Jenesis 1:1-31

1  Ná mmalite,+ Chineke+ kere+ eluigwe na ụwa.+  Ma ọ dịghị ihe dị n’ụwa, ọ tọgbọ n’efu, ọchịchịrị gbakwara n’elu ogbu mmiri;+ ike Chineke nke nọ n’ọrụ nọkwa na-erugharị+ n’elu mmiri ahụ.+  Chineke wee sị:+ “Ka ìhè dị.” Ìhè wee dị.+  E mesịa, Chineke hụrụ na ìhè ahụ dị mma, Chineke wee kpaa ókè n’agbata ìhè ahụ na ọchịchịrị ahụ.+  Chineke wee kpọọ ìhè ahụ Ehihie,+ ma ọ kpọrọ ọchịchịrị ahụ Abalị.+ E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke mbụ.  Chineke wee sị: “Ka e nwee mbara+ n’agbata mmiri ahụ, ka e kewaakwa mmiri na mmiri.”+  Chineke wee mee mbara ahụ ma kpaa ókè n’agbata mmiri ahụ nke gaje ịdị n’okpuru mbara ahụ na mmiri ahụ nke gaje ịdị n’elu mbara ahụ.+ O wee dị otú ahụ.  Chineke wee kpọọ mbara ahụ Eluigwe.+ E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke abụọ.  Chineke wee sị: “Ka e mee ka mmiri ahụ nke dị n’okpuru eluigwe sọkọta ọnụ n’otu ebe, ka ala akọrọ pụtakwa.”+ O wee dị otú ahụ. 10  Chineke wee kpọọ ala akọrọ ahụ Elu Ala,+ ma ọ kpọrọ mmiri ahụ sọkọtara ọnụ Oké Osimiri.+ Chineke hụkwara na ọ dị mma.+ 11  Chineke wee sị: “Ka ala pupụta ahịhịa, ahịhịa ndụ ndị na-amị mkpụrụ,+ osisi ndị na-amị mkpụrụ, bụ́ ndị mkpụrụ+ ha dị n’ime ha, n’ụdị ha dị iche iche,+ n’elu ụwa.” O wee dị otú ahụ. 12  Ala wee malite ipupụta ahịhịa, ahịhịa ndụ nke na-amị mkpụrụ n’ụdị ya dị iche iche+ nakwa osisi ndị na-amị mkpụrụ nke mkpụrụ ya dị n’ime ya, n’ụdị ya dị iche iche.+ Chineke wee hụ na ọ dị mma. 13  E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke atọ. 14  Chineke wee sị: “Ka e nwee ihe ndị na-enye ìhè na mbara eluigwe iji kpaa ókè n’agbata ehihie na abalị;+ ha ga-abụ ihe ịrịba ama na ihe e ji agụ oge na ụbọchị na afọ.+ 15  Ha ga-abụkwa ihe na-enye ìhè bụ́ ndị ga-adị na mbara eluigwe iji na-enye ìhè n’elu ụwa.”+ O wee dị otú ahụ. 16  Chineke wee mee nnukwute ihe abụọ na-enye ìhè, o mere ihe ka ukwuu nke na-enye ìhè ka ọ na-achị ehihie, meekwa ihe ka nta nke na-enye ìhè ka ọ na-achị abalị, o mekwara kpakpando dị iche iche.+ 17  Chineke wee debe ha na mbara eluigwe ka ha na-enye ìhè n’elu ụwa,+ 18  nakwa ka ha na-achị ehihie na abalị nakwa ka ha na-akpa ókè n’agbata ìhè na ọchịchịrị.+ Chineke wee hụ na ọ dị mma.+ 19  E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke anọ. 20  Chineke wee sị: “Ka mmiri nupụta ìgwè mkpụrụ obi dị ndụ,+ ka anụ ufe na-efegharịkwa n’elu ụwa n’ihu mbara eluigwe.”+ 21  Chineke wee kee nnukwute anụ mmiri+ na mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke na-agagharị agagharị,+ bụ́ ndị mmiri nupụtara n’ụdị ha dị iche iche, nakwa anụ ufe ọ bụla nwere nku n’ụdị ya dị iche iche.+ Chineke wee hụ na ọ dị mma. 22  Chineke wee gọzie ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụtanụ mmiri dị n’oké osimiri,+ ka anụ ufe baakwa ụba n’ụwa.” 23  E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke ise. 24  Chineke wee sị: “Ka ala+ wepụta mkpụrụ obi dị ndụ n’ụdị ha dị iche iche, anụ ụlọ+ na anụ ndị ọzọ na-agagharị agagharị+ na anụ ọhịa+ nke ụwa n’ụdị ya dị iche iche.” O wee dị otú ahụ. 25  Chineke wee mee anụ ọhịa nke ụwa n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ụlọ n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ọ bụla ọzọ na-agagharị agagharị nke ala n’ụdị ya dị iche iche.+ Chineke wee hụ na ọ dị mma. 26  Chineke wee sị: “Ka anyị+ mee mmadụ n’onyinyo anyị,+ dị ka oyiyi anyị si dị,+ ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na anụ ụlọ nakwa ụwa dum na anụ ọ bụla ọzọ nke na-agagharị agagharị, bụ́ nke na-agagharị n’elu ala,+ nọrọ n’okpuru ya.” 27  Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya;+ nwoke na nwaanyị ka o kere ha.+ 28  Chineke gọzikwara ha,+ Chineke wee sị ha: “Mụọnụ ọmụmụ,+ baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu,+ ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”+ 29  Chineke wee sị: “Lee, enyewo m unu ahịhịa ndụ niile na-amị mkpụrụ bụ́ ndị dị n’elu ala dum nakwa osisi ọ bụla nke na-amị mkpụrụ a na-akụ akụ.+ Ka ọ bụrụ ihe oriri unu.+ 30  Anụ ọhịa ọ bụla nke ụwa nakwa anụ ufe ọ bụla nke eluigwe na ihe ọ bụla na-agagharị n’elu ala nke dị ndụ dị ka mkpụrụ obi ka m nyeworo akwụkwọ ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.”+ O wee dị otú ahụ. 31  E mesịa, Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.+ E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke isii.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji