Jenesis 18:1-33
18 E mesịa, Jehova pụtara ìhè+ n’ihu ya n’etiti osisi ukwu ndị dị na Mamri,+ mgbe ọ nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya n’ihe dị ka mgbe ụbọchị kpowere ọkụ.+
2 Mgbe o leliri anya,+ ọ hụrụ, ma, lee, ndị ikom atọ guzo n’ebe dịtụ anya n’ebe ọ nọ. Mgbe ọ hụrụ ha, o si n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ gbara ọsọ gawa izute ha, o wee kpọọ isiala.+
3 O wee sị: “Jehova, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, agafela ohu gị.+
4 Biko, ka e kute obere mmiri saa unu ụkwụ.+ Mgbe ahụ, unu ga-ezuru ike n’okpuru osisi a.+
5 Ka m wetatụrụ unu achịcha, ka obi unu nweta ume.+ E mesịa, unu pụrụ ịgawa, n’ihi na ọ bụ ya mere unu ji si n’ụzọ a bịakwute ohu unu.” Ha wee sị: “Ọ dị mma. Ị pụrụ ime nnọọ dị ka i kwuru.”
6 Ebreham wee mee ọsọ ọsọ gakwuru Sera n’ụlọikwuu wee sị: “Mee ọsọ ọsọ! Mata ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia ntụ ọka* atọ e gwere nke ọma, gwọọ ya, mee achịcha.”+
7 Ebreham wee gbaga n’ebe ìgwè ehi ya nọ wee kpụrụ nwa oké ehi dị mma nke anụ ya na-akabeghị aka kpụnye onye na-ejere ya ozi, o wee mee ọsọ ọsọ kwadebe ya.+
8 O wee were mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmiri ara ehi nkịtị na nwa oké ehi ahụ ọ kwadebere debe n’ihu ha.+ Ya onwe ya wee guzoro n’akụkụ ha n’okpuru osisi ahụ ka ha nọ na-eri nri.+
9 Ha wee jụọ ya, sị: “Olee ebe Sera nwunye gị nọ?”+ O wee zaa, sị: “Ọ nọ n’ụlọikwuu!”+
10 O wee gaa n’ihu ịsị: “Aghaghị m ịbịakwuteghachi gị n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, ma, lee! Sera nwunye gị ga-amụ nwa nwoke.”+ Sera nọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, nke dị n’azụ nwoke ahụ, na-ege ntị.
11 Ebreham na Sera emewo agadi, ha agamiwokwa n’afọ ndụ.+ Sera adịkwaghị ahụ nsọ ya.+
12 Ya mere, Sera malitere ịchị ọchị n’obi ya,+ sị: “Ugbu a m kaworo nká, m̀ ga-enwe obi ụtọ n’ezie, onyenwe m emewokwa agadi?”+
13 Jehova wee sị Ebreham: “N’ihi gịnị ka Sera ji chịa ọchị, sị, ‘M̀ ga-amụ nwa n’eziokwu n’agbanyeghị na mụ emewo agadi?’+
14 Ọ̀ dị ihe nyịrị Jehova?+ M ga-abịakwuteghachi gị n’oge a kara aka, n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
15 Ma Sera malitere ịgọ agọ, sị: “Achịghị m ọchị!” N’ihi na egwu tụrụ ya. O wee sị: “Ee e! kama ị chịrị ọchị.”+
16 E mesịa, ndị ikom ahụ si n’ebe ahụ bilie leda anya na Sọdọm,+ Ebreham sokwa ha na-aga ka o dupụ ha.+
17 Jehova wee sị: “M̀ na-ezochiri Ebreham ihe m na-eme?+
18 Lee, Ebreham aghaghị ịghọ mba dị ukwuu ma dị ike, mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha site na ya.+
19 N’ihi na amarawo m ya ka o wee nye ụmụ ya nakwa ezinụlọ ya ga-anọchi ya iwu ka ha debe ụzọ Jehova iji na-eme ezi omume ma na-eme ihe n’ikpe ziri ezi;+ ka Jehova wee mezuoro Ebreham ihe o kwuru banyere ya.”
20 N’ihi ya, Jehova sịrị: “Ákwá mkpesa a na-akwa banyere Sọdọm na Gọmọra,+ ee, ọ na-adasi ụda ike, mmehie ha kwa, ee, ọ dị oké njọ.+
21 Ekpebisiwo m ike ịgbada ka m wee hụ ma ha na-eme nnọọ dị ka mkpu ákwá a na-eti maka ya si dị, bụ́ nke ruworo m ntị, ọ bụrụkwa na ọ dịghị otú ahụ, m ga-ama.”+
22 Ugbu a, ndị ikom ahụ si n’ebe ahụ tụgharịa gawa Sọdọm; ma Jehova+ ka guzo n’ihu Ebreham.+
23 Ebreham wee bịaruo nso malite ịsị: “Ị̀ ga-ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume?+
24 Ka e were ya na e nwere ndị ezi omume iri ise n’ime obodo ahụ. Ị̀ ga-ekpochapụ obodo ahụ wee ghara ịgbaghara ya n’ihi ndị ezi omume iri ise nọ n’ime ya?+
25 Tụfịakwa! Ị gaghị eme otú a, igbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume, nke na ihe ga-eme onye ajọ omume ga-emekwa onye ezi omume.+ Tụfịakwa! Ị gaghị eme ya. Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?”+
26 Jehova wee sị: “Ọ bụrụ na m ga-ahụ na Sọdọm ndị ezi omume iri ise n’ime obodo ahụ, m ga-agbaghara obodo ahụ dum n’ihi ha.”+
27 Ma Ebreham zara, sị: “Biko, lee, ekpebiela m ịgwa Jehova okwu, ọ bụ ezie na m bụ ájá na ntụ.+
28 Ka e were ya na ọ fọrọ mmadụ ise ka ha zuo ndị ezi omume iri ise. Ị̀ ga-ala obodo ahụ n’iyi n’ihi mmadụ ise ahụ?” O wee sị: “Agaghị m ala ya n’iyi ma ọ bụrụ na mụ ahụ mmadụ iri anọ na ise n’ebe ahụ.”+
29 Ma ọ gwakwara ya okwu ọzọ wee sị: “Ka e were ya na a hụrụ mmadụ iri anọ n’ebe ahụ.” O wee sị: “Agaghị m eme ya n’ihi mmadụ iri anọ ahụ.”
30 Ma ọ gara n’ihu ịsị: “Biko, ka Jehova ghara iwe iwe dị ọkụ,+ kama ka m gaa n’ihu ikwu okwu:+ Ka e were ya na a hụrụ mmadụ iri atọ n’ebe ahụ.” O wee sị: “Agaghị m eme ya ma ọ bụrụ na mụ ahụ mmadụ iri atọ n’ebe ahụ.”
31 Ma ọ gara n’ihu ịsị: “Biko, lee, ekpebiela m ịgwa Jehova okwu:+ Ka e were ya na a hụrụ mmadụ iri abụọ n’ebe ahụ.” O wee sị: “Agaghị m ala ya n’iyi n’ihi mmadụ iri abụọ ahụ.”+
32 N’ikpeazụ ọ sịrị: “Biko, ka Jehova ghara iwe iwe dị ọkụ,+ kama ka m kwuo okwu naanị otu ugboro a:+ Ka e were ya na a hụrụ mmadụ iri n’ebe ahụ.”+ O wee sị: “Agaghị m ala ya n’iyi n’ihi mmadụ iri ahụ.”
33 Jehova+ wee gawa mgbe ọ gwasịrị Ebreham okwu, Ebreham wee laghachi n’ụlọ ya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.