Jenesis 21:1-34

21  Jehova wee chee ihu ya n’ebe Sera nọ dị nnọọ ka o kwuru, Jehova wee meere Sera dị nnọọ ka o kwuru.+  Sera wee tụrụ ime+ mụọrọ Ebreham nwa nwoke n’agadi ya n’oge ahụ a kara aka nke Chineke gwara ya banyere ya.+  Ebreham wee gụọ nwa ya nwoke nke a mụụrụ ya, bụ́ onye Sera mụụrụ ya, Aịzik.+  Ebreham wee bie Aịzik nwa ya úgwù mgbe ọ dị ụbọchị asatọ, dị nnọọ ka Chineke nyere ya n’iwu.+  Ebreham dị otu narị afọ mgbe a mụụrụ ya Aịzik nwa ya.  Sera wee sị: “Chineke emeworo m ihe ọchị: onye ọ bụla nụrụ banyere ya ga-esoro m chịa ọchị.”+  Ọ sịkwara: “Olee onye gaara agwa Ebreham, sị, ‘Sera ga-enye nwa ara,’ ma amụtawo m nwa nwoke n’agadi ya?”  Nwa ahụ nọ na-eto, e wee kwụsị ya ara;+ Ebreham wee mee oké oriri n’ụbọchị a kwụsịrị Aịzik ara.  Sera wee na-ahụ ka nwa Hega onye Ijipt,+ bụ́ onye ọ mụụrụ Ebreham, na-eme Aịzik akaje.+ 10  O wee malite ịgwa Ebreham, sị: “Chụpụ ohu nwaanyị a na nwa ya, n’ihi na nwa ohu nwaanyị a agajeghị iso nwa m nwoke, bụ́ Aịzik, bụrụ onye nketa!”+ 11  Ma ihe ahụ wutere nnọọ Ebreham n’ihi nwa ya.+ 12  Chineke wee sị Ebreham: “Ekwela ka ihe ọ bụla Sera na-agwa gị banyere nwa okoro ahụ nakwa banyere ohu gị nwaanyị wute gị. Gee ntị n’olu ya, n’ihi na ihe a ga-akpọ mkpụrụ gị ga-esi n’Aịzik.+ 13  M ga-emekwa ka nwa ohu nwaanyị+ ahụ ghọọ mba, n’ihi na ọ bụ nwa gị.”+ 14  Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ were achịcha na karama akpụkpọ mmiri nye Hega,+ dọkwasị ya n’ubu ya, kpọnyekwa ya nwata ahụ,+ wee chụpụ ya. O wee gawa, na-agagharị n’ala ịkpa Bia-shiba.+ 15  N’ikpeazụ, mmiri gwụrụ+ na karama akpụkpọ ahụ, o wee tọgbọ+ nwata ahụ n’okpuru otu n’ime osisi ndị dị n’ebe ahụ. 16  O wee na-aga ma nọdụ ala naanị ya n’ebe akụ́ ụta a gbapụrụ agbapụ pụrụ iru, n’ihi na ọ sịrị: “Ka m ghara ịhụ mgbe nwata ahụ ga-anwụ.”+ Ya mere, ọ nọdụrụ ala n’ebe dịtụ anya wee malite ịkwa ákwá n’olu dara ụda.+ 17  Chineke wee nụ olu nwa okoro ahụ,+ mmụọ ozi Chineke wee si n’eluigwe kpọọ Hega òkù wee sị ya:+ “Gịnị na-eme gị, Hega? Atụla egwu, n’ihi na Chineke anụwo olu nwa okoro ahụ n’ebe ahụ ọ nọ. 18  Bilie, kulite nwa okoro ahụ, jidekwa ya aka, n’ihi na m ga-eme ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.”+ 19  Chineke wee meghee anya ya, o wee hụ olulu mmiri;+ o wee gaa malite ịgbanye mmiri na karama akpụkpọ ahụ, o nyekwara nwa okoro ahụ ka ọ ṅụọ. 20  Chineke wee na-anọnyere nwa okoro ahụ,+ o wee na-eto ma biri n’ala ịkpa; o wee ghọọ onye na-agba ụta.+ 21  O wee biri n’ala ịkpa Peran,+ nne ya wee si n’ala Ijipt lụtara ya nwaanyị. 22  O wee ruo n’oge ahụ na Abimelek na Faịkọl bụ́ onyeisi ndị agha ya sịrị Ebreham: “Chineke nọnyeere gị n’ihe ọ bụla ị na-eme.+ 23  Ya mere, jiri Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị aghọ mụ na ụmụ m na ndị ga-esi n’agbụrụ m+ aghụghọ; na ọ bụ dị ka m si jiri ịhụnanya na-adịgide adịgide meso gị ihe+ ka ị ga-emeso m ihe, mesokwa ala nke ị nọworo na-ebi dị ka ọbịa.”+ 24  Ebreham wee sị: “M ga-aṅụ iyi.”+ 25  Mgbe Ebreham basiiri Abimelek mba ike banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere Abimelek ozi weghaara n’ike,+ 26  Abimelek sịrị: “Amaghị m onye mere ihe a, ị kọghịkwara m ya, anụghịkwa m ya ma e wezụga taa.”+ 27  Ebreham wee kpụrụ atụrụ na ehi kpụnye Abimelek,+ ha abụọ wee gbaa ndụ.+ 28  Mgbe Ebreham si n’ìgwè atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa iche, 29  Abimelek sịrị Ebreham: “Gịnị mere i ji wepụta nne atụrụ asaa ndị a iche?” 30  O wee sị: “Nara m nne atụrụ asaa ndị a m na-enye gị, ka ọ bụụrụ m ihe àmà+ na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.” 31  Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Bia-shiba,+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha abụọ ṅụrụ iyi. 32  Ha wee gbaa ndụ+ na Bia-shiba, e mesịa, Abimelek biliri, ya na Faịkọl bụ́ onyeisi ndị agha ya, ha wee laghachi n’ala ndị Filistia.+ 33  E mesịa, ọ kụrụ osisi tamarisk na Bia-shiba ma nọrọ n’ebe ahụ kpọkuo aha Jehova,+ bụ́ Chineke nke na-adịru mgbe ebighị ebi.+ 34  Ebreham wee bie dị ka ọbịa n’ala ndị Filistia ruo ọtụtụ ụbọchị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji