Ndị Hibru 5:1-14

5  N’ihi na nnukwu onye nchụàjà ọ bụla nke e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ bụ onye a họpụtara ijere Chineke ozi+ n’ihi ụmụ mmadụ, ka o wee na-eche onyinye n’ihu ya, na-achụkwa àjà maka mmehie.+  O nwere ike imeso ndị na-amaghị nke a na-akọ na ndị njehie n’ụzọ dị nwayọọ ebe adịghị ike nke ya gbakwara ya gburugburu,+  n’ihi ya kwa, o ji ụgwọ ịchụ àjà maka mmehie nke ya dị ka ọ na-achụ maka nke ndị Izrel.+  Mmadụ na-anarakwa ihe ùgwù a, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya,+ kama naanị mgbe Chineke kpọrọ ya,+ dị nnọọ ka a kpọkwara Erọn.+  N’otu ụzọ ahụkwa, Kraịst enyeghị onwe ya otuto+ site n’ịghọ nnukwu onye nchụàjà,+ kama e nyere ya otuto+ site n’ọnụ onye ahụ nke kwuru banyere ya, sị: “Ị bụ ọkpara m; mụ onwe m aghọwo nna gị+ taa.”  Dị nnọọ ka o kwukwara n’ebe ọzọ, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek+ ruo mgbe ebighị ebi.”  N’oge Kraịst bụ anụ ahụ́, o ji ibesi ákwá ike+ na anya mmiri kpesie ekpere ike ma rịọ Onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ,+ a nụkwara olu ya n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke.+  Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara, ọ mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara;+  mgbe e mesịrị ka o zuo okè,+ ọ ghọrọ onye ọ dị n’aka inye ndị niile na-erubere ya isi+ nzọpụta ebighị ebi,+ 10  n’ihi na Chineke akpọwo ya nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek.+ 11  Banyere onye a, anyị nwere ọtụtụ ihe ikwu, ndị sikwara ike ịkọwa, ebe unu ghọworo ndị ntị ike n’ịnụ ihe.+ 12  N’ihi na, n’ezie, n’agbanyeghị na unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi+ ka ọ dị ugbu a, ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ bido n’isi kụziwere unu ihe ndị mbụ+ e dere n’okwu dị nsọ nke Chineke;+ unu aghọwokwa ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike.+ 13  N’ihi na onye na-aṅụ mmiri ara amatabeghị okwu nke ezi omume, n’ihi na ọ bụ nwa ọhụrụ.+ 14  Ma nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè, ndị zụworo ikike nghọta+ ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji