Daniel 3:1-30
3 Nebukadneza bụ́ eze kpụrụ ihe oyiyi+ ọlaedo nke ịdị elu ya dị kubit iri isii, obosara ya dịkwa kubit isii. O guzobere ya na mbara ala Dura, n’ógbè Babịlọn a na-achị achị.+
2 Nebukadneza ziri ozi dị ka eze ka a kpọkọta ndị setrap, ndị prifekt,+ ndị gọvanọ, ndị ndụmọdụ, ndị na-echekwa akụ̀, ndị ikpe, ndị uwe ojii,+ na ndị niile na-elekọta ógbè dị iche iche a na-achị achị ka ha bịa maka ememme imeghe+ ihe oyiyi ahụ Nebukadneza bụ́ eze guzobere.
3 N’oge ahụ, ndị setrap,+ ndị prifekt na ndị gọvanọ, ndị ndụmọdụ, ndị na-echekwa akụ̀, ndị ikpe, ndị uwe ojii, na ndị niile na-elekọta ógbè dị iche iche a na-achị achị zukọtara maka ememme imeghe ihe oyiyi ahụ nke Nebukadneza bụ́ eze guzobere, ha guzokwa n’ihu ihe oyiyi ahụ nke Nebukadneza guzobere.
4 Onye na-akpọsa ozi+ jikwa olu dara ụda na-akpọsa, sị: “Ọ bụ unu, ndị dị iche iche, ndị mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ka a na-agwa,+
5 na mgbe unu nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú dị iche iche,+ daanụ n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ Nebukadneza bụ́ eze guzobere isiala.
6 Onye ọ bụla nke na-adaghị n’ala kpọọ isiala,+ a ga-atụba ya ozugbo+ n’oké ọkụ a kwanyere.”+
7 N’ihi nke a, ozugbo mmadụ niile nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, na ụdị ngwá egwú dị iche iche, mmadụ niile,+ ndị mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche dara n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ Nebukadneza bụ́ eze guzobere isiala.
8 N’ihi nke a, ụfọdụ ndị Kaldia bịara wee bo ndị Juu ebubo n’otu oge ahụ.+
9 Ha gwara Nebukadneza bụ́ eze, sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+
10 Gị onwe gị, eze, nyere iwu na onye ọ bụla nke nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú dị iche iche,+ ga-ada n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ isiala;
11 nakwa na onye ọ bụla nke na-adaghị n’ala kpọọ isiala, a ga-atụba ya n’oké ọkụ ahụ a kwanyere.+
12 E nwere ndị Juu ị họpụtara ka ha na-elekọta ógbè Babịlọn a na-achị achị,+ bụ́ Shedrak, Mishak na Abednego; ndị ikom a enyeghị gị nsọpụrụ, eze, ha adịghị efe chi gị dị iche iche ofufe, ha achọghịkwa ịkpọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ i guzobere isiala.”+
13 Mgbe ahụ, Nebukadneza ji iwe na ọnụma+ kwuo ka a kpọta Shedrak, Mishak na Abednego.+ E wee kpọta ndị ikom a n’ihu eze.
14 Nebukadneza wee sị ha: “Ọ̀ bụ eziokwu, Shedrak, Mishak na Abednego, na unu adịghị efe chi m dị iche iche ofufe,+ nakwa na unu akpọrọghị ihe oyiyi ọlaedo m guzobere isiala?+
15 Ọ bụrụ na unu dị njikere ugbu a ịda n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ahụ m mere isiala, mgbe unu nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà na ụdị ngwá egwú dị iche iche,+ ọ dị mma. Ma ọ bụrụ na unu akpọrọghị ya isiala, a ga-atụba unu ozugbo n’oké ọkụ ahụ a kwanyere. Olee chi ga-anapụtali unu n’aka m?”+
16 Shedrak, Mishak na Abednego wee sị eze: “Nebukadneza, ọ dịghị mkpa ka anyị zaa gị ihe ọ bụla n’okwu a.+
17 Ọ bụrụ na a tụba anyị n’ime ya, Chineke anyị bụ́ onye anyị na-efe ofufe ga-anapụtali anyị. Ọ ga-anapụta anyị n’oké ọkụ ahụ a kwanyere, napụtakwa anyị n’aka gị, eze.+
18 Ọ bụrụgodị na ọ gaghị anapụta anyị, mara amara, eze, na anyị agaghị efe chi gị dị iche iche, anyị agaghịkwa akpọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ i guzobere isiala.”+
19 Iwe wee ju Nebukadneza obi, ihu ya wee gbarụọ n’ihi Shedrak, Mishak na Abednego. O wee kwuo ka e mee ka oké ọkụ ahụ a kwanyere dịkwuo ọkụ okpukpu asaa karịa ka a na-emebu ka ọ dị ọkụ.
20 Ọ gwakwara ndị dimkpa ụfọdụ dị ike,+ bụ́ ndị so ná ndị agha ya, ka ha kee Shedrak, Mishak na Abednego agbụ, iji tụba ha n’oké ọkụ ahụ a kwanyere.+
21 E wee kee ndị ikom ahụ agbụ n’eyipụghị ha ákwà mgbokwasị ha, uwe mwụda ha na okpu ha na ihe ndị ọzọ ha yi, wee tụba ha n’oké ọkụ ahụ a kwanyere.
22 Ebe ọ bụ na ihe eze kwuru ka e mee abụghị obere okwu, ebe ọ bụ na e mekwara ka oké ọkụ ahụ a kwanyere dị ọkụ gabiga ókè, ọ bụ ndị dimkpa ahụ ndị kpụụrụ Shedrak, Mishak na Abednego ka ire ọkụ ahụ regburu.
23 Ma ndị ikom ndị ọzọ ahụ, ha atọ, Shedrak, Mishak na Abednego, bu agbụ ahụ e kere ha daba n’oké ọkụ ahụ a kwanyere.+
24 Ụjọ wee jide Nebukadneza bụ́ eze, o wee bilie n’ike. O wee gwa ndị na-ejere ya ozi, bụ́ ndị ọkwá ha dị elu, sị: “Ọ́ bụghị ndị ikom atọ ka anyị kere agbụ tụba n’ime ọkụ?”+ Ha wee sị eze: “Ee, Eze.”
25 O wee sị: “Lee! M na-ahụ ndị ikom anọ ka ha na-ejegharịrị onwe ha n’ime ọkụ ahụ, ọkụ adịghịkwa ere ha, onye nke anọ yiri chi.”+
26 Nebukadneza wee bịaruo nso n’ọnụ ụzọ ebe a kwanyere oké ọkụ ahụ.+ O wee sị: “Shedrak, Mishak na Abednego, unu ndị ohu Chineke bụ́ Onye Kasị Elu,+ pụtanụ bịa n’ebe a!” Shedrak, Mishak na Abednego wee si n’ime ọkụ ahụ pụta.
27 Ndị setrap, ndị prifekt na ndị gọvanọ na ndị na-ejere eze ozi, bụ́ ndị ọkwá ha dị elu,+ bụ́ ndị zukọtaranụ, wee hụ ndị ikom ndị a, na ọkụ ahụ emeghị ha ihe ọ bụla n’ahụ́,+ o reghịkwa ọbụna otu mkpụrụ ntutu dị ha n’isi,+ ọbụna ákwà mgbokwasị ha agbanweghị, ha esighịkwa anwụrụ ọkụ anwụrụ ọkụ.
28 Nebukadneza wee sị: “Ka Chineke Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye zitere mmụọ ozi ya+ wee napụta ndị ohu ya bụ́ ndị tụkwasịrị ya obi,+ ndị nupụkwara isi n’okwu eze wee kwere ọnwụ, n’ihi na ha jụrụ ife+ chi ọ bụla ma ọ bụ ịkpọrọ ya isiala+ ma e wezụga Chineke ha.+
29 M na-etikwa iwu,+ na ndị ọ bụla, mba ọ bụla ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọ bụla nke kwuru ihe ọ bụla dị njọ banyere Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-abọkasị ha,+ meekwa ka ụlọ ha ghọọ ebe ọha mmadụ ga na-aga mposi;+ n’ihi na e nweghị chi ọzọ nwere ike ịnapụta mmadụ dị ka nke a.”+
30 N’oge ahụ, eze mere ka ihe na-agaziri Shedrak, Mishak na Abednego n’ógbè Babịlọn a na-achị achị.+