Daniel 9:1-27
9 N’afọ mbụ nke ọchịchị Darayọs+ nwa Ahazuirọs onye Midia,+ onye e mere eze ịchị alaeze ndị Kaldia;+
2 n’afọ mbụ nke ọchịchị ya, mụ onwe m, Daniel, ghọtara site n’akwụkwọ dị iche iche afọ ole Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu,+ ya bụ, afọ iri asaa,+ nke Jehova gwara Jeremaya onye amụma okwu ya.+
3 M wee chee ihu m+ n’ebe Jehova bụ́ ezi Chineke nọ, ka m jiri ekpere+ na arịrịọ na ibu ọnụ na ákwà iru uju na ntụ chọọ ya.+
4 M wee malite ikpeku Jehova bụ́ Chineke m ekpere na ikwupụta mmehie m, sị:+
“Biko, Jehova bụ́ ezi Chineke, Onye ukwu+ na Onye dị egwu, onye na-edebere ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe ihe o nyere n’iwu+ ọgbụgba ndụ,+ onye na-egosikwa ha obiọma,*+
5 anyị emehiewo,+ mee ihe ọjọọ, meekwa ajọ omume ma nupụ isi;+ anyị ahapụwokwa ihe i nyere n’iwu na mkpebi ikpe gị.+
6 Anyị egeghịkwa ndị ohu gị bụ́ ndị amụma ntị,+ bụ́ ndị gwara ndị eze anyị, ndị isi anyị na nna nna anyị hà na ndị ala anyị niile okwu n’aha gị.+
7 Ọ bụ gị, Jehova, nwe ezi omume, ma ihere bụ nke anyị taa,+ ihere bụ nke ndị Juda, bụrụkwa nke ndị niile bi na Jeruselem na ndị Izrel niile, ndị bi nso na ndị bi n’ebe dị anya n’ala niile ị chụgara ha n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi ha mesoro gị.+
8 “Jehova, ihere bụ nke anyị, bụrụkwa nke ndị eze anyị na ndị isi anyị na nna nna anyị hà, n’ihi na anyị emehiewo gị.+
9 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị nwe ebere+ na mgbaghara,+ n’ihi na anyị enupụworo ya isi.+
10 Anyị erubeghịkwa isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru, ya bụ, ije ije n’iwu ya ndị o nyere anyị site n’aka ndị ohu ya bụ́ ndị amụma.+
11 Ndị Izrel niile emebiwokwa iwu gị, ha ahapụwo gị site n’ịjụ irube isi n’ihe i kwuru,+ i wee mee ka ọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi nke e dere n’iwu Mozis ohu ezi Chineke mezuo n’isi anyị,+ n’ihi na anyị emehiewo Ya.
12 O wee mezuo ihe o kwuru gaje ime anyị+ na ndị ikpe anyị bụ́ ndị kpere anyị ikpe,+ site n’ime ka oké ọdachi dakwasị anyị, nke dakwasịrị Jeruselem, bụ́ ụdị na-emetụbeghị n’okpuru eluigwe.+
13 Dị nnọọ ka e dere ya n’iwu Mozis,+ ọdachi a dum adakwasịwo anyị,+ anyị emeghịkwa ka obi jụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị site n’ịhapụ njehie anyị+ nakwa site n’ịghọta eziokwu gị.+
14 “Jehova mụ anya banyere ọdachi ahụ ma mee ka ọ dakwasị anyị n’ikpeazụ,+ n’ihi na Jehova Chineke anyị bụ onye ezi omume n’ọrụ niile ọ rụrụ; ma anyị erubeghị isi n’ihe o kwuru.+
15 “Ugbu a, Jehova bụ́ Chineke anyị, gị onye ji aka dị ike kpọpụta ndị gị n’ala Ijipt+ ma meere onwe gị aha dị ka ọ dị taa,+ anyị emehiewo,+ anyị emewo ajọ omume.
16 Jehova, dị ka ọrụ ezi omume gị niile si dị,+ biko, ka iwe ọnụma gị na iwe ị na-eweso obodo gị bụ́ Jeruselem, bụ́ ugwu nsọ gị,+ dajụọ; n’ihi na ndị niile gbara anyị gburugburu na-akwa Jeruselem na ndị gị emo+ n’ihi mmehie anyị nakwa n’ihi njehie nke nna nna anyị hà.+
17 Ugbu a, Chineke anyị, biko, nụrụ ekpere ohu gị na arịrịọ ya, mee ka ebe nsọ gị nke e meworo ka ọ tọgbọrọ n’efu+ nweta ihu ọma gị,+ n’ihi gị onwe gị, Jehova.
18 Chineke m, biko, tọọ ntị gị n’ala nụrụ.+ Meghee anya gị hụ otú anyị si tọgbọrọ n’efu, hụkwa obodo a kpọkwasịrị aha gị;+ n’ihi na ọ bụghị dị ka ezi omume anyị si dị ka anyị na-arịọ gị arịrịọ a,+ kama ọ bụ dị ka ebere gị si dị ukwuu.+
19 Jehova, biko, nụrụ.+ Jehova, biko, gbaghara.+ Jehova, biko, ṅaa ntị ma mee ihe.+ Egbula oge,+ n’ihi gị onwe gị, Chineke m, n’ihi na a kpọkwasịrị obodo gị na ndị gị aha gị.”+
20 Mgbe m ka kpụ okwu a n’ọnụ ma na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie m+ na mmehie nke ndị m Izrel,+ na-arịọkwa Jehova bụ́ Chineke m arịrịọ ka o meere m amara banyere ugwu nsọ+ nke Chineke m,
21 mgbe m ka nọ na-ekpe ekpere a, lee, onye ahụ bụ́ Gebriel,+ onye m hụrụ n’ọhụụ ná mmalite,+ ebe ike gwụchara m, bịakwutere m n’oge e ji enye onyinye inweta ihu ọma ná mgbede.+
22 O wee mee ka m nwee nghọta, wee sị m:
“Daniel, ugbu a abịawo m ime ka i nwee ike ịghọta na ịmata ihe karị.+
23 Mgbe ị malitere ịrịọ arịrịọ, e ziri m ozi, mụ onwe m abịawokwa ịkọrọ gị ya, n’ihi na ị bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.+ N’ihi ya, chebara okwu a echiche,+ ghọtakwa ihe ị hụrụ.
24 “E kpebiwo na izu iri asaa ga-agabiga n’isi ndị gị+ nakwa n’isi obodo nsọ unu,+ iji mee ka mmebi iwu kwụsị+ nakwa iji kpochapụ mmehie+ nakwa iji kpuchie mmehie+ nakwa iji webata ezi omume ruo mgbe ebighị ebi+ nakwa iji kachie ọhụụ+ na onye amụma akara, nakwa iji tee Ebe Nsọ Kasị Nsọ mmanụ.+
25 Ị ga-amarakwa ma ghọta na malite mgbe e kwuru+ ka e mee ka Jeruselem dị otú ọ dịbu nakwa ka e wughachi ya+ ruo mgbe Mesaya+ bụ́ Onye Ndú+ ga-abịa, a ga-enwe izu asaa, nweekwa izu iri isii na abụọ.+ A ga-eme ka Jeruselem dị otú ọ dịbu, wughachikwa ya, ya enwee ámá na olulu, kama ọ ga-abụ n’oge ihe isi ike.
26 “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gasịrị, a ga-ebipụ Mesaya,+ ya agbara aka.+
“Ndị nke onye ndú ahụ na-abịanụ ga-ebibi+ obodo ahụ na ebe nsọ ahụ.+ Ọ bụkwa idei mmiri ka a ga-eji bibie ya. A ga na-alụ agha ruo ná ngwụsị; ihe e kpebiri bụ mbibi.+
27 “Ọ ga-eme ka ọgbụgba ndụ dịrị irè+ maka ọtụtụ ndị ruo otu izu;+ n’ọkara izu ahụ, ọ ga-eme ka àjà na onyinye inweta ihu ọma kwụsị.+
“Onye na-akpata mbibi ga-anọ n’elu nku nke ihe arụ;+ ihe ahụ e kpebiworo ga na-adakwasị onye ahụ tọgbọ n’efu ruo mgbe e kpochapụrụ ya.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”