Esta 10:1-3
10 Eze Ahazuirọs wee mee ka ala ahụ na agwaetiti+ niile nke oké osimiri rụwa ọrụ mmanye.
2 Ma ọrụ niile siri ike Mọdekaị+ rụrụ nakwa ịdị ike ya na ihe niile e kwuru banyere mbuli eze buliri ya,+ ọ̀ bụ na e deghị ha n’Akwụkwọ ihe ndị mere+ n’oge ndị eze Midia na Peshia?+
3 N’ihi na Mọdekaị onye Juu na-esote+ Eze Ahazuirọs n’ọkwá, ọ dịkwa ukwuu n’etiti ndị Juu, ụmụnne ya kwadokwara ya n’ìgwè, ọ na-arụkwa ọrụ maka ọdịmma nke ndị ya ma na-agwa ụmụ ha niile okwu udo.+