Ilu 19:1-29
19 Onye ọ bụla nke dara ogbenye, nke na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe, ka onye egbugbere ọnụ ya gbagọrọ agbagọ mma,+ kakwa onye nzuzu mma.+
2 Ọ dịghị mma ma ọ bụrụ na mkpụrụ obi enweghị ihe ọmụma,+ onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-emekwa mmehie.+
3 Ọ bụ nzuzu mmadụ na-agbagọ ụzọ ya,+ obi ya ewee na-eweso Jehova oké iwe.+
4 Akụ̀ na-eme ka mmadụ nwee ọtụtụ enyi,+ ma a na-ekewapụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya n’ebe enyi ya nọ.+
5 Onye akaebe ụgha agaghị agbanahụ ntaramahụhụ,+ onye na-ekupụkwa okwu ụgha dị ka ume agaghị alanahụ.+
6 Ndị na-eme ka obi onye a ma ama jụrụ dị ọtụtụ,+ mmadụ niile bụkwa enyi onye na-enye onyinye.+
7 Ụmụnne niile nke onye dara ogbenye akpọwo ya asị.+ Lezienụ ka ndị enyi ya si nọrọ ya n’ebe dị ezigbo anya!+ Ọ kpụ okwu n’ọnụ chụrụ ha na-aga; ha anọghị ya.+
8 Onye na-enweta ezi uche+ hụrụ mkpụrụ obi nke ya n’anya. Onye na-eche nghọta nche ga-enweta ihe ọma.+
9 Onye akaebe ụgha agaghị agbanahụ ntaramahụhụ,+ onye na-ekupụkwa okwu ụgha dị ka ume ga-ala n’iyi.+
10 Ndụ ọgaranya ekwesịghị onye ọ bụla dị nzuzu,+ ma ya fọdụzie ohu ịchị ndị isi!+
11 Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ,+ ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.+
12 Ọnụma eze bụ mbigbọ yiri nke nwa ọdụm tojuru etoju,+ ma amara ya na-adị ka igirigi nke dara n’elu ahịhịa ndụ.+
13 Nwa nzuzu bụụrụ nna ya nhụjuanya,+ iseokwu nwunye dịkwa ka elu ụlọ na-ehi mmiri, nke na-achụpụ mmadụ n’ụlọ.+
14 Ihe nketa nke na-esi n’aka nna bụ ụlọ na akụ̀,+ ma nwaanyị nke nwere uche na-esi n’aka Jehova.+
15 Umengwụ na-eme ka oké ụra buru mmadụ,+ mkpụrụ obi nke dị umengwụ na-anọkwa agụụ.+
16 Onye na-edebe ihe e nyere n’iwu na-edebe mkpụrụ obi ya;+ a ga-egbu onye na-eleghara ụzọ ya anya.+
17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe,+ Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.+
18 Nye nwa gị ntaramahụhụ mgbe olileanya ka dị;+ ekwekwala ka igbu ya gụọ mkpụrụ obi gị agụụ.+
19 Onye oké ọnụma ka a ga na-eri iwu;+ n’ihi na ọ bụrụ na ị gbapụta ya, ị ga na-eme ya ugboro ugboro.+
20 Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị,+ ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.+
21 Atụmatụ ndị dị n’obi mmadụ dị ọtụtụ,+ ma, ọ bụ nzube Jehova ga-eguzosi ike.+
22 Ihe a na-achọsi ike n’ime mmadụ bụ obiọma* ya;+ onye dara ogbenye kakwa onye ụgha mma.+
23 Ịtụ egwu Jehova na-eduba ná ndụ,+ mmadụ ga-enwekwa afọ ojuju mgbe ọ na-arahụ ụra abalị;+ ihe ọjọọ agaghị abịara ya.+
24 Onye umengwụ amanyewo aka ya n’ime efere nri;+ ọ pụghị iweghachite ya ọbụna n’ọnụ ya.+
25 I kwesịrị iti onye na-akwa emo ihe,+ ka onye na-amaghị ihe wee mara ihe;+ e kwesịkwara ịbara onye na-aghọta ihe mba, ka o wee nweta ihe ọmụma.+
26 Onye na-emegbu nna ya, nke na-achụpụkwa nne ya,+ bụ nwa nke na-emenye mmadụ ihere, na-emechukwa mmadụ ihu.+
27 Nwa m, ọ bụrụ na ị kwụsị ịnụrụ ịdọ aka ná ntị, ọ ga-abụ isi n’okwu nwere ihe ọmụma kpafuo.+
28 Onye akaebe nke na-abaghị n’ihe na-akwa ikpe ziri ezi emo,+ ọnụ ndị ajọ omume na-elodakwa ihe ọjọọ.+
29 A ghaghị ikpe ndị na-akwa emo ikpe,+ ụtarị bụkwa maka azụ ndị nzuzu.+