụ ya, bilie gaa gwa ụmụ Het+, sị:  “Abụ m onye mbịarambịa na onye ọbịa n’etiti unu.+ Nyenụ m ebe m ga na-eli ozu n’ala unu ka ọ bụrụ nke m, ka m wee lie onye nwụnahụrụ m ka ọ pụọ m n’anya.”+  Ụmụ Het wee zaa Ebreham sị ya:  “Gee anyị ntị, onyenwe m.+ Onyeisi nke Chineke họpụtara ka ị bụ n’etiti anyị.+ Lie onye nwụnahụrụ gị n’ebe kasị mma n’ebe niile anyị na-eli ozu.+ Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ajụ inye gị ebe ọ na-eli ozu iji gbochie gị ili onye nwụnahụrụ gị.”  Ebreham wee bilie kpọọrọ ụmụ afọ ala ahụ, bụ́ ụmụ Het,+ isiala,+  wee sị ha: “Ọ bụrụ na mkpụrụ obi unu kwere ka m lie onye nwụnahụrụ m ka ọ pụọ m n’anya, geenụ m ntị ma rịọrọnụ m Ifrọn nwa Zoha arịrịọ+  ka o nye m ọgba Mak-pila,+ bụ́ nke ya, nke dị na nsọtụ ala ya. Ka ọ nọrọ n’ihu unu nye m ya ka m kwụchaa ya ọlaọcha ole m kwesịrị ịkwụ ya ka ọ bụrụ ebe m ga na-eli ozu.”+ 10  Dị ka o si dị, Ifrọn nọ ọdụ n’etiti ụmụ Het. Ifrọn onye Het+ wee zaa Ebreham ná ntị ụmụ Het na ndị niile na-abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ya, sị:+ 11  “Ee e, onyenwe m! Gee m ntị. M na-enye gị ala ahụ, m na-enyekwa gị ọgba nke dị na ya. M na-enye gị ya n’ihu ụmụnna m.+ Lie onye nwụnahụrụ gị.” 12  Ebreham wee kpọọ isiala n’ihu ụmụ afọ ala ahụ 13  wee gwa Ifrọn ná ntị ụmụ afọ ala ahụ, sị: “A sị nnọọ na gị onwe gị—ee e, gee m ntị! M ga-akwụ gị ọlaọcha ole m kwesịrị ịkwụ maka ala ahụ. Nara m ya,+ ka m wee lie onye nwụnahụrụ m n’ebe ahụ.” 14  Ifrọn wee zaa Ebreham, sị: 15  “Onyenwe m, gee m ntị. Ibé ala nke ọnụ ahịa ya bụ narị shekel ọlaọcha anọ, gịnị ka nke ahụ bụ n’etiti mụ na gị? Ya mere, lie onye nwụnahụrụ gị.”+ 16  Ebreham wee gee Ifrọn ntị, Ebreham wee tụọ ọlaọcha ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, bụ́ nke o kwuru ná ntị ụmụ Het, wee nye ya Ifrọn, ọ dị narị shekel ọlaọcha anọ, bụ́ nke ndị ahịa na-ana mgbe ahụ.+ 17  E wee mee ka o doo anya+ na ala Ifrọn nke dị na Mak-pila, bụ́ nke dị n’ihu Mamri, ala ahụ na ọgba dị na ya na osisi niile dị n’ala ahụ,+ ndị dị n’ime ya gbaa gburugburu, 18  bụ nke Ebreham, dị ka ala ọ zụrụ azụ n’ihu ụmụ Het n’etiti ndị niile na-abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ya.+ 19  E mesịa, Ebreham liri Sera nwunye ya n’ọgba dị n’ala Mak-pila n’ihu Mamri, ya bụ, Hibrọn, n’ala Kenan.+ 20  Ụmụ Het wee mee ka o doo anya na ọ bụ Ebreham nwe ala ahụ na ọgba ahụ dị ka ebe ọ ga na-eli ozu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji