Daniel 1:1-21

1  N’afọ nke atọ nke ọbụbụeze Jehoyakim+ eze Juda, Nebukadneza eze Babịlọn bịara Jeruselem wee nọchibido ya.+  Ka oge na-aga, Jehova nyefere Jehoyakim eze Juda+ na ụfọdụ n’ime arịa+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke n’aka ya, o wee bute ha n’ala Shaịna,+ n’ụlọ chi ya; o wee busa arịa ndị ahụ n’ụlọ a na-edebe akụ̀ nke chi ya.+  Eze wee gwa Ashpenaz bụ́ onyeisi ndị na-eje ozi n’obí+ ya ka ọ kpọta ụfọdụ n’ime ndị ikom Izrel na ụmụ eze na ndị a ma ama,+  ụmụaka na-enweghị ntụpọ+ ọ bụla, ndị mara mma, ndị nwere ụdị amamihe+ niile, nweekwa ihe ọmụma, na-aghọtakwa ihe,+ ndị nwekwara ike ije ozi n’obí eze;+ ka ọ kụziekwara ha edemede na asụsụ ndị Kaldia.  Eze kwukwara nri a ga na-enye ha kwa ụbọchị site n’ihe oriri pụrụ iche+ nke eze na-eri nakwa site na mmanya ọ na-aṅụ, nakwa ka a zụọ ha ruo afọ atọ, ka ha wee nwee ike ije ozi n’ihu eze mgbe afọ atọ ahụ gasịrị.  E nwere n’etiti ha ụfọdụ n’ime ụmụ Juda, bụ́ Daniel,+ Hananaya, Mishel na Azaraya.+  Onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze gbanwere aha ha.+ Ọ gụrụ Daniel Belteshaza;+ gụọ Hananaya Shedrak; gụọ Mishel Mishak; gụọ Azaraya Abednego.+  Ma Daniel kpebisiri ike n’obi ya na ya agaghị eji nri pụrụ iche nke eze na mmanya ya merụọ+ onwe ya. O wee na-arịọ onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze arịrịọ ka o wee ghara imerụ onwe ya.+  Ezi Chineke wee mee ka onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze gosi Daniel obiọma* ma meere ya amara.+ 10  Onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze wee sị Daniel: “M na-atụ onyenwe m bụ́ eze egwu, bụ́ onye kwuru ihe unu ga na-eri na ihe unu ga na-aṅụ.+ Olee ihe mere ọ ga-eji hụ ka ihu unu gbarụrụ agbarụ ma o were ya tụnyere ihu ụmụaka ndị ọgbọ unu, oleekwa ihe mere unu ga-eji mee ka isi m dịrị n’ihe ize ndụ n’ebe eze nọ?” 11  Ma Daniel gwara onye nlekọta bụ́ onye onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze+ họpụtara ka ọ na-elekọta Daniel, Hananaya, Mishel na Azaraya, sị: 12  “Biko, lee ndị ohu gị ule ruo ụbọchị iri, ka a na-enye anyị akwụkwọ nri+ ka anyị na-eri, na-enyekwa anyị mmiri ka anyị na-aṅụ; 13  ka i lee otú ihu anyị dị na otú ihu ụmụaka ndị na-eri nri pụrụ iche nke eze dị, mesokwa ndị ohu gị ihe dị ka ihe ị hụrụ si dị.” 14  N’ikpeazụ, o gere ntị n’ihe ha kwuru n’ihe a wee lee ha ule ruo ụbọchị iri. 15  Mgbe ụbọchị iri ahụ gasịrị, ihu ha dị mma, ha bukwara ibu karịa ụmụaka ahụ niile ndị nọ na-eri nri pụrụ iche nke eze.+ 16  Onye nlekọta ahụ wee na-ewepụ nri ha pụrụ iche na mmanya ha ma na-enye ha akwụkwọ nri.+ 17  Ma ezi Chineke mere ka ụmụaka a, ha anọ, nwee ọgụgụ isi na nghọta n’ihe banyere edemede na amamihe+ niile; Daniel n’onwe ya na-aghọta ụdị ọhụụ ọ bụla na nrọ ọ bụla.+ 18  Mgbe ụbọchị ole eze kwuru ka a kpọta ha zuru,+ onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze kpọtara ha n’ihu Nebukadneza. 19  Ha na eze wee malite ikwurịta okwu, n’ime ha niile, o nweghị onye dị ka Daniel, Hananaya, Mishel na Azaraya;+ ha wee na-eje ozi n’ihu eze.+ 20  Ma ihe ọ bụla nke chọrọ amamihe na nghọta+ nke eze jụrụ ha ajụjụ banyere ya, ọ chọpụtara na ha maara ya ọbụna okpukpu iri karịa ndị dibịa anwansi+ niile na ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ,+ bụ́ ndị nọ n’ebe niile ọ na-achị. 21  Daniel nọgidekwara n’ebe ahụ ruo n’afọ mbụ nke ọchịchị eze Saịrọs.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”