Jenesis 11:1-32

11  Ụwa niile wee na-asụ otu asụsụ, nweekwa otu usoro okwu.  O wee ruo ka ha nọ na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ na ha mesịrị hụ otu ndagwurugwu* n’ala Shaịna,+ ha wee biri n’ebe ahụ.  Ha wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ngwanụ! Ka anyị kpụọ brik, nụọ ya n’ọkụ.” Ha wee jiri brik mere nkume, ma ha ji bitumen mere ụrọ.+  Ha wee sị: “Ngwanụ! Ka anyị wuoro onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe,+ ka anyị meekwara onwe anyị aha na-ewu ewu,+ ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.”+  Jehova wee gbadaa ka ọ hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ụmụ mmadụ wuru.+  E mesịa, Jehova sịrị: “Lee! Ha bụ otu ndị, ha niile na-asụkwa otu asụsụ,+ nke a bụkwa ihe ha malitere ime. Ugbu a, ọ dịghị ihe ha bu n’obi ime nke ha na-apụghị ime.+  Ngwa! Ka anyị+ gbadaa ghagbuo+ asụsụ ha n’ebe ahụ ka ha wee ghara ịnụ asụsụ ibe ha.”+  Jehova wee mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa dum,+ ha wee kwụsị iwu obodo ahụ.+  Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya Bebel,+ n’ihi na n’ebe ahụ ka Jehova ghagburu asụsụ ụwa dum, Jehova mekwara ka ha si n’ebe ahụ gbasaa+ n’ebe niile n’elu ụwa. 10  Nke a bụ akụkọ banyere Shem.+ Shem gbara otu narị afọ mgbe ọ mụrụ Apakshad,+ afọ abụọ mgbe iju mmiri gasịrị. 11  Mgbe Shem mụsịrị Apakshad, ọ dịrị ndụ narị afọ ise. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.+ 12  Apakshad dịrị ndụ afọ iri atọ na ise. O wee mụọ Shila.+ 13  Mgbe Apakshad mụsịrị Shila, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 14  Shila dịrị ndụ afọ iri atọ. O wee mụọ Iba.+ 15  Mgbe Shila mụsịrị Iba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ. N’oge a, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 16  Iba wee dịrị ndụ ruo afọ iri atọ na anọ. O wee mụọ Pileg.+ 17  Mgbe Iba mụsịrị Pileg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 18  Pileg wee dịrị ndụ ruo afọ iri atọ. O wee mụọ Riu.+ 19  Mgbe Pileg mụsịrị Riu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 20  Riu wee dịrị ndụ ruo afọ iri atọ na abụọ. O wee mụọ Sirọg.+ 21  Mgbe Riu mụsịrị Sirọg, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 22  Sirọg wee dịrị ndụ ruo afọ iri atọ. O wee mụọ Nehọ.+ 23  Mgbe Sirọg mụsịrị Nehọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 24  Nehọ wee dịrị ndụ ruo afọ iri abụọ na itoolu. O wee mụọ Tira.+ 25  Mgbe Nehọ mụsịrị Tira, ọ dịrị ndụ otu narị afọ na iri na itoolu. N’ime oge ahụ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 26  Tira wee dịrị ndụ ruo afọ iri asaa, e mesịa, ọ mụrụ Ebram,+ Nehọ na Heran. 27  Nke a bụ akụkọ banyere Tira. Tira mụrụ Ebram, Nehọ na Heran; Heran wee mụọ Lọt.+ 28  E mesịa, Heran nwụrụ ka ya na Tira nna ya nọ n’ala a mụrụ ya, n’obodo Ọọ+ nke ndị Kaldia.+ 29  Ebram na Nehọ wee lụrụ ndị inyom. Aha nwunye Ebram bụ Seraị,+ aha nwunye Nehọ abụrụ Milka,+ ada Heran, bụ́ nna Milka nakwa nna Iska. 30  Ma Seraị bụ nwaanyị aga;+ ọ mụtaghị nwa. 31  E mesịa, Tira kpọọrọ Ebram nwa ya nakwa Lọt, nwa nwa ya,+ bụ́ nwa Heran, nakwa Seraị+ bụ́ nwunye nwa ya, bụ́ nwunye Ebram nwa ya, ha na ya wee si n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia pụọ gawa ala Kenan.+ Ka oge na-aga, ha bịarutere Heran+ wee biri n’ebe ahụ. 32  Ụbọchị Tira dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ abụọ na ise. Tira wee nwụọ na Heran.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”