Ndị Rom 13:1-14

13  Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru+ ndị ọchịchị,+ n’ihi na ọ dịghị ọchịchị+ ọ bụla dị ma ọ́ bụghị Chineke debere ya;+ ọ bụ Chineke+ debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya.+  Ya mere, onye na-emegide ọchịchị na-eguzogide ndokwa Chineke; a ga-amakwa ndị na-eguzogide ya ikpe.+  N’ihi na a na-atụ ndị na-achị achị egwu. Ọ bụghị ndị na-eme ihe ọma na-atụ ha egwu, kama ọ bụ ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ya mere, ị̀ chọrọ ka ị ghara ịdị na-atụ ọchịchị egwu? Mewe ihe ọma,+ ị ga-enwetakwa ịja mma n’aka ya;  n’ihi na ọ bụụrụ gị onye na-ejere Chineke ozi maka ọdịmma gị.+ Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ,+ tụọ egwu: n’ihi na ọ dịghị ebu mma agha n’efu; n’ihi na ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi, onye na-abọ ọbọ+ iji weso onye na-eme ihe ọjọọ iwe.  Ya mere, e nwere ihe dị mkpa mere unu ga-eji doo onwe unu n’okpuru ya, ọ bụghị naanị n’ihi ọnụma ahụ kamakwa n’ihi akọ na uche unu.+  N’ihi na ọ bụ ya mere unu jikwa na-atụ ụtụ isi; n’ihi na ha bụ ndị ozi Chineke na-ejere ọha mmadụ ozi,+ ndị na-eje ozi dị otú a mgbe niile.  Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha, onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi;+ onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ ahịa, tụọrọnụ ya ụtụ ahịa; onye e kwesịrị ịtụ egwu, tụọnụ ya egwu;+ onye e kwesịrị ịsọpụrụ, sọpụrụnụ ya.+  Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla,+ ma e wezụga ịhụ ibe unu n’anya;+ n’ihi na onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu ahụ.+  N’ihi na ihe ndị e dere n’Iwu ahụ, bụ́ “Akwala iko,+ Egbula ọchụ,+ Ezula ohi,+ Enwela anyaukwu,”+ na ihe ọ bụla ọzọ e nyere n’iwu, ka a chịkọtara n’okwu a, ya bụ, “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”+ 10  Ịhụnanya+ adịghị eme onye agbata obi mmadụ ihe ọjọọ;+ ya mere, ịhụnanya bụ idebezu iwu ahụ.+ 11  Na-emekwanụ otú a, n’ihi na unu maara oge ahụ a kara aka, na oge awa ahụ eruwo ka unu teta n’ụra,+ n’ihi na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe anyị ghọrọ ndị kwere ekwe.+ 12  Chi ejimiwo; chi abọwala.+ Ya mere, ka anyị yipụ ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị,+ ka anyị yirikwa ngwá ọgụ+ nke ìhè. 13  Dị ka n’oge ehihie, ka anyị na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị,+ ọ bụghị n’oriri oké mkpọtụ na ịṅụ oké mmanya,+ ọ bụghị ná mmekọahụ na-ezighị ezi na omume rụrụ arụ,+ ọ bụghị n’esemokwu+ na ekworo. 14  Kama yirinụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị ka uwe,+ unu ebukwala ụzọ na-eme atụmatụ maka ihe anụ ahụ́ na-achọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji