Daniel 12:1-13
12 “N’oge ahụ, Maịkel+ ga-ebili, bụ́ nnukwu onyeisi+ ahụ nke guzo ọtọ+ n’ihi ụmụ ndị gị.+ A ga-enwekwa oge ahụhụ nke a na-enwetụbeghị kemgbe e nwere mba ruo n’oge ahụ.+ N’oge ahụ, ndị gị ga-alanahụ,+ onye ọ bụla e dere aha ya n’akwụkwọ.+
2 Ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-arahụ ụra n’ime ala ga-eteta,+ ụfọdụ ga-enweta ndụ ebighị ebi,+ ụfọdụ enweta nkọcha, bụrụkwa ihe ịsọ oyi ruo mgbe ebighị ebi.+
3 “Ndị nwere nghọta ga na-enwu dị ka ìhè mbara igwe;+ ndị na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị ezi omume ga na-enwukwa+ dị ka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.
4 “Ma gị onwe gị, Daniel, zochie okwu ndị a, mechiekwa akwụkwọ a,+ ruo n’oge ikpeazụ.+ Ọtụtụ ndị ga na-awagharị, ezi ihe ọmụma ga-abakwa ụba.”+
5 Mụ onwe m, Daniel, wee hụ, ma, lee! e nwere mmụọ ozi abụọ ọzọ guzo+ n’akụkụ mmiri,+ otu n’otu akụkụ, onye nke ọzọ n’akụkụ nke ọzọ.
6 Otu wee gwa onye ahụ yi uwe linin,+ bụ́ onye guzo n’elu mmiri ahụ, sị: “Oge há aṅaa fọdụrụ ka ihe ebube ndị a mechaa?”+
7 M wee malite ịnụ ihe onye ahụ yi uwe linin, bụ́ onye guzo n’elu mmiri ahụ, na-ekwu, ka o weliri aka nri ya na aka ekpe ya n’eluigwe ma jiri Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi+ ṅụọ iyi,+ sị: “Ọ ga-adịru otu oge a kara aka, oge abụọ a kara aka na ọkara otu oge.+ Ozugbo a kụrisịrị ike nke ndị nsọ,+ ihe ndị a niile ga-emezu.”
8 Mụ onwe m nụrụ ma aghọtaghị m;+ m wee sị: “Onyenwe m, gịnị ga-abụ njedebe nke ihe ndị a?”+
9 O wee gaa n’ihu ịsị: “Gawa, Daniel, n’ihi na e zochiwo okwu ndị a, mechiekwa ya ruo n’oge ikpeazụ.+
10 Ọtụtụ ndị ga-asacha onwe ha,+ meekwa onwe ha ka ha dị ọcha,+ a ga-anụchakwa ha.+ Ndị ajọ omume ga na-emekwa ajọ omume,+ ọ dịghịkwa onye ajọ omume ọ bụla ga-aghọta ihe ndị a;+ ma ndị nwere nghọta ga-aghọta ha.+
11 “Malite mgbe e wepụrụ+ àjà ahụ a na-achụ mgbe niile,+ nakwa mgbe e debere ihe arụ+ ahụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, a ga-enwe otu puku ụbọchị, narị ụbọchị abụọ na iri itoolu.
12 “Obi ụtọ+ na-adịrị onye na-atụ anya ya nakwa onye rutere n’otu puku ụbọchị, narị ụbọchị atọ na iri atọ na ise ahụ!
13 “Ma gị onwe gị, gawa ruo n’ọgwụgwụ;+ ị ga-ezukwa ike,+ ma ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.”+