Jenesis 14:1-24
14 O wee ruo n’ụbọchị Amrafel eze Shaịna,+ Arịọk eze Elesa, Kedọlaoma+ eze Ilam,+ nakwa Taịdal eze Goyim,+
2 na eze ndị a busoro Bira eze Sọdọm+ na Biasha eze Gọmọra+ na Shaịnab eze Adma+ na Shemiba eze Zeboyim na eze Bila (ya bụ, Zoa) agha.
3 Ndị a niile jikọrọ aka+ wee zọrọ ije gaa na Ndagwurugwu Sidim,+ ya bụ, Oké Osimiri Nnu.
4 Afọ iri na abụọ ka ha jeere Kedọlaoma ozi, ma ha nupụrụ isi n’afọ nke iri na atọ.
5 N’afọ nke iri na anọ, Kedọlaoma bịara, ya na ndị eze so ya, ha wee merie ndị Refeyim n’Ashterọt-kaneyim, nọrọ na Ham merie ndị Zuzim, nọrọkwa na Sheve-kiriateyim merie ndị Imim,
6 ha merikwara ndị Horaịt n’ugwu ha bụ́ Sia,+ ruo El-peran,+ nke dị n’ala ịkpa.
7 Ha wee tụgharịa bịarute En-mishpat, ya bụ, Kedesh,+ wee merie ala dum nke ndị Amalek,+ meriekwa ndị Amọraịt+ bụ́ ndị bi na Hazazọn-tema.+
8 N’oge a, eze Sọdọm zọliri ije, ya na eze Gọmọra na eze Adma na eze Zeboyim na eze Bila (ya bụ, Zoa), ha wee hazie onwe ha n’usoro ibuso ha agha na Ndagwurugwu Sidim,+
9 ibuso Kedọlaoma bụ́ eze Ilam agha, tinyere Taịdal bụ́ eze Goyim na Amrafel bụ́ eze Shaịna nakwa Arịọk bụ́ eze Elesa;+ eze anọ ibuso eze ise agha.
10 Ndagwurugwu Sidim+ jupụtara n’olulu bitumen;+ eze Sọdọm na eze Gọmọra wee gbaa ọsọ ma daba n’ime ha, ma ndị fọdụrụ gbagara n’ógbè bụ́ ugwu ugwu.+
11 Ndị ahụ meririnụ wee bukọrọ ngwongwo niile nke ndị Sọdọm na Gọmọra na ihe oriri ha niile lawa.+
12 Ha kpụkwaara Lọt nwa nwanne Ebram, bukọrọkwa ngwongwo ya lawa. O bi na Sọdọm mgbe ahụ.+
13 E mesịa, otu nwoke nke gbapụrụnụ bịara kọọrọ Ebram bụ́ onye Hibru.+ O bi n’ụlọikwuu mgbe ahụ n’etiti osisi ukwu nke Mamri, onye Amọraịt,+ bụ́ nwanne Eshkọl, bụrụkwa nwanne Ena;+ ha na Ebram nwere nkwekọrịta.
14 Otú ahụ ka Ebram si nụ na a dọọrọ nwanne ya n’agha.+ O wee kpọkọta ndị ikom ya e nyere ọzụzụ,+ bụ́ narị ndị ohu atọ na iri na asatọ a mụrụ n’ezinụlọ ya,+ o wee chụrụ ha ruo Dan.+
15 N’abalị, o kewara ndị agha ya,+ ya bụ, ndị ohu ya, wee buso ha agha, o wee merie ha ma chụrụ ha ruo Hoba, nke dị n’ebe ugwu Damaskọs.
16 O wee napụta ha ngwongwo niile ahụ,+ ọ napụtakwara nwanne ya Lọt na ngwongwo ya niile, tinyere ndị inyom na ndị ọzọ.+
17 Eze Sọdọm wee pụta izute ya mgbe o si n’imeri Kedọlaoma na ndị eze ya na ha so lọta, ruo na Ndagwurugwu Sheve, ya bụ, Ndagwurugwu eze.+
18 Melkizedek+ bụ́ eze Selem+ wee wepụta achịcha na mmanya,+ ya onwe ya bụkwa onye nchụàjà nke Chineke bụ́ Onye Kasị Elu.+
19 O wee gọzie ya, sị:
“Ka Chineke bụ́ Onye Kasị Elu,Onye kere eluigwe na ụwa,+ gọzie Ebram;+
20 Ka Chineke bụ́ Onye Kasị Elu bụrụkwa onye a gọziri agọzi,+Bụ́ onye nyefere ndị na-emegbu gị n’aka gị!”
Ebram wee nye ya otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile.+
21 E mesịa, eze Sọdọm sịrị Ebram: “Kpọnye m mkpụrụ obi,+ ma buru ngwongwo.”
22 Ebram wee si eze Sọdọm: “M na-eweli aka m ṅụọrọ Jehova Chineke bụ́ Onye Kasị Elu, Onye kere eluigwe na ụwa, iyi
23 na agaghị m ewere ihe ọ bụla bụ́ nke gị+ ma ọlị, malite n’eri ruo n’eriri akpụkpọ ụkwụ, ka i wee ghara ịsị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’
24 Ọ dịghị ihe m ga-ewere!+ Ọ bụ naanị ihe ụmụ okorobịa a riri, tinyere òkè ndị ikom a so m gaa, bụ́ Ena, Eshkọl na Mamri+—hapụ ha ka ha were òkè ha.”+