Jenesis 2:1-25
2 E wee kechaa eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha.+
2 Ka ọ na-eru n’ụbọchị nke asaa, Chineke rụchara ọrụ ya nke ọ nọ na-arụ, o wee zuwe ike n’ụbọchị nke asaa n’ọrụ ya niile nke ọ rụrụ.+
3 Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ma mee ka ọ dị nsọ, n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Chineke nọworo na-ezu ike n’ọrụ ya dum nke ike ihe bụ́ nke ọ rụrụ dị ka o zubere.+
4 Nke a bụ akụkọ banyere eluigwe na ụwa n’oge e kere ha, n’ụbọchị Jehova bụ́ Chineke mere ụwa na eluigwe.+
5 Osisi ndị dị n’ọhịa adịbeghị n’ụwa, ahịhịa ndụ nke ala amalitebeghịkwa ipulite, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke emebeghị ka mmiri zoo+ n’elu ala, ọ dịghịkwa mmadụ ọ bụla ga na-akọ ihe n’ala.
6 Ma alụlụụ+ na-esi n’ụwa akwụgo, ọ na-edekwa elu ala dum mmiri.+
7 Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá+ si n’ala+ kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya,+ mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.+
8 Jehova bụ́ Chineke kụkwara ubi n’Iden,+ n’ebe ọwụwa anyanwụ, ọ bụ n’ebe ahụ ka o mere ka mmadụ ahụ ọ kpụrụ nọrọ.+
9 Jehova bụ́ Chineke wee mee ka osisi ọ bụla nke dị mma ile anya, nke dịkwa mma oriri, pupụta n’ala, o mekwara ka osisi nke ndụ+ pupụta n’etiti ubi ahụ, tinyere osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.+
10 E nwere osimiri si n’Iden na-asọpụta iji na-ede ubi ahụ mmiri, ọ malitekwara ikewa n’ebe ahụ, o wee ghọọ isi mmiri anọ, dị ka a pụrụ ikwu ya.
11 Aha nke mbụ bụ Paịshọn; ọ bụ ya gbara ala Havila+ dum gburugburu, bụ́ ebe e nwere ọlaedo.
12 Ọlaedo nke dị n’ala ahụ dị mma.+ N’ebe ahụ ka e nwekwara esó deliọm+ nakwa nkume ọnịks.+
13 Aha osimiri nke abụọ bụ Gaịhọn; ọ bụ ya gbara ala Kush dum gburugburu.
14 Aha osimiri nke atọ bụ Hidekel;+ ọ bụ ya na-asọga n’ebe ọwụwa anyanwụ Asiria.+ Osimiri nke anọ bụ Yufretis.+
15 Jehova bụ́ Chineke wee kpọrọ mmadụ ahụ mee ka o biri n’ogige Iden+ ka ọ na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya.+
16 Jehova bụ́ Chineke nyekwara mmadụ ahụ iwu, sị: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ.+
17 Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.”+
18 Jehova bụ́ Chineke wee sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.”+
19 Jehova bụ́ Chineke jikwa ájá kpụọ anụ ọhịa ọ bụla na anụ ufe ọ bụla nke eluigwe, o wee malite ime ka ha na-abịakwute mmadụ ahụ ka ọ mara ihe ọ ga-agụ nke ọ bụla; ihe ọ bụla mmadụ ahụ gụrụ mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ,+ ya abụrụ aha ya.+
20 Mmadụ ahụ wee na-agụ anụ ụlọ niile na anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa ọ bụla aha, ma mmadụ ahụ enweghị onye inyeaka nke ga-eme ka o zuo ezu.
21 N’ihi ya, Jehova bụ́ Chineke mere ka oké ụra+ buru mmadụ ahụ, ka ọ nọ na-ehi ụra, o wepụtara otu n’ime ọgịrịga ya ma mechie ebe ahụ o si wepụta ya.
22 Jehova bụ́ Chineke wee kpụọ ọgịrịga ahụ o wepụtara n’ahụ́ nwoke ahụ ka ọ bụrụ nwaanyị ma kpọrọ ya kpọtara nwoke ahụ.+
23 Nwoke ahụ wee sị:
“Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m
Na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m.+
A ga-akpọ onye a Nwaanyị,
N’ihi na e si n’ahụ́ nwoke wepụta ya.”+
24 Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya+ wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.+
25 Ha abụọ wee na-agba ọtọ,+ nwoke ahụ na nwunye ya, ma ihere adịghị eme ha.+