Ezikiel 26:1-21

26  O wee ruo n’afọ nke iri na otu, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, na okwu Jehova ruru m ntị, sị:  “Nwa nke mmadụ, ebe ọ bụ na Taya sịrị Jeruselem+ ‘Ntọọ! E tiwaala ya,+ ya bụ, ibo ụzọ nke ndị dị iche iche!+ A ga-echezi ihu n’ebe m nọ. Ihe ga-ejupụta n’ime m—a lawo ya n’iyi,’+  ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m na-emegide gị, Taya, m ga-akpọtakwa ọtụtụ mba ka ha buso gị agha,+ dị nnọọ ka a na-enwe ebili mmiri n’oké osimiri.+  Ha ga-ala mgbidi Taya n’iyi,+ kwatuokwa ụlọ elu ya niile,+ m ga-ekpopụ ájá dị na ya, meekwa ka ọ bụrụ elu nkume nke na-akwọ mụrụmụrụ.  Ebe a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ+ ka ọ ga-aghọ n’etiti oké osimiri.’+ “‘N’ihi na mụ onwe m ekwuwo ya,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘mba dị iche iche ga-ebukọrọ ihe dị n’ime ya.  Obodo nta ndị dị n’ala ya—a ga-eji mma agha laa ha n’iyi, ndị mmadụ ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+  “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-esi n’ebe ugwu kpọta Nebukadreza eze Babịlọn,+ bụ́ eze ndị eze,+ ya na ọtụtụ ịnyịnya+ na ụgbọ ịnyịnya agha+ na ndị agha ịnyịnya na ìgwè mmadụ,+ bụ́ oké ìgwè mmadụ, ka ha buso Taya agha.  Ọ ga-eji mma agha laa obodo nta niile dị n’ala gị n’iyi. Ọ ga-ewukwa mgbidi nnọchibido, maa ékpè,+ buliekwa ọta ukwu wee buso gị agha;  ọ ga-eji ngwá agha ya lụso mgbidi gị ọgụ, ọ ga-ejikwa mma agha kwatuo ụlọ elu gị niile. 10  N’ihi ọsọ ịnyịnya ya na-awụ, uzuzu ha ga-ekpuchi gị.+ N’ihi mkpọtụ nke onye agha ịnyịnya na ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha na-eme, mgbidi gị ga-ama jijiji, mgbe o si n’ọnụ ụzọ ámá gị na-abata, dị ka mgbe a batara n’obodo nke a kwaturu mgbidi ya. 11  Ọ ga-eji akpụkpọ ụkwụ ịnyịnya ya zọtọsịa okporo ámá gị niile.+ Ọ ga-ejikwa mma agha gbuo ndị gị. Ogidi gị ndị mere ka i sie ike ga-adaru ala. 12  Ha ga-akwakọrọkwa akụ̀+ gị ma bukọrọ ngwá ahịa gị,+ tidaa mgbidi gị, kwatuokwa ụlọ ọma gị niile. Ha ga-awụnye nkume gị na osisi e ji wuo gị na ájá gị n’ime mmiri.’ 13  “‘M ga-emekwa ka oké mkpọtụ nke ịbụ abụ gị kwụsị,+ a gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ.+ 14  M ga-emekwa ka ị bụrụ elu nkume nke na-akwọ mụrụmụrụ.+ Ị ga-aghọkwa ebe a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ.+ A gaghị ewughachi gị ma ọlị; n’ihi na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ 15  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara Taya, ‘Mgbe a nụrụ ụda ọdịda gị, mgbe onye e merụrụ ahụ́ nke ukwuu na-asụ ude, mgbe e gburu mmadụ n’ime gị, ọ̀ bụ na agwaetiti dị iche iche agaghị ama jijiji?+ 16  Ndị isi niile nke oké osimiri ga-esi n’ocheeze+ ha rịdata+ ma yipụ uwe elu ha na-enweghị aka, ha ga-eyipụkwa uwe ha ndị a kpara ihe. Ha ga-eyirikwa uwe ịma jijiji. Ha ga-anọdụ ọdụ n’ala nkịtị,+ ha ga na-amakwa jijiji mgbe niile+ ma kporopụ anya na-ele gị. 17  Ha ga-abụkwa abụ iru uju+ banyere gị ma sị gị: “‘“Lee ka i si laa n’iyi, gị obodo nke bụ́ ebe ndị si n’oké osimiri bịa bibu,+ gị obodo a na-enye otuto, nke ghọrọ obodo siri ike n’oké osimiri,+ ya na ndị bi n’ime ya, ndị menyere ndị niile bi n’ụwa oké ụjọ! 18  Agwaetiti dị iche iche ga-ama jijiji n’ụbọchị ị ga-ada. Agwaetiti niile dị n’oké osimiri ga-eme mkpatụ n’ihi ọpụpụ gị.”’+ 19  N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Mgbe m ga-eme ka ị bụrụ obodo a lara n’iyi, dị ka obodo mmadụ na-ebighị, mgbe m ga-eme ka ogbu mmiri kpuchie gị, mmiri dị ukwuu ga-ekpuchiworị gị,+ 20  m ga-emekwa ka ị daa, gị na ndị na-agbada n’olulu, bụ́ ebe ndị oge ochie nọ,+ m ga-emekwa ka ị nọrọ n’ime ime ala,+ dị ka ebe a laworo n’iyi ruo ogologo oge, gị na ndị na-agbada n’olulu,+ ka onye ọ bụla ghara ibi n’ime gị; m ga-etinye ihe ịchọ mma n’ala ndị dị ndụ.+ 21  “‘M ga-eme ka ihe ụjọ mberede bịakwasị gị,+ ị gaghị adịkwa ọzọ; a ga-achọsi gị ike,+ ma a gaghị ahụkwa gị ruo mgbe ebighị ebi,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji