Ezikiel 34:1-31

34  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, buo amụma ihe a ga-eme ndị ọzụzụ atụrụ Izrel. Buo amụma, gwa ha, ya bụ, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ahụhụ ga-adịrị ndị ọzụzụ atụrụ Izrel,+ bụ́ ndị ghọworo ndị na-azụ onwe ha!+ Ọ́ bụghị ìgwè atụrụ ka ndị ọzụzụ atụrụ kwesịrị ịzụ?+  Unu na-eri abụba ha,+ ọ bụkwa ajị ha ka unu ji eme uwe unu. Atụrụ nke mara abụba+ ka unu na-egbu.+ Unu adịghị enye ìgwè atụrụ ahụ nri.  Unu adịghị eme ka ndị nke ike gwụrụ dị ike.+ Unu adịghị agwọ ndị nke ahụ́ na-adịghị ike, unu adịghịkwa eke ọkpụkpụ gbajiri agbaji ákwà. Unu adịghị akpọghachite ndị nke a chụsara achụsa, unu adịghịkwa achọ atụrụ ndị nke furu efu.+ Kama unu ejiriwo obi ịta mmiri na-achị ha n’aka ike.+  Ha ji nke nta nke nta gbasasịa n’ihi na e nweghị onye na-azụ ha.+ Ha wee ghọọrọ anụ ọhịa niile nri, ha na-agbasasịkwa.+  Atụrụ m wee na-akpafu n’ugwu ukwu niile nakwa n’ugwu ọ bụla dị elu;+ atụrụ m+ gbasasịkwara n’elu ala dum, n’enweghị onye ọ bụla na-ajụ ajụjụ ha, n’enweghịkwa onye ọ bụla na-achọ ha.  “‘“Ya mere, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu Jehova,  ‘“Dị nnọọ ka m dị ndụ,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, “ebe ọ bụ na atụrụ m ghọrọ ihe a na-achịkọrọ n’ike, atụrụ m wee na-abụrụ anụ ọhịa ọ bụla nri, n’ihi na ha enweghị onye na-azụ ha, ndị ọzụzụ atụrụ m achọgharịghị atụrụ m, kama ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nọ na-azụ onwe ha,+ ha azụghịkwa atụrụ m,”’  ya mere, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu Jehova. 10  Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m na-emegide ndị ọzụzụ atụrụ.+ M ga-ajụta atụrụ m n’aka ha, meekwa ka ha kwụsị ịzụ atụrụ m.+ Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ agakwaghị azụ onwe ha.+ M ga-anapụtakwa atụrụ m n’ọnụ ha, ha agaghịkwa abụrụ ha nri.’”+ 11  “‘N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee m, mụ onwe m ga-achọta atụrụ m wee lekọta ha.+ 12  Dị ka onye na-azụ ìgwè atụrụ ya si elekọta ha+ n’ụbọchị ọ nọ n’etiti atụrụ ya ndị gbasara agbasa,+ otú ahụ ka m ga-elekọta atụrụ m. M ga-anapụtakwa ha n’ebe niile a chụsasịrị ha n’ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.+ 13  M ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kpọpụta ha,+ sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha wee kpọbata ha n’ala ha,+ zụọkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel, n’akụkụ ọwa mmiri nakwa n’ebe obibi niile nke ala ha.+ 14  N’ebe ịta nri dị mma ka m ga-azụ ha, ọ bụkwa n’ugwu ndị dị elu n’Izrel ka ebe obibi ha ga-adị.+ N’ebe ahụ ka ha ga-amakpuru n’ebe obibi dị mma,+ n’ebe ịta nri nke jupụtara n’ahịhịa ka ha ga na-ata nri n’ugwu ndị dị n’Izrel.” 15  “‘“Mụ onwe m ga-azụ atụrụ m,+ m ga-emekwa ka ha makpuru amakpuru,”+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 16  “M ga-achọ nke furu efu,+ ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka m ga-edughachite. M ga-eke ọkpụkpụ gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ahụ́ na-adịghị ike dịrị ike. Ma, m ga-ala nke mara abụba+ na nke dị ike n’iyi. M ga-eji ikpe nyejuo ya afọ.”+ 17  “‘Ma unu onwe unu bụ́ atụrụ m, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-ekpe ikpe n’etiti otu atụrụ na ibe ya, n’etiti ebule na mkpi.+ 18  Ọ̀ bụụrụ unu ntakịrị ihe na unu na-ata nri n’ebe ịta nri kasị mma+ ma jiri ụkwụ unu na-azọtọsị ebe ịta nri nke fọdụrụnụ, na-aṅụkwa mmiri dị ọcha, ma mmiri nke fọdụrụ ka unu na-eji ụkwụ unu gbarụọ? 19  Ọ̀ dị mma ka atụrụ m taa nri n’ebe ịta nri nke ụkwụ unu zọtọsịrị, ṅụọkwa mmiri unu ji ụkwụ unu gbarụọ?” 20  “‘Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ha: “Lee, mụ onwe m ga-ekpe ikpe n’etiti atụrụ mara abụba na atụrụ tara ahụ́, 21  n’ihi na unu ji akụkụ unu na ubu unu na-enu ha, na-asọkwa ndị niile ike gwụrụ mpi ruo mgbe unu chụpụsịrị ha n’èzí.+ 22  M ga-azọpụta atụrụ m, ha agakwaghị abụ ihe a ga-achịkọrọ n’ike;+ m ga-ekpekwa ikpe n’etiti otu atụrụ na ibe ya. 23  M ga-enyekwa ha otu onye ọzụzụ atụrụ,+ bụ́ ohu m Devid,+ ọ ga-azụkwa ha. Ya onwe ya ga-azụ ha, ya onwe ya ga-abụkwa onye na-azụ ha.+ 24  Mụ onwe m, Jehova, ga-abụ Chineke ha,+ ohu m Devid ga-abụkwa onyeisi n’etiti ha.+ Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya. 25  “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo,+ m ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa ghara ịdịkwa n’ala ha,+ ha ga-ebikwa n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.+ 26  M ga-eme ka ha na ebe niile gbara ugwu m gburugburu bụrụ ihe a gọziri agọzi,+ m ga-emekwa ka mmiri zoo n’oge ya. A ga-enwe mmiri ozuzo nke ngọzi.+ 27  Osisi ndị dị n’ọhịa ga-amị mkpụrụ,+ ala ha ga-emepụtakwa ihe nke ọma,+ ha ga-anọkwa n’ala ha n’obi iru ala.+ Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m gbajiri osisi yok+ ha wee napụta ha n’aka ndị ji ha na-agba ohu.+ 28  Ha agaghị abụkwa ihe mba dị iche iche ga-achịkọrọ n’ike.+ Anụ ọhịa nke ụwa agaghị eripịa ha. Ha ga-ebikwa n’obi iru ala. Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.+ 29  “‘“M ga-eme ka ha nwee ubi na-ede ude,+ ha agakwaghị abụ ndị ụnwụ ga-achụpụ n’ala ha,+ ha agakwaghị abụ ndị mba dị iche iche ga-eweda n’ala.+ 30  ‘Ha ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova Chineke ha, nọnyeere ha,+ na ha bụkwa ndị m, bụ́ ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”’+ 31  “‘Ma unu onwe unu bụ́ atụrụ m,+ atụrụ m na-eduga n’ebe ịta nri, unu bụ ụmụ mmadụ. Abụ m Chineke unu,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji