Jenesis 19:1-38
19 Ndị mmụọ ozi abụọ ahụ wee bịarute Sọdọm ná mgbede, Lọt nọkwa ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá Sọdọm.+ Mgbe Lọt hụrụ ha, o biliri gaa izute ha, o wee kpọọ isiala.+
2 O wee sị: “Biko, ndị nwe m, biko, batanụ n’ụlọ ohu unu nọbọọ chi, ka a saakwa ụkwụ unu.+ Unu ga-ebilikwa n’isi ụtụtụ wee gawa ebe unu na-aga.”+ Ha wee sị: “Ee e, kama ọ bụ n’ámá obodo ka anyị ga-anọbọ chi.”+
3 Ma ọ rịọsiri ha ike,+ nke mere na ha sooro ya bata n’ụlọ ya. O wee meere ha oriri,+ o mekwara achịcha na-ekoghị eko,+ ha wee rie.
4 Tupu ha edinara ala, ndị ikom obodo ahụ, bụ́ ndị ikom Sọdọm, gbara ụlọ ahụ gburugburu,+ malite na nwa okoro ruo n’agadi, mmadụ niile dị ka otu ìgwè.+
5 Ha wee na-akpọ Lọt òkù, na-asị ya: “Olee ebe ndị ikom ahụ bịakwutere gị n’abalị a nọ? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha nwee mmekọahụ.”+
6 N’ikpeazụ, Lọt pụkwuuru ha n’ọnụ ụzọ, ma ọ kpọchiri ụzọ mgbe ọ pụtara.
7 O wee sị: “Bikonụ, ụmụnne m, unu emela ihe ọjọọ a.+
8 Bikonụ, lee, m nwere ụmụ nwaanyị abụọ bụ́ ndị ha na nwoke na-enwebeghị mmekọahụ ma ọlị.+ Biko, ka m kpọpụtara unu ha. Unu meekwa ha otú dị unu mma.+ Kama unu emela ndị ikom a ihe ọ bụla,+ n’ihi na ọ bụ ya mere ha ji bata na ndò ụlọ m.”+
9 Ha wee sị ya: “Pụọrọ anyị n’ụzọ!” Ha sịkwara: “Nwoke a nke naanị ya nọ bịara biri n’ebe a dị ka ọbịa,+ ma ọ nọzi dị ka onyeikpe.+ Anyị ga-eme gị ihe dị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha wee bịa nugidesie nwoke ahụ,+ bụ́ Lọt, ike, ọ fọkwara nke nta ka ha kwakaa ibo ụzọ ahụ.+
10 Ndị ikom ahụ wee wepụta aka ha sebata Lọt n’ebe ha nọ, n’ime ụlọ ahụ, ha mechikwara ụzọ.
11 Ma ha mere ka ndị ikom ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ kpuo ìsì,+ malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu,+ nke mere na ike gwụrụ ha ka ha nọ na-asọgharị ìsì ịchọta ọnụ ụzọ ahụ.+
12 Ndị ikom ahụ wee sị Lọt: “Ọ̀ dị onye ọzọ i nwere n’ebe a? Ọgọ gị nwoke na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nakwa ndị niile bụ́ ndị gị n’obodo a, kpọrọ ha pụọ n’ebe a!+
13 N’ihi na anyị ga-ebibi ebe a, n’ihi na mkpu ákwá a na-eti megide ha adasiwo ụda ike n’ihu Jehova,+ nke mere na Jehova zitere anyị ka anyị bibie obodo a.”+
14 Ya mere, Lọt gara na-agwa ndị ọgọ ya nwoke, bụ́ ndị chọrọ ịlụ ụmụ ya ndị inyom, okwu, wee na-asị ha: “Bilienụ! Sinụ n’ebe a pụọ, n’ihi na Jehova ga-ebibi obodo a!”+ Ma n’anya ndị ọgọ ya nwoke, ọ dị ka onye na-egwu egwu.+
15 Otú ọ dị, mgbe chi bọrọ, ndị mmụọ ozi ahụ malitere ịgwa Lọt ka o mee ngwa ngwa, sị: “Bilie! Kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ bụ́ ndị nọ n’ebe a,+ ka a ghara ibibi gị mgbe a na-ebibi obodo a n’ihi njehie ya!”+
16 Mgbe ọ nọ na-egbu oge,+ ndị ikom ahụ jidere ya na nwunye ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ n’aka n’ihi ọmịiko Jehova nwere n’ebe ọ nọ,+ ha wee kpọpụta ya ma mee ka o guzoro ná mpụga obodo ahụ.+
17 O wee ruo na ozugbo ha kpọpụtara ha ná mpụga obodo ahụ, otu n’ime ha malitere ịsị ya: “Gbalaga n’ihi mkpụrụ obi gị!+ Elela anya n’azụ,+ eguzokwala eguzo n’Ógbè Jọdan a dum!+ Gbaga n’ógbè bụ́ ugwu ugwu ka a ghara ibibi gị!”+
18 Lọt wee sị ha: “Biko, Jehova, ya abụla ebe ahụ!
19 Biko, ihe ohu gị masịrị gị+ nke mere i ji na-eme ka obiọma*+ gị dị ukwuu, bụ́ nke i gosiri m wee chebe mkpụrụ obi m ndụ,+ ma mụ onwe m agaghị enwe ike ịgbaga n’ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu, ka ọdachi ghara ịdakwasị m, m wee nwụọ.+
20 Biko, obodo nke a dị nso ịgbaga na ya, ọ dịghịkwa oké ihe ọ bụ.+ Biko, ka m gbaga n’ebe ahụ—ò nwere oké ihe ọ bụ?—mkpụrụ obi m ga-adịrị ndụ.”+
21 O wee sị ya: “Lee, m ga-emekwara gị ihe a ị rịọrọ+ site n’ịhapụ ịkwatu obodo a i kwuru okwu ya.+
22 Mee ọsọ ọsọ! Gbaga n’ebe ahụ, n’ihi na agaghị m enwe ike ime ihe ọ bụla ruo mgbe i ruru n’ebe ahụ!”+ Ọ bụ ya mere o ji kpọọ obodo ahụ Zoa.+
23 Anyanwụ awaala n’ala ahụ mgbe Lọt rutere na Zoa.+
24 Jehova wee mee ka sọlfọ na ọkụ si n’ebe Jehova nọ, n’eluigwe, zokwasị Sọdọm, zokwasịkwa Gọmọra.+
25 O wee gaa n’ihu ịkwatu obodo ndị a, ọbụna Ógbè Jọdan dum, laakwa ndị niile bi n’obodo ndị ahụ na ihe a kụrụ n’ala n’iyi.+
26 Nwunye ya wee nọrọ n’azụ ya malite ile anya n’azụ, o wee ghọọ ogidi nnu.+
27 Ebreham wee pụọ n’isi ụtụtụ gaa n’ebe ahụ o guzoburu n’ihu Jehova.+
28 O wee leda anya na Sọdọm na Gọmọra, nakwa n’ala dum dị n’Ógbè Jọdan, o wee hụ, ma, lee, oké anwụrụ ọkụ si n’ala ahụ na-akwụgo dị ka oké anwụrụ ọkụ nke ebe a kwanyere oké ọkụ!+
29 O wee ruo na mgbe Chineke lara obodo ndị dị n’Ógbè Jọdan n’iyi, Chineke chetara Ebreham wee mee ka Lọt pụọ n’ebe ahụ ọ kwaturu mgbe ọ na-akwatu obodo ndị dị n’ebe ahụ Lọt biri.+
30 E mesịa, Lọt si na Zoa gbagoo wee gaa biri n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ,+ n’ihi na egwu tụrụ ya ibi na Zoa.+ O wee biri n’ọgba, ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ.
31 Nke ada wee sị nke nta: “Nna anyị emewo agadi, ọ dịghịkwa nwoke nọ n’ala a nke anyị na ya ga-enwe mmekọahụ dị ka ụwa dum si eme.+
32 Bịa ka anyị nye nna anyị mmanya ka ọ ṅụọ,+ ka anyị na ya dinaakwa wee site n’aka nna anyị mụta ụmụ.”+
33 Ha wee gbaa nna ha mmanya n’abalị ahụ;+ nke ada wee banye, ya na nna ya wee dinaa, ma ọ maghị mgbe o dinaara na mgbe o biliri.
34 O wee ruo n’echi ya na nke ada sịrị nke nta: “Lee, mụ na nna m dinara n’abalị ụnyaahụ. Ka anyị nye ya mmanya ka ọ ṅụọ n’abalị a kwa. Ị ga-abanyekwa, gị na ya dinaa, ka anyị sitekwa n’aka nna anyị mụta ụmụ.”
35 Ha wee gbaa nna ha mmanya n’abalị ahụkwa; nke nta wee bilie, ya na ya wee dinaa, ma ọ maghị mgbe o dinaara na mgbe o biliri.
36 Ụmụ ndị inyom abụọ Lọt wee tụrụ ime site n’aka nna ha.+
37 Ka oge na-aga, nke ada mụrụ nwa nwoke wee gụọ ya Moab. Ọ bụ ya bụ nna ndị Moab ruo taa.+
38 Nke nta mụkwara nwa nwoke wee gụọ ya Ben-amị. Ọ bụ ya bụ nna ndị Amọn+ ruo taa.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”