Daniel 8:1-27

8  N’afọ nke atọ nke ọbụbụeze eze Belshaza,+ mụ onwe m, Daniel, hụrụ ọhụụ mgbe m hụchara nke ahụ m hụrụ ná mmalite.+  M wee malite ịhụ ọhụụ ahụ; o wee ruo na, ka m nọ na-ahụ ọhụụ, m nọ na Shushan+ bụ́ obí eze, nke dị n’Ilam+ bụ́ ógbè a na-achị achị; m wee hụ n’ọhụụ ahụ na mụ onwe m nọ n’ọwa mmiri Yulaị.+  Mgbe m leliri anya, m hụrụ, ma, lee! e nwere otu ebule+ nke guzo n’ihu ọwa mmiri ahụ, o nwekwara mpi abụọ. Mpi ya abụọ ahụ toro ogologo, kama otu ka ibe ya ogologo, nke ahụ ka ogologo bụ nke tolitere n’ikpeazụ.+  Ahụrụ m ebule ahụ ka ọ sọọrọ mpi gaa n’ebe ọdịda anyanwụ nakwa n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda, ọ dịghị anụ ọhịa ọ bụla guzoliri n’ihu ya, ọ dịghịkwa onye na-anapụta ihe ọ bụla n’aka ya.+ Ihe ọ bụla bụ uche ya ka ọ na-eme, o wee bulie onwe ya elu.  Mụ onwe m wee na-atụgharị nke a n’uche, ma, lee! e nwere otu mkpi+ nke si n’ebe ọdịda anyanwụ gazuo elu ụwa dum, ụkwụ ya anaghịkwa emetụ n’ala. Mkpi ahụ nwere otu mpi a na-ahụ nke ọma nke dị n’agbata anya ya abụọ.+  O wee na-abịa n’ebe ebule ahụ nwere mpi abụọ nọ, bụ́ nke m hụrụ ka o guzo n’ihu ọwa mmiri ahụ; o wee jiri oké ọnụma gbara ọsọ gawa n’ebe ọ nọ.  M wee hụ ka ọ na-abịaru nnọọ ebule ahụ nso, o wee weso ya iwe, o wee sọtuo ebule ahụ n’ala, gbajie mpi ya abụọ, ebule ahụ eguzolighịkwa n’ihu ya. O wee kwatuo ya n’ala zọọ ya ụkwụ, o nweghịkwa onye napụtara ebule ahụ n’aka ya.+  Mkpi ahụ wee bulie onwe ya elu+ gabiga ókè: ma ozugbo ọ dịrị ike, a gbajiri nnukwu mpi ya, mpi anọ a na-ahụ nke ọma wee pulite n’isi ya wee nọchie ya, chee ihu n’ifufe anọ nke eluigwe.+  Mpi ọzọ, nke dị ntakịrị, wee si n’otu n’ime ha pulite,+ o wee na-akpawanye ike n’ebe ndịda nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe Ihe Ịchọ Mma dị.+ 10  Ọ nọkwa na-akpawanye ike ruo n’ebe ihe ndị dị n’eluigwe* dị,+ o wee mee ka ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ dị n’eluigwe nakwa ụfọdụ kpakpando+ daa n’ụwa, o wee zọọ ha ụkwụ.+ 11  O bulikwara onwe ya elu ruo n’ebe Onyeisi+ nke ihe ndị dị n’eluigwe nọ, e wepụkwara àjà a na-achụrụ Onyeisi ahụ mgbe niile,+ a kwatukwara ebe nsọ ya nke guzosiri ike.+ 12  E mechara nyefee ya ihe ndị dị n’eluigwe,+ tinyere àjà a na-achụ mgbe niile+ n’ihi njehie;+ o wee na-eme ka eziokwu+ daa n’ala,+ o mekwara ihe, ihe gazikwaara ya.+ 13  M wee nụ ka otu onye nsọ+ na-ekwu okwu, onye nsọ ọzọ wee gwa onye nke ahụ na-ekwu okwu, sị: “Olee mgbe ọhụụ banyere àjà a na-achụ mgbe niile+ nakwa banyere njehie nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu+ ga-adịru, iji mee ka ebe nsọ ahụ na ihe ndị dị n’eluigwe bụrụ ihe a ga-azọ ụkwụ?”+ 14  O wee sị m: “Ọ ga-adịru puku ụbọchị abụọ na narị atọ, mgbede na ụtụtụ; a ga-emekwa ka ebe nsọ ahụ dịrị otú o kwesịrị ịdị.”+ 15  O wee ruo na, ka mụ onwe m, Daniel, nọ na-ahụ ọhụụ ahụ ma na-achọ ịghọta ya,+ lee! onye yiri dimkpa bịara guzo m n’ihu.+ 16  M wee malite ịnụ olu mmadụ n’etiti Yulaị,+ o wee jiri oké olu, sị: “Gebriel,+ mee ka onye ahụ ghọta ihe ọ hụrụ.”+ 17  O wee bịa n’akụkụ ebe m guzo, ma mgbe ọ bịara, ụjọ tụrụ m, m wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala. O wee sị m: “Nwa nke mmadụ,+ ghọta+ na ọhụụ ahụ bụ maka oge ikpeazụ.”+ 18  Mgbe ọ nọ na-agwa m okwu, ezigbo ụra buuru m ka m kpudoro ihu n’ala.+ O wee metụ m aka mee ka m guzoro ọtọ n’ebe ahụ m guzobu.+ 19  O wee gaa n’ihu ịsị: “Lee, m na-eme ka ị mara ihe gaje ime mgbe amamikpe ahụ na-akwụsị, n’ihi na ọ bụ maka oge ikpeazụ a kara aka.+ 20  “Ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ na-anọchi anya ndị eze Midia na Peshia.+ 21  Mkpi ahụ gbajuru ajị n’ahụ́ na-anọchi anya eze Gris;+ ma nnukwu mpi ahụ nke dị n’agbata anya ya abụọ na-anọchi anya eze nke mbụ.+ 22  Ebe ọ bụ na a gbajiela nke ahụ, mpi anọ wee pupụta nọchie ya,+ a ga-enwe alaeze anọ ga-esi ná mba ya pụta, ma ha agaghị enwe ụdị ike o nwere. 23  “N’oge ikpeazụ nke alaeze ha, mgbe ndị na-emebi iwu mezuru mmehie ha, otu eze nke ihu ya na-emenye ụjọ, nke na-aghọta okwu na-edoghị anya, ga-ebili.+ 24  Ọ ga-adịkwa ike nke ukwuu, ma ọ gaghị abụ n’ike aka ya.+ Ọ ga-ewetakwa mbibi n’ụzọ dị ịtụnanya,+ ọ ga-enwekwa ihe ịga nke ọma, meekwa ihe n’ụzọ dị irè. Ọ ga-ala ndị dike n’iyi, laakwa ndị nsọ n’iyi.+ 25  N’ihi nghọta o nwere, ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịghọ aghụghọ.+ Ọ ga-ebulikwa onwe ya elu n’obi ya,+ ọ ga-alakwa ọtụtụ ndị n’iyi n’oge nchegbu na-adịghị.+ Ọ ga-ebilikwa megide Onyeisi nke ndị isi,+ ma ọ bụghị aka ka a ga-eji gbajie ya.+ 26  “Ihe ahụ a hụrụ banyere mgbede na ụtụtụ, bụ́ nke e kwuru, bụ eziokwu.+ Ma gị onwe gị, kpuchie ọhụụ ahụ, n’ihi na ọ bụ maka ọdịnihu.”+ 27  Ma mụ onwe m, Daniel, ike gwụrụ m, arịakwara m ọrịa ruo ụbọchị ụfọdụ.+ M wee bilie rụwa ọrụ eze;+ ma enweghị m ọnụ okwu n’ihi ihe m hụrụ, ọ dịghịkwa onye na-aghọta ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

“Ihe ndị dị n’eluigwe” pụrụ ịgụnye ndị mmụọ e kere eke bi n’eluigwe.