Ndị Ikpe 13:1-25

13  Ụmụ Izrel wee malite ọzọ ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ Jehova wee nyefee ha n’aka ndị Filistia+ ruo afọ iri anọ.  N’ime oge a, e nwere otu nwoke onye Zora,+ onye si n’ezinụlọ ebo Dan,+ aha ya bụ Manoa.+ Nwunye ya bụ nwaanyị aga, ọ mụtaghị nwa.+  Ka oge na-aga, mmụọ ozi Jehova pụtara ìhè n’ihu nwaanyị ahụ+ wee sị ya: “Lee, ị bụ nwaanyị aga, ị mụtaghịkwa nwa. Ma ị ga-atụrụ ime mụọ nwa nwoke.+  Ma, biko, lezie onwe gị anya, aṅụkwala mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu,+ erikwala ihe ọ bụla na-adịghị ọcha.+  N’ihi na, lee! ị ga-atụrụ ime, ị ga-amụkwa nwa nwoke, agụba ọ bụla agaghị emetụ ya n’isi,+ n’ihi na onye Naziraịt+ nke Chineke ka nwa ahụ ga-abụ ozugbo o si n’afọ pụta;+ ọ bụkwa ya ga-ebute ụzọ n’ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.”+  Nwaanyị ahụ wee gaa gwa di ya, sị: “Ọ dị otu onye nke ezi Chineke bịakwutere m, o yiri mmụọ ozi nke ezi Chineke,+ ọ dị egwu+ n’ile anya. Ma ajụghị m ya ebe o si bịa, ọ gwaghịkwanụ m aha ya.+  Ma ọ sịrị m, ‘Lee! Ị ga-atụrụ ime, ị ga-amụkwa nwa nwoke.+ Aṅụkwala mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu, erikwala ihe ọ bụla na-adịghị ọcha, n’ihi na onye Naziraịt nke Chineke ka nwa ahụ ga-abụ ozugbo o si n’afọ pụta ruo ụbọchị ọ ga-anwụ.’”+  Manoa wee malite ịrịọ Jehova, sị: “Biko, Jehova.+ Onye nke ezi Chineke ahụ i zitere, biko, ya bịakwute anyị ọzọ ma gwa+ anyị ihe anyị ga-eme nwa ahụ a ga-amụ.”+  Ezi Chineke wee gee ntị n’olu Manoa,+ mmụọ ozi nke ezi Chineke wee bịakwute nwaanyị ahụ ọzọ mgbe ọ nọ ọdụ n’ubi, ma Manoa di ya esoghị ya nọrọ n’ebe ahụ. 10  Ozugbo ahụ, nwaanyị ahụ mere ngwa ngwa gbara ọsọ gaa gwa di ya,+ sị: “Lee! Nwoke ahụ nke bịakwutere m ụbọchị ahụ apụtawo ìhè n’ihu m.”+ 11  Manoa wee bilie soro nwunye ya bịakwute nwoke ahụ, sị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ nwoke ahụ nke gwara nwaanyị a okwu?”+ o wee zaa, sị: “Ọ bụ m.” 12  Manoa wee sị ya: “Ka okwu gị mezuo. Olee ụdị ndụ nwa ahụ ga-ebi, gịnịkwa ga-abụ ọrụ ya?”+ 13  Mmụọ ozi Jehova wee sị Manoa: “Nwaanyị a ga-ezere+ ihe niile m kpọtụụrụ ya aha. 14  Ọ gaghị eri ihe ọ bụla si n’osisi vaịn pụta, ọ gaghịkwa aṅụ mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-egbu egbu,+ ya erikwala ụdị ihe ọ bụla na-adịghị ọcha.+ Ya debe ihe niile m nyere ya n’iwu.”+ 15  Manoa wee gwa mmụọ ozi Jehova, sị: “Biko, nọtụkwuo ntakịrị, ka anyị gbuoro gị nwa ewu.”+ 16  Ma mmụọ ozi Jehova gwara Manoa, sị: “Ọ bụrụgodị na mụ anọtụkwuo ntakịrị, agaghị m eri nri gị; ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịchụrụ Jehova àjà nsure ọkụ,+ chụọ.” N’ihi na Manoa amaghị na ọ bụ mmụọ ozi Jehova. 17  Manoa wee sị mmụọ ozi Jehova: “Gịnị bụ aha gị,+ ka ọ ga-abụ mgbe okwu gị mezuru, anyị ga-asọpụrụ gị?” 18  Otú ọ dị, mmụọ ozi Jehova sịrị ya: “Gịnị mere i ji ajụ m aha m, ebe ọ bụ aha dị ebube?” 19  Manoa wee were nwa ewu na ọka* chụọrọ Jehova àjà n’elu oké nkume.+ Ọ nọ na-eme ihe n’ụzọ dị ebube ka Manoa na nwunye ya nọ na-ele ya anya. 20  O wee ruo mgbe ọkụ si n’ebe ịchụàjà ahụ nwulie elu, mmụọ ozi Jehova sooro ọkụ nke si n’ebe ịchụàjà ahụ rịgoo ka Manoa na nwunye ya nọ na-ele anya.+ Ha gburu ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala.+ 21  Mmụọ ozi Jehova apụtaghị ìhè ọzọ n’ihu Manoa na nwunye ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka Manoa matara na ọ bụ mmụọ ozi Jehova.+ 22  Ya mere, Manoa sịrị nwunye ya: “Anyị ga-anwụ,+ n’ihi na ọ bụ Chineke ka anyị hụrụ.”+ 23  Ma nwunye ya sịrị ya: “Ọ bụrụ na naanị ihe Jehova chọrọ bụ ka o gbuo anyị, ọ garaghị anara àjà nsure ọkụ na àjà ọka anyị chụrụ,+ ọ garaghị egosi anyị ihe a niile, ọ garaghịkwa ekwe ka anyị nụ ihe dị otú a.”+ 24  E mesịa, nwaanyị ahụ mụrụ nwa nwoke wee gụọ ya Samsịn;+ nwa okoro ahụ wee na-eto, Jehova wee na-agọzi ya.+ 25  Ka oge na-aga, mmụọ Jehova+ malitere ịkpa ike n’ahụ́ ya, na Mehane-dan+ nke dị n’agbata Zora+ na Eshtaọl.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.