Ilu 25:1-28
25 Ilu ndị a kwa bụ ilu Sọlọmọn,+ nke ndị ikom Hezekaya eze Juda+ depụtara:
2 Otuto Chineke bụ izobe okwu,+ ùgwù ndị eze bụ inyocha okwu nke ọma.+
3 Dị ka eluigwe dị n’elu elu,+ ụwa adịrịkwa n’ala ala,+ otú ahụ ka obi ndị eze dị, a pụghị inyochapụta ya enyochapụta.+
4 E wepụsịa ifurifu ọla n’ọlaọcha, ha dum ga-aghọ nke a nụchara anụcha.+
5 E si n’ihu eze kpọpụ onye ajọ omume,+ ocheeze ya ga-eguzosi ike n’ezi omume.+
6 Achọla nsọpụrụ n’ihu eze,+ eguzokwala n’ebe dịịrị ndị ukwu.+
7 N’ihi na ọ dị mma ka ọ sị gị: “Gbagote ebe a,”+ karịa iweda gị ala n’ihu onye a ma ama, bụ́ onye anya gị hụrụ.+
8 Ejila ọkụ ọkụ akpọ mmadụ ikpe, ka ọ ghara ịbụ na n’ikpeazụ, gị echewe ihe ị ga-eme mgbe mmadụ ibe gị menyere gị ihere.+
9 Gị na mmadụ ibe gị kpezie okwu,+ ekpughekwala okwu nzuzo onye ọzọ;+
10 ka onye na-anụ ya wee ghara imenye gị ihere, ị pụghịkwa ime ka ihe ọjọọ ị kọrọ lọghachite.
11 Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.+
12 Ọla ntị e ji ọlaedo mee, na ihe ịchọ mma ọlaedo nke pụrụ iche, ka onye ji amamihe na-enye ịdọ aka ná ntị bụ ná ntị nke na-anụ ihe.+
13 Dị nnọọ ka snoo na-ajụ oyi n’ahụ́+ n’ụbọchị owuwe ihe ubi, otú ahụ ka onye ozi kwesịrị ntụkwasị obi dị n’ebe ndị zigara ya nọ, n’ihi na ọ na-eme ka mkpụrụ obi ndị nna ya ukwu nweta ume.+
14 Dị ka ígwé ojii rujuru eruju na ifufe nke na-ezoghị mmiri, otú ahụ ka onye na-etu ọnụ banyere onyinye ụgha dị.+
15 Ndidi ka a na-eji akpali ọchịagha ime ihe, ire dị nro pụkwara ịgbaji ọkpụkpụ.+
16 Ọ̀ bụ mmanụ aṅụ ka i nwetara?+ Rachaa nke ga-ezuru gị, ka ị ghara ịrachabiga ya ókè wee gbọpụta ya.+
17 Mee ka ụkwụ gị kọọ ụkọ n’ụlọ mmadụ ibe gị, ka ị ghara ịgbụ ya, o wee kpọ gị asị.
18 Dị ka okpiri e ji alụ agha na mma agha nakwa akụ́ a pịrị apị, otú ahụ ka onye na-agbagide mmadụ ibe ya akaebe ụgha dị.+
19 Dị ka ezé gbajiri agbaji na ụkwụ na-ama jijiji, otú ahụ ka ịtụkwasị onye aghụghọ obi na-adị n’ụbọchị ahụhụ.+
20 Onye na-eyipụ uwe n’ụbọchị oyi yiri mmanya gbara ụka e tinyere akanwụ, yiekwa ọbụ abụ nke na-abụrụ onye nwere obi mwute abụ.+
21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye kpọrọ gị asị, nye ya nri ka o rie; ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.+
22 N’ihi na ọ bụ icheku ọkụ ka ị na-awụkwasị n’isi ya,+ ọ bụkwa Jehova ga-akwụ gị ụgwọ.+
23 Ifufe nke si n’ebe ugwu na-amụpụta oké mmiri ozuzo dị ka à ga-asị na ime mere ya;+ ire nke na-ekpughe ihe nzuzo na-akpatakwa ihu a kọchara akọcha.+
24 Ọ dị mma mmadụ ibi na nkuku elu ụlọ karịa ya na nwaanyị na-ese okwu ibi, n’agbanyeghị na ọ bụ n’ụlọ buru ibu.+
25 Dị ka mmiri jụrụ oyi si adị mkpụrụ obi ike gwụrụ,+ otú ahụ ka akụkọ ọma nke si n’ala dị anya na-adị.+
26 Isi iyi a gbarụrụ agbarụ na olulu mmiri e mebiri emebi ka onye ezi omume bụ mgbe ọ na-ama jijiji n’ihu onye ajọ omume.+
27 Ịrachabiga mmanụ aṅụ ókè adịghị mma;+ ndị mmadụ ịchọrọ onwe ha otuto ọ̀ bụ otuto?+
28 Dị ka obodo e tidara etida nke na-enweghị mgbidi, otú ahụ ka onye na-adịghị ejide mmụọ ya dị.+