Jenesis 12:1-20
12 Jehova wee sị Ebram: “Si n’obodo gị, n’etiti ndị ikwu gị nakwa n’ụlọ nna gị, kwapụ gaa n’obodo m ga-egosi gị;+
2 m ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu, m ga-agọzikwa gị, m ga-emekwa ka aha gị dị ukwuu; bụrụkwa ngọzi.+
3 M ga-agọzi ndị na-agọzi gị, onye na-akọchakwa gị ka m ga-abụ ọnụ,+ ezinụlọ niile nke ala ga-agọzi onwe ha site na gị.”+
4 Ebram wee gawa dị nnọọ ka Jehova gwara ya, Lọt sokwa ya gawa. Ebram gbara afọ iri asaa na ise mgbe o si Heran kwapụ.+
5 Ebram wee kpọrọ Seraị nwunye ya+ nakwa Lọt nwa nwanne ya,+ buru akụ̀ niile ha kpatara,+ durukwa mkpụrụ obi ha nwetara na Heran, ha wee kwapụ gawa ala Kenan.+ N’ikpeazụ, ha rutere n’ala Kenan.
6 Ebram wee gafere n’ala ahụ ruo na Shikem,+ n’akụkụ osisi ukwu nke More;+ n’oge ahụ ndị Kenan nọ n’ala ahụ.
7 Jehova wee pụta ìhè n’ihu Ebram wee sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị+ ka m ga-enye ala a.”+ E mesịa, o wuuru Jehova, bụ́ onye pụtara ìhè n’ihu ya, ebe ịchụàjà n’ebe ahụ.
8 Mgbe e mesịrị, o si n’ebe ahụ kwaga n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, n’ebe ọwụwa anyanwụ Betel,+ wee maa ụlọikwuu ya, Betel wee dịrị ya n’ebe ọdịda anyanwụ, E-aị+ adịrịkwa n’ebe ọwụwa anyanwụ. O wee wuoro Jehova ebe ịchụàjà n’ebe ahụ,+ malitekwa ịkpọku aha Jehova.+
9 E mesịa, Ebram kwaliri, na-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche iche ka ọ na-aga Negeb.+
10 Ma ụnwụ dara n’ala ahụ, Ebram wee gbadaa Ijipt ka o biri n’ebe ahụ dị ka ọbịa,+ n’ihi na ụnwụ ahụ siri ike n’ala ahụ.+
11 O wee ruo na ozugbo ọ fọrọ ntakịrị ka ọ banye Ijipt, ọ sịrị Seraị nwunye ya: “Biko, amaara m nke ọma na ị bụ nwaanyị mara mma.+
12 Ya mere, ọ ga-erukwa na ndị Ijipt ga-ahụ gị wee sị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Ha ga-egbukwa m, ma ha ga-ahapụ gị ndụ.
13 Biko, kwuo na ị bụ nwanne m nwaanyị,+ ka ihe wee gaziere m n’ihi gị, mkpụrụ obi m ga-adịkwa ndụ n’ihi gị.”+
14 O wee ruo na, ozugbo Ebram banyere n’Ijipt, ndị Ijipt hụrụ nwaanyị ahụ, na ọ mara mma nke ukwuu.
15 Ndị Fero mere ndị isi hụkwara ya, ha wee malite ịja ya mma n’ihu Fero, nke mere na a kpọgara nwaanyị ahụ n’ụlọ Fero.
16 O wee meso Ebram omume n’ụzọ dị mma n’ihi ya, o wee nwee atụrụ na ehi na ịnyịnya ibu na ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi na nne ịnyịnya ibu na kamel.+
17 Jehova wee tie Fero na ezinụlọ ya ihe otiti dị ukwuu+ n’ihi Seraị, nwunye Ebram.+
18 Fero wee kpọọ Ebram wee sị: “Gịnị bụ ihe a i mere m? Gịnị mere ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị?+
19 Gịnị mere i ji sị, ‘Ọ bụ nwanne m nwaanyị,’+ nke mere na ọ fọrọ ntakịrị ka m kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye m? Lee nwunye gị. Kpọrọ ya lawa!”
20 Fero wee nye ndị ikom iwu banyere ya, ha wee dupụ ya na nwunye ya na ihe niile o nwere.+