Ilu 22:1-29
22 Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu;+ amara dị mma karịa ọbụna ọlaọcha na ọlaedo.+
2 Ọgaranya na ogbenye ezutewo.+ Onye kere ha niile bụ Jehova.+
3 Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo,+ ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.+
4 Ihe ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova na-arụpụta bụ akụnụba na otuto na ndụ.+
5 Ogwu na ọnyà dị n’ụzọ onye gbagọrọ agbagọ;+ onye na-eche mkpụrụ obi ya nche na-anọ ha n’ebe dị anya.+
6 Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị;+ ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.+
7 Ọ bụ ọgaranya na-achị ndị dara ogbenye,+ onye gbaziiri ihe bụkwa ohu onye gbazinyere ya ihe.+
8 Onye na-akụ ajọ omume dị ka mkpụrụ ga-aghọrọ ihe ọjọọ,+ ma mkpanaka nke oké iwe ya ga-ala n’iyi.+
9 Onye anya ya na-eme ebere ka a ga-agọzi, n’ihi na o nyetụwo onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nri ya.+
10 Chụpụ onye na-akwa emo ka esemokwu laa, ka okwu ikpe na mmechuihu kwụsịkwa.+
11 Onye hụrụ ịdị ọcha n’obi n’anya+—eze ga-abụ enyi ya n’ihi amara nke egbugbere ọnụ ya.+
12 Anya Jehova echekwawo ihe ọmụma,+ ma ọ na-emebi okwu onye aghụghọ.+
13 Onye umengwụ asịwo:+ “Ọdụm nọ n’èzí!+ Ọ ga-adọgbu m n’etiti ámá obodo!”
14 Ọnụ ndị inyom na-akwa iko* bụ olulu miri emi.+ Onye Jehova mara ikpe ga-adaba n’ime ya.+
15 Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata;+ ọ bụ ụtarị ịdọ aka ná ntị ga-ewepụ ya n’ebe dị anya n’ebe ọ nọ.+
16 Onye na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya iji nweta ọtụtụ ihe,+ na onye na-enye ọgaranya ihe, aghaghị ịda ogbenye.+
17 Tọọ ntị n’ala nụrụ okwu ndị maara ihe,+ ka i wee tinye obi gị n’ihe ọmụma m.+
18 N’ihi na ọ dị ụtọ ma ọ bụrụ na i mee ka ha dịrị n’ime afọ gị,+ ka ha niile wee dịrịsie ike n’egbugbere ọnụ gị.+
19 M nyewo gị ihe ọmụma taa, ee, gị onwe gị, ka obi ike gị wee dị n’ebe Jehova nọ.+
20 Ọ̀ bụ na mụ edeghịrị gị okwu ndụmọdụ na nke ihe ọmụma n’oge gara aga,+
21 iji gosi gị izi ezi nke okwu bụ́ eziokwu, ka i wee gaa kọọrọ onye zitere gị okwu bụ́ eziokwu?+
22 Apụnarala onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe n’ihi na ọ bụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ echikwala onye nọ n’ahụhụ n’ọnụ ụzọ ámá ọnụ n’ala.+
23 N’ihi na Jehova ga-ekpechitere ha ọnụ ha,+ ọ ga-anapụkwa ndị na-apụnara ha ihe mkpụrụ obi ha.+
24 Abụla enyi onye ọ bụla nke na-ewekarị iwe;+ gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpakọrịtala,
25 ka ị ghara ịmụta ụzọ ya wee wetara mkpụrụ obi gị ọnyà.+
26 Abụla otu n’ime ndị na-ekwerịta n’aka,+ ndị na-ana mmadụ n’ibé ka ha gbaziri ihe.+
27 Ọ bụrụ na i nweghị ihe ị ga-akwụ, gịnị mere ọ ga-eji buru ihe ndina i dina n’elu ya?
28 Ewelala ókè ala a kpara kemgbe ogologo oge azụ, nke nna nna gị hà kpara.+
29 Ị̀ hụwo onye nwere nkà n’ọrụ ya? Ọ bụ n’ihu ndị eze ka ọ ga-eguzo;+ ọ gaghị eguzo n’ihu ndị nkịtị.