Esta 8:1-17
8 N’ụbọchị ahụ, Eze Ahazuirọs nyefere Esta nwunye ya ụlọ Heman,+ bụ́ onye na-ebuso ndị Juu iro;+ Mọdekaị wee bata n’ihu eze, n’ihi na Esta ekwuwo ihe jikọrọ ya na ya.+
2 Eze wee gbapụta mgbaaka ya e ji aka ihe akara+ bụ́ nke ọ napụtara Heman wee nye ya Mọdekaị; Esta wee mee Mọdekaị onyeisi ụlọ Heman.+
3 Esta kwukwara okwu ọzọ n’ihu eze ma daa n’ala n’ihu ya kwaa ákwá, rịọkwa+ amara ya ka o wezụga ihe ọjọọ+ nke Heman onye agbụrụ Egag nakwa nkata ọ kpara+ megide ndị Juu.+
4 Eze wee setịara Esta mkpanaka ọlaedo ya,+ Esta wee bilie gaa guzoro n’ihu eze.
5 O wee sị: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị eze,+ ọ bụrụkwa na nke a kwesịrị ekwesị n’ihu eze, ọ bụrụkwa na m dịkwa mma n’anya ya, ka e dee ya ede iji kagbuo ihe ahụ e dere n’akwụkwọ,+ bụ́ nkata ahụ Heman nwa Hamedeta, onye agbụrụ Egag,+ kpara, nke o dere iji bibie ndị Juu+ bi n’ógbè niile eze na-achị.+
6 N’ihi na olee otú m ga-esi agbachi nkịtị nọrọ na-ekiri ọdachi ga-adakwasị ndị m, oleekwa otú m ga-esi agbachi nkịtị nọrọ na-ekiri mbibi a ga-ebibi ndị ikwu m?”
7 Eze Ahazuirọs wee gwa Esta nwunye ya na Mọdekaị bụ́ onye Juu, sị: “Lee! Enyewo m Esta+ ụlọ Heman, ha akwụwala Heman n’osisi,+ n’ihi na o setịrị aka ya megide ndị Juu.
8 Unu onwe unu, deenụ ihe ọ bụla dị mma n’anya unu maka ọdịmma ndị Juu n’aha eze,+ jirikwanụ mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara; n’ihi na ọ gaghị ekwe omume imebi ihe ọ bụla e dere n’aha eze ma jiri mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara.”+
9 E wee kpọọ ndị odeakwụkwọ+ eze n’oge ahụ n’ọnwa nke atọ, ya bụ, n’ọnwa Saịvan, n’abalị iri abụọ na atọ ya; e wee dee ihe niile Mọdekaị nyere ndị Juu na ndị setrap+ na ndị gọvanọ na ndị isi ógbè dị iche iche malite n’India ruo Itiopia n’iwu, bụ́ ógbè+ dị otu narị na iri abụọ na asaa, degara ógbè nke ọ bụla n’otú ha si ede ihe,+ ndị nke ọ bụla kwa n’asụsụ ha,+ degakwara ndị Juu otú ha si ede ihe nakwa n’asụsụ ha.+
10 O wee dee ihe n’aha Eze+ Ahazuirọs, jirikwa mgbaaka eze e ji aka ihe akara+ kaa ya akara+ wee zipụ akwụkwọ ozi ahụ site n’aka ndị na-ebu ozi+ bụ́ ndị na-eji ịnyịnya aga ozi, ndị na-agba ịnyịnya ndị e ji aga ozi eze, bụ́ ụmụ nne ịnyịnya ndị na-awụ ọsọ,
11 na eze nyere ndị Juu bi n’obodo niile dị iche iche ikike izukọta+ ma zọọ mkpụrụ obi ha, ka ha bibie, gbuo ma laa ndị agha niile nke ndị ahụ+ na ógbè na-ebuso ha iro n’iyi, ma ụmụntakịrị ma ndị inyom, kwakọrọkwa ihe ha,+
12 n’ụbọchị ahụ,+ n’ógbè niile Eze Ahazuirọs na-achị, n’abalị iri na atọ+ n’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, n’ọnwa Eda.+
13 A ga-eme ka ihe ahụ e dere n’akwụkwọ ahụ+ bụrụ iwu n’ógbè niile dị iche iche, kpọsaara ya ndị niile, na ndị Juu ga-ejikere n’ụbọchị a ịbọrọ onwe ha ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro ha.
14 Ndị ahụ na-ebu ozi,+ bụ́ ndị na-agba ịnyịnya e ji aga ozi eze, gawara ngwa ngwa+ n’ihi okwu eze; a kpọsakwara iwu ahụ na Shushan+ bụ́ obí eze.
15 Ma Mọdekaị si n’ihu eze pụọ, yiri uwe onye eze+ nke na-acha anụnụ anụnụ, nke e jikwa ákwà linin mee, kpurukwa nnukwu okpueze ọlaedo, yirikwa uwe mgbokwasị e ji ákwà mara mma,+ ọbụna ákwà e sijiri odo odo mee.+ Obodo Shushan wee tisie mkpu ike, ṅụrịakwa ọṅụ.+
16 Ìhè bịaara ndị Juu, ha ṅụrịkwara ọṅụ,+ nweekwa aṅụrị na ùgwù.
17 N’ógbè niile dị iche iche na obodo niile dị iche iche ebe okwu eze na iwu ya ruru, ndị Juu nwere ọṅụ na obi ụtọ, ọ bụkwa ụbọchị oriri+ na ikpori ndụ; ọtụtụ n’ime ndị obodo+ ahụ na-ekwukwa na ha bụ ndị Juu,+ n’ihi na ụjọ+ ndị Juu jidere ha.