Taịtọs 2:1-15

2  Ma, gị onwe gị, nọgide na-ekwu ihe ndị kwesịrị ozizi na-enye ezi ndụ.+  Ka ndị agadi nwoke+ na-emeru ihe n’ókè, ka ha bụrụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe,+ ndị nwere uche zuru okè, ndị na-anọgidesi ike n’okwukwe,+ n’ịhụnanya nakwa ná ntachi obi.+  Otú ahụkwa, ka ndị agadi nwaanyị+ bụrụ ndị dị nsọ n’omume ha, ghara ịbụ ndị nkwutọ,+ ka ha bụrụ ndị na-adịghị aṅụ oké mmanya, ndị na-akụzi ihe dị mma;  ka ha wee mee ka ndị inyom na-akatabeghị ahụ́ nwee uche ziri ezi iji hụ di ha n’anya,+ iji hụ ụmụ ha n’anya,+  ka ha nwee uche zuru okè, bụrụ ndị dị ọcha,+ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ, ndị ezi mmadụ, ndị na-edo onwe ha n’okpuru+ di ha, ka e wee ghara ịkatọ okwu Chineke.+  Na-adụsikwa ụmụ okorobịa ọdụ ike ka ha nwee uche zuru okè,+  n’ihe niile ị na-eme, bụrụ ihe nlereanya n’ezi ọrụ;+ na-akụzi+ ihe ziri ezi,+ na-eji ihe akpọrọ ihe,  na-ekwu okwu dị ọcha nke a na-apụghị ịkatọ akatọ;+ ka ihere wee mee onye nọ n’akụkụ nke na-emegide anyị, ebe ọ na-enweghị ihe ọjọọ ọ ga-ekwu banyere anyị.+  Ka ndị ohu+ doo onwe ha n’okpuru ndị nwe ha n’ihe niile,+ ka ha na-emekwa ihe dị ha ezi mma, ghara ịdị na-asa ha okwu,+ 10  ghara ịdị na-ezu ohi,+ kama ka ha na-egosi ikwesị ntụkwasị obi zuru ezu,+ ka ha wee chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị,+ bụ́ Chineke, mma n’ihe niile. 11  N’ihi na e mewo ka obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ,+ nke na-enye ụdị mmadụ niile+ nzọpụta,+ pụta ìhè.+ 12  Ọ na-akụziri anyị ka anyị jụ asọpụrụghị Chineke+ na ọchịchọ nke ụwa,+ ka anyị na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke+ n’ime usoro ihe dị ugbu a,+ 13  ebe anyị na-echere olileanya+ ahụ nke na-enye obi ụtọ na ngosipụta dị ebube+ nke Chineke ukwu ahụ nakwa nke Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Kraịst Jizọs, 14  onye nyere onwe ya+ n’ihi anyị ka o wee napụta+ anyị n’ụdị mmebi iwu niile, wee sachaara+ onwe ya ndị bụ́ ndị nke ya pụrụ iche,+ ndị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.+ 15  Jiri ikike zuru ezu nke inye iwu na-ekwu ihe ndị a, na-adụsikwa ọdụ ike ma na-adọ aka ná ntị.+ Ekwela ka onye ọ bụla leda gị anya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji