Ndị Ikpe 20:1-48

20  N’ihi ya, ụmụ Izrel niile pụtara+ wee zukọta dị ka otu onye+ na Mizpa+ n’ihu Jehova malite na Dan+ ruo Bia-shiba,+ ha na ala Gilied.  Ndị isi nke ndị niile na ebo niile nke Izrel wee guzoro n’ọgbakọ nke ndị ezi Chineke,+ ya bụ, narị puku ndị ikom anọ ndị ji ụkwụ aga, bụ́ ndị na-ebu mma agha.+  Ụmụ Benjamin wee nụ na ụmụ Izrel agbagowo Mizpa.+ Ụmụ Izrel wee sị: “Kwuonụ okwu. Olee otú ụdị ihe ọjọọ a si mee?”+  Nwoke Livaị ahụ,+ bụ́ di nwaanyị ahụ e gburu egbu, wee zaa, sị: “Ọ bụ Gibia+ nke Benjamin ka m gara, mụ na iko m nwaanyị,+ ka anyị nọrọ ka chi bọọ.  Ndị nwe ala Gibia wee bilie ịwakpo m ma gbaa ụlọ ahụ m nọ gburugburu n’abalị. Ọ bụ m ka ha chọrọ igbu, ma ọ bụ iko m nwaanyị ka ha dinara,+ o wee nwụọ.+  N’ihi ya, m buuru iko m nwaanyị gburie wee ziga ya n’ala niile bụ́ ihe nketa Izrel,+ n’ihi na ha mere omume rụrụ arụ+ na ihe nzuzu na-eme ihere n’Izrel.+  Lee! Unu ụmụ Izrel niile, kwuonụ ihe a ga-eme, tụọnụ aro.”+  Mmadụ niile wee bilie dị ka otu onye,+ sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ala n’ụlọikwuu ya, ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime anyị ga-ala n’ụlọ ya.+  Ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme Gibia. Ka anyị fee nza+ wee gbagoo buso ya agha. 10  Anyị ga-akpọrọ mmadụ iri n’ime otu narị mmadụ ọ bụla n’ebo niile nke Izrel, na otu narị n’ime otu puku mmadụ, kpọrọkwa otu puku n’ime puku mmadụ iri, ka ha wetara ndị agha ihe oriri, ka ha wee buso Gibia nke Benjamin agha, n’ihi ihe nzuzu na-eme ihere+ ha mere n’Izrel.” 11  Ndị ikom Izrel niile wee zukọta ibuso obodo ahụ agha dị ka otu onye, dị ka otu ìgwè. 12  Ebo niile nke Izrel wee zigara ndị niile si n’ebo Benjamin ndị mmadụ, sị: “Gịnị bụ ihe ọjọọ a e mere n’etiti unu?+ 13  Ugbu a, kpọpụtanụ ndị ikom ahụ,+ bụ́ ndị ahụ na-abaghị n’ihe+ nọ na Gibia,+ ka anyị gbuo ha,+ ka anyị kpochapụkwa ihe ọjọọ n’Izrel.”+ Ma ụmụ Benjamin achọghị ige ntị n’olu ụmụnne ha, bụ́ ụmụ Izrel.+ 14  Ụmụ Benjamin wee si n’obodo niile dị na Gibia zukọta ịga buso ụmụ Izrel agha. 15  Ụmụ Benjamin wee si n’obodo ha niile zukọta n’ụbọchị ahụ, puku ndị ikom iri abụọ na isii ndị na-ebu mma agha,+ ma e wezụga ndị bi na Gibia, bụ́ ebe e si kpọkọta narị ndị ikom asaa a họrọ ahọ. 16  N’ime ndị agha a niile e nwere narị mmadụ asaa a họrọ ahọ bụ́ ndị na-eme aka ekpe.+ Onye ọ bụla n’ime ha na-eji nkume+ agbata ihe há ka otu ntutu isi, ha adịghị agbajọ. 17  Ndị Izrel wee zukọta ma e wezụga Benjamin, narị puku mmadụ anọ ndị na-ebu mma agha.+ Onye ọ bụla n’ime ndị agha a bụ dike n’agha. 18  Ha wee bilie gbagoo Betel ịjụ Chineke ase.+ Ụmụ Izrel wee sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebute ụzọ n’agha anyị ga-ebuso ụmụ Benjamin?”+ Jehova wee zaa, sị: “Juda ga-ebute ụzọ.”+ 19  E mesịa, ụmụ Izrel biliri n’ụtụtụ wee maa ụlọikwuu ibuso Gibia agha. 20  Ndị Izrel wee gawa ibuso Benjamin agha; ndị Izrel wee hazie onwe ha n’usoro ibuso ha agha na Gibia. 21  Ụmụ Benjamin wee si na Gibia+ pụta, laa puku ndị ikom iri abụọ na puku abụọ bụ́ ndị Izrel n’iyi n’ụbọchị ahụ.+ 22  Ma, ndị agha ahụ, bụ́ ndị Izrel, katara obi, wee hazie onwe ha ọzọ n’usoro ibu agha n’ebe ahụ ha haziri onwe ha n’ụbọchị mbụ. 23  Ụmụ Izrel wee gbagoo ma kwaa ákwá+ n’ihu Jehova ruo anyasị, jụọkwa Jehova ase, sị: “Ọ̀ bụ m gaa buso ụmụ Benjamin nwanne m agha ọzọ?”+ Jehova wee zaa, sị: “Gbagoo buso ya agha.” 24  Ụmụ Izrel wee bịaruo ụmụ Benjamin nso n’ụbọchị nke abụọ.+ 25  Benjamin wee si na Gibia pụta izute ha n’ụbọchị nke abụọ ma laa puku mmadụ iri na asatọ ọzọ n’etiti ụmụ Izrel n’iyi,+ ha niile bụcha ndị na-ebu mma agha.+ 26  Ụmụ Izrel niile,+ bụ́ ndị agha ahụ niile, wee gbagoruo Betel ma kwaa ákwá,+ nọrọkwa n’ebe ahụ n’ihu Jehova buo ọnụ+ n’ụbọchị ahụ ruo anyasị ma chụọ àjà nsure ọkụ,+ chụọkwa àjà udo+ n’ihu Jehova. 27  Mgbe e mesịrị, ụmụ Izrel jụrụ Jehova ase,+ ebe ọ bụ n’ebe ahụ ka igbe ọgbụgba ndụ+ nke ezi Chineke dị n’oge ahụ. 28  Finihas+ nwa Elieza, nwa Erọn, guzo n’ihu ya n’oge ahụ,+ sị: “Ọ̀ bụ m gaa ọzọ buso ụmụ Benjamin nwanne m agha ka ọ̀ bụ mụ agala?”+ Jehova wee sị ya: “Gaa, n’ihi na echi ka m ga-enyefe ya n’aka gị.”+ 29  Izrel wee mee ka ndị mmadụ zoo+ gburugburu Gibia ibuso ya agha. 30  Ụmụ Izrel wee gbagoo ibuso ụmụ Benjamin agha n’ụbọchị nke atọ, haziekwa onwe ha n’usoro ibuso Gibia agha otú ha si mee n’oge ndị ọzọ.+ 31  Mgbe ụmụ Benjamin pụtara izute ndị Izrel, a rapụtara ha n’obodo ha.+ Dịkwa ka ha mere n’oge ndị ọzọ, ha malitere igbu ụfọdụ n’ime ndị Izrel n’okporo ụzọ dị iche iche, nke otu n’ime ha gara Betel,+ nke ọzọ agaa Gibia,+ ha gburu ihe dị ka mmadụ iri atọ n’ime ndị Izrel,+ n’ọhịa. 32  Ụmụ Benjamin wee malite ịsị: “Anyị na-emeri ha otú anyị si merie ha na mbụ.”+ Ma ụmụ Izrel sịrị: “Ka anyị gbaa ọsọ, anyị ga-esi n’obodo ha rapụta ha n’okporo ụzọ.” 33  Ndị Izrel niile wee si n’ebe niile ha nọ bilie, haziekwa onwe ha n’usoro na Bel-tema, ebe ndị Izrel ndị zoro ezo, si n’ebe niile ha zoro na gburugburu Gibia+ mapụtasịa. 34  Puku ndị ikom iri a họrọ ahọ n’etiti Izrel dum wee bịarute n’ihu Gibia, ọgụ ahụ wee kpụrụ ọkụ n’ọnụ; ma ndị Benjamin amaghị na ọdachi+ na-aga ịdakwasị ha. 35  Jehova wee merie Benjamin+ n’ihu Izrel, nke mere na n’ụbọchị ahụ ụmụ Izrel lara puku mmadụ iri abụọ na ise n’iyi na Benjamin, ha niile bụ ndị na-ebu mma agha.+ 36  Otú ọ dị, ụmụ Benjamin chere na ha ga-emeri ndị Izrel mgbe ha nọ na-agbara Benjamin ọsọ+ n’ihi na ndị Izrel tụkwasịrị obi ná ndị agha ahụ ha gwara ka ha zoo iji buso Gibia agha. 37  Ma ndị agha ahụ zoro ezo mere ọsọ ọsọ gaa ibuso Gibia agha. Ndị agha ahụ zoro ezo+ wee gbasaa ma jiri ihu mma agha bibie obodo ahụ dum. 38  Ndị Izrel na ndị agha ahụ zoro ezo kwekọrịtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ si n’obodo ahụ kwụgoo ka ọ bụrụ ihe mgbaàmà. 39  Mgbe ụmụ Izrel si n’ọgbọ agha ahụ gbaa ọsọ, Benjamin malitere igbu ihe dị ka mmadụ iri atọ n’etiti ndị Izrel,+ n’ihi na ha sịrị: “N’ezie, anyị na-emeri ha dị nnọọ ka anyị meriri ha n’agha nke mbụ.”+ 40  Ihe mgbaàmà ahụ+ wee malite isi n’obodo ahụ na-akwụgo dị ka ogidi anwụrụ ọkụ.+ Ya mere, mgbe Benjamin lere anya n’azụ, lee! anwụrụ ọkụ si n’obodo ahụ dum na-akwụgo n’eluigwe. 41  Ndị Izrel wee tụgharịa, ma ndị Benjamin mara jijiji,+ n’ihi na ha hụrụ na ọdachi adakwasịwo ha.+ 42  Ha wee si n’ihu Izrel gbaa ọsọ, gbara gawa n’ụzọ ala ịkpa, ma agha ahụ rutere n’ebe ha nọ, ebe ndị ikom ndị banyere n’obodo ahụ pụtara na-ala ha n’iyi. 43  Ha wee gbaa Benjamin gburugburu. Ha wee chụwa ya ọsọ n’ekweghị ya zuru ike. Ha wee zọda ya kpọmkwem n’ihu Gibia+ n’ebe ọwụwa anyanwụ. 44  N’ikpeazụ, puku mmadụ iri na asatọ n’ime Benjamin nwụrụ, ha niile bụcha ndị dike.+ 45  Ha wee tụgharịa gbara gawa n’ala ịkpa, na nkume dị elu nke Rimọn.+ Ha wee gbuo puku mmadụ ise n’ime ha n’okporo ụzọ,+ ha wee chụrụ ha ruo Gaịdọm ma gbuo puku mmadụ abụọ ọzọ n’ime ha. 46  Ndị Benjamin niile nwụrụnụ n’ụbọchị ahụ wee dịrị puku mmadụ iri abụọ na ise ndị na-ebu mma agha,+ ha niile bụcha ndị dike. 47  Ma narị mmadụ isii tụgharịrị gbaga n’ala ịkpa, na nkume dị elu nke Rimọn, ha wee bie ọnwa anọ na nkume dị elu nke Rimọn.+ 48  Ndị Izrel wee bịaghachi ibuso ụmụ Benjamin agha wee jiri ihu mma agha gbuo ndị obodo ahụ, malite na mmadụ ruo n’anụ ụlọ nakwa ihe ọ bụla ha hụrụ.+ Ha gbakwara obodo niile dị n’ebe ahụ ọkụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji