Ndị Kọlọsị 4:1-18
4 Unu ndị bụ́ nna ukwu, na-emerenụ ndị ohu unu ihe ziri ezi na ihe dị mma,+ ebe unu maara na unu nwekwara Nna Ukwu n’eluigwe.+
2 Nọgidesienụ ike n’ekpere,+ mụrụkwanụ anya na ya ma na-enye ekele,+
3 n’otu oge ahụ, na-ekpekwara anyị ekpere,+ ka Chineke megheere anyị ọnụ ụzọ+ ka anyị wee kwusaa okwu ya, kwuokwa ihe nzuzo dị nsọ+ banyere Kraịst, nke mụ onwe m nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ n’ihi ya;+
4 ka m wee mee ka ọ pụta ìhè, dị ka m kwesịrị isi kwuo ya.+
5 Na-ejenụ ije n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ,+ na-azụtaranụ onwe unu oge kwesịrị ekwesị.+
6 Ka okwu unu dịrị n’amara+ mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ,+ ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi+ onye ọ bụla.
7 Tikikọs+ ga-eme ka unu mara ihe niile m na-eme. Ọ bụ nwanna m m hụrụ n’anya na onye ozi nke kwesịrị ntụkwasị obi na ohu ibe m n’ime Onyenwe anyị.
8 Ka unu wee mara ihe banyere anyị, ka o wee kasiekwa unu obi,+ m na-ezitere ya unu,
9 ya na Onesịmọs,+ bụ́ nwanna m nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye m hụrụ n’anya, onye si n’etiti unu. Ha ga-eme ka unu mara ihe niile na-eme n’ebe a.
10 Arịstakọs+ onye mkpọrọ ibe m na-ekele unu, Mak+ bụ́ nwa nwanne Banabas na-ekelekwa unu, (ọ bụ onye ahụ e nyere unu iwu ka unu nabata+ ma ọ bụrụ na ọ bịakwute unu mgbe ọ bụla,)
11 na Jizọs onye a na-akpọ Jọstọs, bụ́ ndị so ná ndị e biri úgwù. Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị ọrụ ibe m maka alaeze Chineke, ndị a aghọwokwa ndị na-enyere m aka, na-eme ka m dị ike.
12 Epafras,+ onye si n’etiti unu, bụ́ ohu nke Kraịst Jizọs, na-ekele unu, ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ mgbe niile n’ekpere ya n’ihi ọdịmma unu, ka unu wee bụrụ ndị zuru ezu n’ikpeazụ,+ na-ekwenyesikwa ike n’ihe niile bụ́ uche Chineke.
13 M na-agbara ya àmà na ọ na-eme mgbali dị ukwuu n’ihi ọdịmma unu na nke ndị nọ na Leodisia+ na nke ndị nọ na Haịrapọlis.
14 Luk,+ bụ́ ọgwọ ọrịa, onye a hụrụ n’anya, na-ekele unu, Dimas+ na-ekelekwa unu.
15 Keleerenụ m ụmụnna ndị nọ na Leodisia, keleekwanụ Nimfa na ọgbakọ dị n’ụlọ ya.+
16 Mgbe a gụkwara akwụkwọ ozi a n’etiti unu, meenụ ndokwa ka a gụọkwa+ ya n’ọgbakọ ndị Leodisia, ka unu gụọkwa nke si Leodisia.
17 Gwakwanụ Akịpọs, sị:+ “Na-eche ozi ahụ ị nabatara n’ime Onyenwe anyị nche, ka i wee jezuo ya.”
18 Nke a bụ ekele m, nke mụ onwe m bụ́ Pọl ji aka m dee.+ Burunụ agbụ ụlọ mkpọrọ m n’uche.+ Ka obiọma na-erughịrị mmadụ dịnyere unu.