Jenesis 10:1-32
10 Nke a bụ akụkọ banyere ụmụ Noa,+ bụ́ Shem, Ham na Jefet.
A malitere ịmụrụ ha ụmụ mgbe iju mmiri ahụ gasịrị.+
2 Ụmụ Jefet bụ Goma+ na Megọg+ na Medaị+ na Jevan+ na Tubal+ na Mishek+ na Taịras.+
3 Ụmụ Goma bụ Ashkenaz+ na Raịfat+ na Togama.+
4 Ụmụ Jevan bụ Elaịsha+ na Tashish,+ Kitim+ na Dodenim.+
5 Ọ bụ site ná ndị a ka ndị bi n’agwaetiti nke mba dị iche iche si gbasaa n’ala ha, nke ọ bụla dị ka asụsụ ya si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, ná mba ná mba.
6 Ụmụ Ham bụ Kush+ na Mizrem+ na Pọt+ na Kenan.+
7 Ụmụ Kush bụ Siba+ na Havila na Sabta na Reama+ na Sabteka.
Ụmụ Reama abụrụ Shiba na Didan.+
8 Kush wee mụọ Nimrọd.+ Ọ bụ ya bụ onye mbụ ghọrọ dike n’ụwa.
9 Ọ bụ dinta dị ike nke na-emegide Jehova. Ọ bụ ya mere e ji ekwu, sị: “Dị nnọọ ka Nimrọd bụ́ dinta dị ike nke na-emegide Jehova.”+
10 Alaeze ya malitere na Bebel+ na Irek+ na Akad na Kalne, ndị dị n’ala Shaịna.+
11 O si n’ala ahụ banye n’Asiria+ wee malite iwu Ninive+ na Rehobọt-Iye na Kela
12 na Risen nke dị n’agbata Ninive na Kela: ọ bụ nke a bụ obodo ukwu ahụ.
13 Mizrem+ wee mụọ Ludim+ na Anamim na Lehebim na Naftuhim+
14 na Patrusim+ na Kasluhim+ (onye ọ bụ n’agbụrụ ya ka ndị Filistia+ si pụta) nakwa Kaftorim.
15 Kenan wee mụọ Saịdọn+ bụ́ ọkpara ya, mụọkwa Het+
16 na ndị Jibọs+ na ndị Amọraịt+ na ndị Gegash
17 na ndị Haịvaịt na ndị Akaịt na ndị Saịnaịt
18 na ndị Avad+ na ndị Zemaraịt na ndị Hemat;+ e mesịa, ezinụlọ dị iche iche nke ndị Kenan gbasasịrị.
19 Ókè nke ala ndị Kenan wee malite na Saịdọn ruo Gira,+ nke dị nso na Geza,+ ruo Sọdọm na Gọmọra+ na Adma na Zeboyim,+ nke dị nso na Lesha.
20 Ndị a bụ ụmụ Ham n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka asụsụ ha si dị, n’ala ha dị iche iche, ná mba ná mba.
21 A mụkwaara Shem, nwanne Jefet bụ́ ọkpara, ụmụ, ọ bụ ya bụ nna nna nke ụmụ Iba+ niile.
22 Ụmụ Shem bụ Ilam+ na Ashọ+ na Apakshad+ na Lọd na Eram.
23 Ụmụ Eram bụ Ọz na Họl na Gita na Mash.+
24 Apakshad wee mụọ Shila,+ Shila wee mụọ Iba.
25 A mụụrụ Iba ụmụ abụọ. Aha otu bụ Pileg,+ n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ya ka e kewara ụwa;+ aha nwanne ya bụ Jọktan.+
26 Jọktan wee mụọ Almodad na Shilef na Hezamevet na Jira+
27 na Hedoram na Yuzal na Dikla+
28 na Obal na Abimael na Shiba+
29 na Ofa+ na Havila+ na Jobab;+ ndị a niile bụ ụmụ Jọktan.
30 Ebe obibi ha malitere na Misha ruo Sifa, bụ́ ógbè Ebe Ọwụwa Anyanwụ bụ́ ugwu ugwu.
31 Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Shem n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka asụsụ ha si dị, n’ala ha dị iche iche, ná mba ná mba.+
32 Ọ bụ ndị a bụ ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Noa dị ka agbụrụ ezinụlọ ha si dị, ná mba ná mba, ọ bụkwa site na ha ka mba dị iche iche gbasara n’ụwa mgbe iju mmiri ahụ gasịrị.+