Daniel 5:1-31

5  Ma Belshaza+ bụ́ eze meere otu puku mmadụ n’ime ndị ukwu ya oké oriri, ọ nọkwa n’ihu otu puku mmadụ ahụ na-aṅụ mmanya.+  Mgbe mmanya gbuwere Belshaza,+ o kwuru ka a chịtara ya arịa ọlaedo na nke ọlaọcha+ ndị Nebukadneza nna ya chịịrị n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ka eze na ndị ukwu ya, ndị iko ya na ndị nwunye ya ndị ọzọ were ha ṅụọ mmanya.+  N’oge ahụ, ha chịbatara arịa ọlaedo ndị ha chịịrị n’ụlọ nsọ nke ụlọ Chineke dị na Jeruselem, eze na ndị ukwu ya, ndị iko ya na ndị nwunye ya ndị ọzọ wee were ha ṅụọ mmanya.  Ha ṅụrụ mmanya, ha tokwara chi ha ndị e ji ọlaedo na ọlaọcha, ọla kọpa, ígwè, osisi na nkume mee.+  N’otu mgbe ahụ, mkpịsị aka mmadụ pụtara wee na-ede ihe n’ahụ́ ájá nke obí eze+ n’ihu ihe ndọba oriọna, eze nọkwa na-ahụ azụ aka ahụ na-ede ihe.  N’oge ahụ, ahụ́ eze chagharịrị, ihe dị ya n’uche menyekwara ya ụjọ,+ nkwonkwo úkwù ya nọkwa na-echikwapụ,+ ikpere ya wee na-akụkọta ọnụ.+  Eze wee were oké olu tie mkpu ka a kpọtara ya ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ, ndị Kaldia na ndị na-agụ kpakpando.+ Eze wee gwa ndị amamihe nke Babịlọn, sị: “Nwoke ọ bụla nke ga-agụ ihe a e dere ma kọọrọ m isi ya, a ga-eyiwe ya uwe na-acha odo odo,+ yinye ya ihe olu ọlaedo n’olu, ọ ga-achịkwa dị ka onye nke atọ n’alaeze a.”+  N’oge ahụ, ndị amamihe niile nke eze nọ na-abata, ma ha enweghị ike ịgụ ihe ahụ e dere ma ọ bụ ịkọrọ eze isi ya.+  N’ihi ya, ụjọ tụrụ Eze Belshaza nke ukwuu, ahụ́ ya nọkwa na-achagharị; ihe ahụ gbagwojukwara ndị ukwu ya anya.+ 10  N’ihi ihe eze na ndị ukwu ya kwuru, eze nwaanyị batara kpọmkwem n’ime ebe ahụ a nọ na-eri oriri. Eze nwaanyị wee sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ka ihe dị gị n’uche ghara imenye gị ụjọ, ka ahụ́ gị gharakwa ịchagharị. 11  E nwere otu nwoke ruru eru nke nọ n’alaeze gị, bụ́ onye mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dị n’ime ya;+ n’oge nna gị, o nwere ihe ọmụma na nghọta na amamihe nke yiri amamihe nke ndị bụ́ chi, Eze Nebukadneza bụ́ nna gị, ee, nna gị, eze, mere ka ọ bụrụ onyeisi+ ndị dibịa anwansi, ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ, ndị Kaldia na ndị na-agụ kpakpando; 12  n’ihi na mmụọ pụrụ iche na ihe ọmụma na nghọta e ji akọwa nrọ+ nakwa nke e ji akọwa ilu nakwa nke e ji atọghe ihe mara akpụ dị n’ime ya,+ n’ime Daniel, bụ́ onye eze gụrụ Belteshaza.+ Ka a kpọọ Daniel ka ọ kọọ isi ya.” 13  E wee kpọta Daniel n’ihu eze. Eze wee sị Daniel: “Ọ̀ bụ gị bụ Daniel onye so ná ndị Juda a dọtara n’agha,+ bụ́ ndị nna m, bụ́ eze, si Juda kpọta?+ 14  Anụwokwa m banyere gị, na mmụọ nke ndị bụ́ chi dị n’ime gị+ nakwa na i nwere ihe ọmụma na nghọta na amamihe+ pụrụ iche. 15  Ugbu a, a kpọtawo ndị amamihe na ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ n’ihu m, ka ha gụọ ihe a e dere, kọọkwara m isi ya; ma ha enweghị ike ịkọwara m okwu ahụ.+ 16  Mụ onwe m anụwokwa banyere gị, na i nwere ike ịkọwa ihe+ na ịtọghe ihe mara akpụ. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe a e dere ma kọọrọ m isi ya, a ga-eyiwe gị uwe na-acha odo odo, yinye gị ihe olu ọlaedo n’olu, ị ga-achịkwa dị ka onye nke atọ n’alaeze a.”+ 17  Daniel wee kwuo n’ihu eze, sị: “Jide onyinye gị, werekwa ụgwọ ọrụ gị nye ndị ọzọ.+ Otú ọ dị, m ga-agụrụ eze ihe a e dere, m ga-akọkwara ya isi ya.+ 18  Ma gị onwe gị, eze, Chineke bụ́ Onye Kasị Elu+ nyere Nebukadneza nna gị+ alaeze a na ịdị ukwuu na ùgwù na ebube.+ 19  Ebe O mekwara ka ọ dị ukwuu, ndị niile, mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nọ na-ama jijiji ma na-atụ egwu n’ihu ya.+ Onye ọ bụla ọ chọrọ igbu ka ọ na-egbu; onye ọ bụla ọ chọkwara ịla n’iyi ka ọ na-ala n’iyi; onye ọ bụla ọ chọrọ ibuli elu ka ọ na-ebuli elu; onye ọ bụla ọ chọkwara iweda ala ka ọ na-eweda ala.+ 20  Ma mgbe obi ya dịrị mpako, mmụọ ya akpọchiekwa, o wee dịrị mpako,+ a chụturu ya n’ocheeze nke alaeze ya, a napụkwara ya ùgwù ya.+ 21  A chụpụkwara ya n’etiti ụmụ mmadụ, mee ka obi ya dịrị ka nke anụ ọhịa, ya na ịnyịnya ibu ọhịa wee biri.+ E nyere ya ahịhịa ka ọ na-ata dị ka ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ́ ya,+ ruo mgbe ọ matara na Chineke bụ́ Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ nakwa na ọ bụ onye ọ chọrọ ka ọ chịa ka ọ na-eme ka ọ chịa.+ 22  “Ma gị onwe gị, Belshaza nwa ya,+ i meghị ka obi gị dị ala,+ ọ bụ ezie na ị maara ihe a dum.+ 23  Kama i buliri onwe gị elu megide Onyenwe eluigwe,+ a chịpụtakwara arịa ndị si n’ụlọ ya n’ihu gị;+ gị onwe gị na ndị ukwu gị, ndị iko gị na ndị nwunye gị ndị ọzọ ejiriwo ha na-aṅụ mmanya, i towokwa chi efu ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo, ọla kọpa, ígwè, osisi na nkume mee,+ bụ́ ndị na-adịghị ahụ ụzọ ma ọ bụ anụ ihe, ha amaghịkwa ihe ọ bụla;+ ma i nyeghị Chineke onye ume ndụ gị dị n’aka+ nakwa onye ụzọ gị niile dị n’aka+ otuto.+ 24  N’ihi ya, o zitere azụ aka ahụ, e wee dee ihe a.+ 25  Ọ bụkwa ihe a ka e dere: MINI, MINI, TIKEL na PASỊN. 26  “Nke a bụ nkọwa ihe a e dere: MINI, Chineke agụwo ụbọchị alaeze gị ọnụ ma mee ka ọ gwụsịa.+ 27  “TIKEL, a tụwo gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ wee chọpụta na ihe kọrọ n’ime gị.+ 28  “PIRES, e kewaala alaeze gị, were ya nye ndị Midia na ndị Peshia.”+ 29  Belshaza wee nye iwu, e wee yiwe Daniel uwe na-acha odo odo, yinyekwa ya ihe olu ọlaedo n’olu; e wee kpọsaa na ọ ga-abụ onye ọchịchị nke atọ n’alaeze ahụ.+ 30  Ọ bụ n’abalị ahụ ka e gburu Belshaza eze ndị Kaldia,+ 31  Darayọs+ onye Midia wee weghara alaeze ahụ mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri isii na abụọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji